Nehemaya 12:1-47

  • Ndị nchụàjà na ndị Livaị (1-26)

  • E nyefere Chineke mgbidi Jeruselem (27-43)

  • E nyewere ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ òkè ha (44-47)

12  Ndị a bụ ndị nchụàjà na ndị Livaị so Zerubabel+ nwa Shieltiel,+ na Jeshụa+ lọta: Seraya, Jeremaya, Ezra,  Amaraya, Malọk, Hatọsh,  Shekanaya, Rihọm, Meremọt,  Ido, Ginetọị, Abaịja,  Mijamin, Meadaya, Bilga,  Shemaya, Joyarib, Jedeya,  Salu, Emọk, Hilkaya, Jedeya. Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị nchụàjà na ụmụnne ha n’oge Jeshụa.  Ndị Livaị bụ Jeshụa, Binuaị, Kadmiel,+ Sherebaya, Juda, na Matanaya.+ Matanaya na ụmụnne ya na-edu ndị na-abụ abụ ekele.  Bakbọkaya na Ọnaị bụ́ ụmụnne ha chere ha ihu ka ha guzo n’ebe ha na-eche nche.* 10  Jeshụa mụrụ Joyakim, Joyakim amụọ Elayashib,+ Elayashib amụọ Joyada.+ 11  Joyada mụrụ Jonatan, Jonatan amụọ Jadua. 12  N’oge Joyakim, ndị a bụ ndị nchụàjà, ndị bụ́ ndị isi ọnụmara dị iche iche: onye na-anọchite anya ọnụmara Seraya+ bụ Meraya; nke Jeremaya bụ Hananaya; 13  nke Ezra+ bụ Meshọlam; nke Amaraya bụ Jehohenan; 14  nke Malọkaị bụ Jonatan; nke Shebanaya bụ Josef; 15  nke Herim+ bụ Adna; nke Mereyọt bụ Helkaị; 16  nke Ido bụ Zekaraya; nke Ginetọn bụ Meshọlam; 17  nke Abaịja+ bụ Zikraị; nke Minayamin bụ . . . ;* nke Moadaya bụ Piltaị; 18  nke Bilga+ bụ Shamua; nke Shemaya bụ Jehonatan; 19  nke Joyarib bụ Matinaị; nke Jedeya+ bụ Ọzaị; 20  nke Salaị bụ Kalaị; nke Emọk bụ Iba; 21  nke Hilkaya bụ Hashabaya; nke Jedeya bụ Netanel. 22  E dere aha ndị isi ọnụmara ndị Livaị nakwa nke ndị nchụàjà n’oge Elayashib, Joyada, Johenan, na Jadua+ ruo n’oge Darayọs onye Peshia chịwara. 23  E dere aha ndị isi ọnụmara ndị Livaị n’akwụkwọ ihe ndị mere n’oge ahụ ruo n’oge Johenan nwa Elayashib. 24  Ndị isi ndị Livaị bụ Hashabaya, Sherebaya, na Jeshụa+ nwa Kadmiel.+ Ụmụnne ha, bụ́ ndị nche, guzo n’ìgwè n’ìgwè chee ha ihu iji na-eto Chineke ma na-ekele ya otú Devid onye nke ezi Chineke kwuru ka a na-eme.+ 25  Matanaya,+ Bakbọkaya, Obedaya, Meshọlam, Talmọn, na Akọb+ guzo na-eche ọnụ ụzọ ámá nche.+ Ha na-eche nche n’ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe, bụ́ ndị dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá. 26  Ha jere ozi n’oge Joyakim nwa Jeshụa+ nwa Jozadak nakwa n’oge Nehemaya bụ́ gọvanọ na Ezra+ onye nchụàjà, bụ́ odeakwụkwọ.* 27  Mgbe a na-enyefe Chineke mgbidi Jeruselem, ha chọrọ ndị Livaị ma si n’ebe niile ha bi kpọta ha Jeruselem ka ha jiri ọṅụ, abụ ekele,+ ájà, ụbọ akwara, na une nyefee Chineke mgbidi ahụ. 28  Ụmụ ndị na-abụ abụ* wee si n’ógbè ndị dị nso,* si gburugburu Jeruselem, si n’ógbè niile nke ndị Netofa+ zukọta. 29  Ha sikwa Bet-gilgal,+ nakwa ala ndị dị na Giba+ na Azmavet+ zukọta n’ihi na ndị na-abụ abụ rụụrụ onwe ha ógbè dị iche iche gburugburu Jeruselem. 30  Ndị nchụàjà na ndị Livaị wee mee onwe ha ka ha dị ọcha, meekwa ka ndị Izrel, ọnụ ụzọ ámá,+ na mgbidi+ ahụ dị ọcha.+ 31  M wee kpọgote ndị isi Juda n’elu mgbidi ahụ. M họpụtakwara nnukwu ìgwè abụọ na-ekwe ukwe ekele na ndị ga na-eso ha n’azụ. Otu ìgwè nọ na-aga n’aka nri n’elu mgbidi nke gara n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.+ 32  Hoshaya na ọkara ndị isi Juda sooro ha n’azụ na-aga, 33  ha na Azaraya, Ezra, Meshọlam, 34  Juda, Benjamin, Shemaya, na Jeremaya. 35  E nwere ụmụ ndị nchụàjà ji opi soro ha.+ Ụfọdụ n’ime ha bụ: Zekaraya nwa Jonatan nwa Shemaya nwa Matanaya nwa Mịkaya nwa Zakọ nwa Esaf,+ 36  na ụmụnne ya bụ́ Shemaya, Azarel, Milalaị, Gilalaị, Meaị, Netanel, Juda, na Hanenaị. Ha ji ngwá egwú Devid+ onye nke ezi Chineke. Ezra+ bụ́ odeakwụkwọ* nọkwa na-aga n’ihu ha. 37  N’Ọnụ Ụzọ Ámá Isi Iyi,+ ha si n’ebe e si agbago mgbidi dị n’elu Ụlọ Devid gafere Steepụ+ E Si Aga n’Obodo Devid+ ma gawa ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri,+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. 38  Ìgwè nke ọzọ na-ekwe ukwe ekele nọ na-aga n’aka ekpe.* Mụ na ọkara ndị nke ọzọ sooro ha n’elu mgbidi gafere Ụlọ Nche Ekwú+ ruo n’elu Mgbidi Sara Mbara,+ 39  gaferekwa Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem+ ma na-aga ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Obodo Ochie,+ ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+ n’Ụlọ Nche Hananel,+ n’Ụlọ Nche Mia, ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ.+ Ha wee kwụsị n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndị Nche. 40  Ìgwè abụọ ahụ na-ekwe ukwe ekele mechara kwụrụ n’ihu ụlọ ezi Chineke. M kwụkwaara, mụ na ọkara ndị osote onye na-achị achị mụ na ha so, 41  na ndị nchụàjà bụ́ Elayakim, Measaya, Minayamin, Mịkaya, Elio-inaị, Zekaraya, na Hananaya, bụ́ ndị ji opi, 42  nakwa Measaya, Shemaya, Elieza, Ọzaị, Jehohenan, Malkaịja, Ịlam, na Iza. Ndị na-abụ abụ, bụ́ ndị Izrahaya na-eduzi, nọkwa na-abụsi abụ ike. 43  Ha chụrụ nnukwu àjà n’ụbọchị ahụ, ṅụrịakwa ọṅụ+ n’ihi na ezi Chineke mere ka ha nwee nnukwu obi ụtọ. Ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị ṅụrịkwara ọṅụ,+ nke mere na a nọ n’ebe dị anya na-anụ ọṅụ a na-aṅụrị na Jeruselem.+ 44  N’ụbọchị ahụ, a họpụtara ụmụ nwoke ga na-elekọta ụlọ ebe a na-edowe ihe+ ndị e nyere n’onyinye,+ mkpụrụ mbụ,+ na otu ụzọ n’ụzọ iri.+ Ọ bụ n’ime ụlọ ndị ahụ ka ha ga-akwasa ihe ndị e si n’ubi ndị dị n’obodo dị iche iche weta maka ndị nchụàjà na ndị Livaị+ otú Iwu* kwuru,+ n’ihi na a ṅụrịrị ọṅụ na Juda maka na ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ na-eje ozi. 45  Ha wee malite ịrụ ọrụ Chineke ha na ọrụ ime ka ihe niile dị ọcha. Ndị na-abụ abụ na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá malitekwara ịrụ ọrụ nke ha otú Devid na Solomọn nwa ya kwuru ka a na-eme. 46  N’ihi na n’oge gara aga, n’oge Devid na Esaf, e nwere ndị na-eduzi* ndị na-abụ abụ, nweekwa abụ otuto na abụ e ji ekele Chineke.+ 47  N’oge Zerubabel+ nakwa n’oge Nehemaya, Izrel niile na-enye ndị na-abụ abụ+ na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá+ ihe ga-ezuru ha kwa ụbọchị. Ha na-ewepụtakwara ndị Livaị òkè ha,+ ndị Livaị ewepụtara ụmụ Erọn òkè nke ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “n’oge ha na-eje ozi.”
Ọ ga-abụ na e nwere aha na-adịghị n’ebe a n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e si sụgharịa amaokwu a.
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “Ndị a zụrụ azụ na-abụ abụ.”
Ya bụ, ógbè ndị dị gburugburu Osimiri Jọdan.
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “nọ na-aga n’ihu.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Hibru, “ndị isi.”