Mkpughe E Kpugheere Jọn 9:1-21
9 Mgbe mmụọ ozi nke ise fụrụ opi ya,+ ahụrụ m otu kpakpando nke si n’eluigwe daa n’ụwa. E nyekwara ya mkpịsị ugodi nke olulu abis.*+
2 O wee meghee olulu abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ka nke si ná nnukwu ekwú esi n’olulu ahụ pụta. Anwụrụ ọkụ a mere ka anyanwụ na ikuku gbaa ọchịchịrị.+
3 Igurube sikwa n’anwụrụ ọkụ ahụ pụta n’ụwa.+ E nyere ha otu ikike ahụ akpị ndị dị n’ụwa nwere.
4 A gwakwara ha ka ha ghara ibibi ahịhịa ndị dị n’ụwa ma ọ bụ ahịhịa ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ osisi ọ bụla. Kama, ka ndị ha ga-emekpa ahụ́ bụrụ naanị ndị mmadụ na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha.+
5 E nyekwara igurube ndị ahụ ikike ka ha mekpaa ha ahụ́ ọnwa ise, ọ bụghị igbu ha egbu. Ahụ́ ha ga-emekpa ha ga-adịkwa ka mgbe akpị+ gbara mmadụ.
6 N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-achọ ọnwụ ma ha agaghị achọta ya. Ha ga-achọkwa ịnwụ ma ọnwụ ga-agbara ha ọsọ.
7 Igurube ndị ahụ yiri ịnyịnya ndị a kwadebere iji gaa agha.+ Ha kpukwa ihe yiri okpueze ọlaedo n’isi, ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ.
8 Ma ntutu isi ha dị ka ntutu isi ụmụ nwaanyị. Ezé ha dịkwa ka nke ọdụm.+
9 Ha yikwa ihe e ji echebe obi, ndị dị ka è ji ígwè mee ha. Ụda nku ha dịkwa ka ụda ụgbọ ịnyịnya ndị ọtụtụ ịnyịnya dọkpụ na-aga agha.+
10 Ha nwekwara ọdụ, na-agbakwa ka akpị. Ike ha ga-eji mekpaa ndị mmadụ ahụ́ ọnwa ise dịkwa n’ọdụ ha.+
11 Eze ha bụ mmụọ ozi nke na-achị abis.*+ Na Hibru, aha ya bụ Abadọn.* Ma, na Grik, aha ya bụ Apọlịọn.*
12 Otu ahụhụ agafeela. Ahụhụ abụọ ọzọ+ ka na-abịa ma ihe ndị a gachaa.
13 Mgbe mmụọ ozi nke isii+ fụrụ opi ya,+ anụrụ m olu si na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo rụọ+ nke dị n’ihu Chineke.
14 Olu ahụ gwara mmụọ ozi nke isii ahụ nke ji opi ahụ, sị: “Tọpụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ e kere agbụ ná nnukwu osimiri Yufretis.”+
15 O wee tọpụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ agbụ e kere ha. Ha nọ na-eche ka awa na ụbọchị na ọnwa na afọ ha ga-egbu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị mmadụ ruo.
16 Ụsụụ ndị agha ịnyịnya ahụ dị puku iri abụọ ụzọ puku iri:* Anụrụ m ole ha dị.
17 Otú a ka m si hụ ịnyịnya ndị ahụ na ndị na-agba ha n’ọhụụ: Ndị na-agba ha yi ihe e ji echebe obi nke na-acha ọbara ọbara ka ọkụ, na-achakwa anụnụ anụnụ, na-achakwa odo odo ka sọlfọ. Isi ịnyịnya ndị ahụ dịkwa ka isi ọdụm,+ ọkụ na anwụrụ ọkụ na sọlfọ sikwa n’ọnụ ha pụta.
18 Ihe atọ ndị a, ya bụ, ọkụ na anwụrụ ọkụ na sọlfọ ndị si n’ọnụ ha pụta, gburu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị mmadụ.
19 Ike ịnyịnya ndị ahụ dị n’ọnụ ha na n’ọdụ ha, n’ihi na ọdụ ha dị ka agwọ, nweekwa isi. Ha na-ejikwa ha emekpa ndị mmadụ ahụ́.
20 Ma, ndị ihe atọ ndị ahụ na-egbughị akwaghị ụta maka ihe ha ji aka ha mee. Ha akwụsịghị ife ndị mmụọ ọjọọ na arụsị e ji ọlaedo na ọlaọcha na ọla kọpa na nkume na osisi mee. Arụsị ndị a anaghị ahụ ụzọ. Ha anaghị anụ ihe. Ha anaghịkwa eje ije.+
21 Ndị ahụ echegharịghịkwa ma kwụsị igbu mmadụ,* ime mgbaasị, ịkwa iko,* na izu ohi.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”
^ Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”
^ Apọlịọn pụtara “Onye Mbibi.”
^ Abadọn pụtara “Mbibi.”
^ Ya bụ, narị nde abụọ (200,000,000).
^ Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”
^ Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.