Nehemaya 1:1-11

  • A gwara Nehemaya banyere Jeruselem (1-3)

  • Ekpere Nehemaya kpere (4-11)

1  Ihe a bụ okwu Nehemaya*+ nwa Hakalaya: N’ọnwa Kislev,* n’afọ nke iri abụọ, m nọ na Shushan*+ bụ́ ebe obí eze dị.*  N’oge ahụ, Hanenaị,+ otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke, na ụmụ nwoke ndị ọzọ si Juda bịa. M wee jụọ ha banyere ndị Juu fọrọ afọ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa,+ nakwa banyere Jeruselem.  Ha zara m, sị: “Ndị ahụ fọrọ n’ógbè* Juda, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, nọ n’ọnọdụ ọjọọ, ihere jikwa ha.+ A kwatusịrị mgbidi Jeruselem,+ gbaakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ.”+  Ozugbo m nụrụ ihe a ha kwuru, m nọdụrụ ala malite ibe ákwá. M nọkwa na-eru uju, na-ebu ọnụ+ ma na-ekpe ekpere ruo ọtụtụ ụbọchị n’ihu Chineke nke eluigwe.  M sịrị: “Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, onye na-egosikwa ha na ọ hụrụ ha n’anya,+  biko, gee ntị. Lee m anya ma nụrụ ekpere ohu gị na-ekpe n’ihu gị taa. Ehihie na abalị,+ m na-ekpe ekpere banyere ndị Izrel bụ́ ndị ohu gị, na-ekwupụta mmehie ndị Izrel mehiere gị. Anyị emehiela, ma mụnwa ma ụlọ nna m.+  N’eziokwu, anyị emeela omume rụrụ arụ, mejọọ gị.+ Anyị erubeghị isi n’iwu, ná ntụziaka, nakwa n’ihe ndị i kpebiri bụ́ ndị i si n’aka Mosis ohu gị nye anyị.+  “Biko, cheta na i nyere Mosis ohu gị iwu,* sị: ‘Ọ bụrụ na unu enupụ isi, m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+  Ma ọ bụrụ na unu alọghachikwute m, debe iwu m ma rube isi, ọ bụ eziokwu na e nwere ike ịchụsasị unu ruo na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ kpọkọta unu+ ma kpọlata unu n’ebe m họọrọ ka a nọrọ na-eto aha m.’+ 10  Ha bụ ndị ohu gị na ndị gị i ji ike gị dị ukwuu na aka gị dị ike gbapụta.+ 11  Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị na-ekpe nakwa ekpere ndị ohu gị na-ekpe, bụ́ ndị ọ na-amasị ịtụ egwu aha gị. Biko, mee ka ihe gaziere ohu gị taa, meekwa ka nwoke a metere m ebere.”+ Ọ bụ m na-ebutere eze ihe ọ na-aṅụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Nehemaya pụtara “Jaa Na-akasi Obi.”
Gụọ B15.
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “ị dọrọ Mosis onye na-ejere gị ozi aka ná ntị.”