Nehemaya 10:1-39

  • Ha kwetara ime ihe e dere n’Iwu (1-39)

    • “Anyị agaghị eleghara ụlọ Chineke anyị anya” (39)

10  Ndị bịanyere aka na ya+ bụ: Nehemaya onye bụ́ gọvanọ,* nwa Hakalaya,Na Zedekaya,  Seraya, Azaraya, Jeremaya,  Pash-họ, Amaraya, Malkaịja,  Hatọsh, Shebanaya, Malọk,  Herim,+ Meremọt, Obedaya,  Daniel,+ Ginetọn, Barọk,  Meshọlam, Abaịja, Mijamin,  Meazaya, Bilgaị, na Shemaya. Ha bụ ndị nchụàjà.  Ndị Livaị bịanyere aka na ya bụ: Jeshụa nwa Azanaya, Binuaị bụ́ otu n’ime ụmụ Henadad, Kadmiel,+ 10  na ụmụnne ha ndị nwoke bụ́ Shebanaya, Hodaya, Kelaịta, Peleya, Henan, 11  Maịka, Rihọb, Hashabaya, 12  Zakọ, Sherebaya,+ Shebanaya, 13  Hodaya, Benaị, na Benaịnu. 14  Ndị isi ndị bịanyere aka na ya bụ: Perọsh, Pehat-moab,+ Ịlam, Zatu, Benaị, 15  Bọnaị, Azgad, Bibaị, 16  Adọnaịja, Bigvaị, Edin, 17  Eta, Hezekaya, Azọ, 18  Hodaya, Heshọm, Bizaị, 19  Herif, Anatọt, Nibaị, 20  Magpiash, Meshọlam, Hiza, 21  Meshezabel, Zedọk, Jadua, 22  Pelataya, Henan, Anaya, 23  Hoshia, Hananaya, Hashọb, 24  Halohesh, Pilha, Shobek, 25  Rihọm, Hashabna, Measaya, 26  Ahaịja, Henan, Enan, 27  Malọk, Herim, na Beana. 28  Ndị ọzọ kwetakwara ihe ahụ e kpebiri. Ha bụ ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-abụ abụ, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* ndị niile kwụsịrị iso ndị bi n’ala ndị a emekọ ihe ka ha wee na-edebe Iwu ezi Chineke,+ ha na ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị nwoke, na ụmụ ha ndị nwaanyị, na ndị niile ọzọ ma ihe ma na-aghọta ihe.* 29  Ha so ụmụnne ha, bụ́ ndị a ma ama, ṅụọ iyi ka ihe ọjọọ mee ha ma ọ bụrụ na ha edebeghị Iwu Jehova Onyenwe anyị, bụ́ ezi Chineke, nke o si n’aka Mosis ohu ezi Chineke nye ndị Izrel nakwa ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi n’iwu ya niile, n’ihe ndị o kpebiri, nakwa ná ntụziaka ya. 30  Anyị agaghị akpọnye ndị bi n’ala a ụmụ anyị ndị nwaanyị, anyị agaghịkwa alụtara ụmụ anyị ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 31  Ọ bụrụ na ndị bi n’ala a ebute ngwá ahịa ha na ụdị ọka ọ bụla ka ha ree n’Ụbọchị Izu Ike, anyị agaghị azụ ha ihe ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike+ ma ọ bụ n’ụbọchị ọzọ dị nsọ.+ Anyị agaghị ewe ihe ubi n’afọ nke asaa,+ anyị ga-akagbukwa ụgwọ ọ bụla e ji anyị.+ 32  Anyị kpebikwara na onye ọ bụla n’ime anyị ga na-enye otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu shekel* kwa afọ maka ozi a na-eje n’ụlọ* Chineke anyị,+ 33  maka achịcha a na-enye Chineke,+ maka àjà ọka a na-achụ mgbe niile,+ maka àjà a na-esu ọkụ mgbe niile n’Ụbọchị Izu Ike+ nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ maka oriri a na-eme n’oge a kara aka,+ maka ihe ndị dị nsọ, maka àjà mmehie+ e ji ekpuchiri Izrel mmehie, nakwa maka ọrụ niile a na-arụ n’ụlọ Chineke anyị. 34  Anyị fekwara nza ka a mata mgbe ezinụlọ nke ọ bụla ná ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị ọzọ ga na-ebute nkụ n’ụlọ Chineke anyị n’oge a kara aka, kwa afọ, ka e jiri ha na-esonye ọkụ n’ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke anyị otú e dere ya n’Iwu.*+ 35  Kwa afọ, anyị ga na-ewetakwa mkpụrụ mbụ kara aka ala anyị mepụtara nakwa mkpụrụ mbụ chara acha nke ụdị osisi ọ bụla mịrị n’ụlọ Jehova.+ 36  Anyị ga na-akpọtakwa ọkpara anyị ma na-eweta anụ e bu ụzọ mụọ n’anụ ụlọ anyị,+ otú e dere ya n’Iwu,* nakwa anụ e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi anyị na ìgwè ewu na atụrụ anyị. Anyị ga-eweta ha n’ụlọ Chineke anyị, nye ha ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ Chineke anyị.+ 37  Anyị ga-ebutekwara ndị nchụàjà ntụ ọka si ná mkpụrụ mbụ anyị,+ butekwa onyinye anyị, mkpụrụ ụdị osisi ọ bụla mịrị,+ mmanya ọhụrụ, na mmanụ+ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* n’ụlọ Chineke anyị,+ nyekwa ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala anyị mepụtara+ n’ihi na ọ bụ ndị Livaị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri n’ebe niile a na-akọ ugbo n’obodo anyị. 38  Onye nchụàjà, bụ́ nwa Erọn, na ndị Livaị ga-anọ mgbe ndị Livaị ga-anata otu ụzọ n’ụzọ iri. Ndị Livaị ga-ewepụtakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri ha natara+ ma weta ha n’ụlọ Chineke anyị, n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe.* 39  N’ihi na ọ bụ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* ka ndị Izrel na ndị Livaị ga-eweta onyinye+ ọka,* mmanya ọhụrụ, na mmanụ.+ Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka arịa ndị e ji arụ ọrụ n’ebe nsọ dị, bụrụkwa ebe ndị nchụàjà ndị na-eje ozi, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, na ndị na-abụ abụ na-anọ. Anyị agaghị eleghara ụlọ Chineke anyị anya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
O nwere ike ịbụ, “ndị niile toruru ịghọta ihe.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
 Ma ọ bụ “n’ebe ndị a na-anọ eri nri.”
Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”
Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.