Nehemaya 3:1-32

  • A rụzigharịwara mgbidi Jeruselem (1-32)

3  Elayashib+ nnukwu onye nchụàjà na ụmụnne ya, bụ́ ndị nchụàjà, malitere ịrụ Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ.+ Ha doro ya nsọ*+ ma tinye ibo ụzọ ya niile. Ha doro ya nsọ ruo n’Ụlọ Nche Mia,+ ruokwa n’Ụlọ Nche Hananel.+  Ndị Jeriko+ rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha. Zakọ nwa Imraị rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha.  Ụmụ Hasenea rụrụ Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀.+ Ha tinyere ya osisi,+ tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha.  Meremọt+ nwa Yuraịja nwa Hakọz rụziri mgbidi n’akụkụ ha. Meshọlam+ nwa Berekaya nwa Meshezabel rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha. Zedọk nwa Beana rụziri mgbidi n’akụkụ ha.  Ndị Tekoa+ rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha. Ma ndị a ma ama n’ime ha ewedaghị onwe ha ala rụọrọ ndị nna ha ukwu ọrụ.  Joyada nwa Pasia na Meshọlam nwa Besodaya rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Obodo Ochie.+ Ha tinyere ya osisi, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha.  Melataya onye Gibiọn+ na Jedọn onye Merọnọt rụziri mgbidi n’akụkụ ha. Ha bụ ndị Gibiọn na ndị Mizpa,+ ndị nọ n’okpuru gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.*+  Ọziel nwa Hahaya, otu n’ime ndị na-eji ọlaedo akpụ ihe, rụziri mgbidi n’akụkụ ha. Hananaya, onye so ná ndị na-esi mmanụ otite,* rụziri mgbidi n’akụkụ ya. Ha dokwara mbadamba nkume n’okporo ụzọ Jeruselem ruo ná Mgbidi Sara Mbara.+  Refeya nwa Họọ, onyeisi ọkara ógbè Jeruselem, rụziri mgbidi n’akụkụ ha. 10  Jedeya nwa Harumaf rụziri mgbidi n’akụkụ ha n’ihu ụlọ ya. Hatọsh nwa Hashabnaya rụziri mgbidi n’akụkụ ya. 11  Malkaịja nwa Herim+ na Hashọb nwa Pehat-moab+ rụziri mpaghara ọzọ,* nakwa Ụlọ Nche Ekwú.+ 12  Shalọm nwa Halohesh, onyeisi ọkara ógbè Jeruselem, rụziri mgbidi n’akụkụ ha, ya na ụmụ ya ndị nwaanyị. 13  Henọn na ndị bi na Zanoa+ rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu.+ Ha rụrụ ya, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. Ha rụzikwara ebe dị otu puku (1,000) kubit* ná mgbidi ya ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.+ 14  Malkaịja nwa Rikab, onyeisi ógbè Bet-hakirem,+ rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ. Ọ rụrụ ya, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. 15  Shalọn nwa Kọlhoze, onyeisi ógbè Mizpa,+ rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Iyi.+ Ọ rụrụ ya, kụchie elu ya, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. Ọ rụkwara mgbidi Ọdọ Mmiri+ nke Ọwa Mmiri dị n’akụkụ Ubi Eze+ ruo na Steepụ+ nke si n’Obodo Devid+ gbadaa. 16  Onye sochiri ya bụ Nehemaya nwa Azbọk, onyeisi ọkara ógbè Bet-zọọ.+ Ọ rụziri mgbidi malite n’ihu Ebe E Liri Devid*+ ruo n’ọdọ mmiri+ a rụrụ arụ, ruokwa n’Ụlọ Ndị Dike. 17  Ndị sochiri ya bụ ndị Livaị ndị rụziri mgbidi: Rihọm nwa Benaị; Hashabaya, onyeisi ọkara ógbè Kaịla,+ rụziri mgbidi n’akụkụ ya. Ọ rụchiteere ógbè ya ọrụ. 18  Ndị sochiri ya bụ ụmụnne ha ndị nwoke ndị rụziri mgbidi: Bavaị nwa Henadad, onyeisi ọkara ógbè Kaịla. 19  Iza nwa Jeshụa,+ onyeisi Mizpa, nọ na-arụzi mpaghara ọzọ n’akụkụ ya, n’ihu ebe e si agbago n’Ụlọ Ngwá Agha nke dị n’Idé Ji Mgbidi.+ 20  Onye sochiri ya bụ Barọk nwa Zabaị.+ Ọ rụsiri ọrụ ike ma rụzie mpaghara ọzọ, malite n’Idé Ji Mgbidi ruo n’ọnụ ụzọ ụlọ Elayashib,+ nnukwu onye nchụàjà. 21  Onye sochiri ya bụ Meremọt+ nwa Yuraịja nwa Hakọz. Ọ rụziri mpaghara ọzọ, malite n’ọnụ ụzọ ụlọ Elayashib ruo n’ebe ụlọ Elayashib kwụsịrị. 22  Ndị sochiri ya bụ ndị nchụàjà, ndị si ná mpaghara Osimiri Jọdan.*+ Ha rụziri mgbidi. 23  Ndị sochiri ha bụ Benjamin na Hashọb. Ha rụziri mgbidi n’ihu ụlọ ha. Onye sochiri ha bụ Azaraya nwa Measaya nwa Ananaya. Ọ rụziri mgbidi n’ebe dị nso n’ụlọ ya. 24  Onye sochiri ya bụ Binuai nwa Henadad. Ọ rụziri mpaghara ọzọ, malite n’ụlọ Azaraya ruo n’Idé Ji Mgbidi,+ ruokwa n’ebe mgbidi a na mgbidi ọzọ sụkọtara isi. 25  Onye sochiri ya bụ Pelal nwa Yuzaị. Ọ rụrụ ọrụ n’ihu Idé Ji Mgbidi na ụlọ elu nke sepụtara isi n’Ụlọ Eze,*+ nke dị ná mgbago n’Ogige Ndị Nche.+ Onye sochiri ya bụ Pedaya nwa Perọsh.+ 26  Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,*+ bụ́ ndị bi n’Ofel,+ rụziri mgbidi ruo n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa ụlọ elu nke sepụtara isi ná mgbidi. 27  Ndị sochiri ha bụ ndị Tekoa.+ Ha rụziri mpaghara ọzọ malite n’ihu nnukwu ụlọ elu ahụ sepụtara isi ruo ná mgbidi Ofel. 28  Ndị nchụàjà rụziri mgbidi n’elu Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya,+ onye ọ bụla n’ihu ụlọ ya. 29  Onye sochiri ha bụ Zedọk+ nwa Ịma. Ọ rụziri mgbidi n’ihu ụlọ ya. Onye sochiri ya bụ Shemaya nwa Shekanaya, onye na-eche nche n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.+ Ọ rụziri mgbidi. 30  Ndị sochiri ya bụ Hananaya nwa Shelemaya na Henọn nwa nwoke nke isii Zelaf mụrụ. Ha rụziri mpaghara ọzọ. Onye sochiri ya bụ Meshọlam+ nwa Berekaya. Ọ rụziri mgbidi n’ihu ụlọ* nke ya. 31  Onye sochiri ya bụ Malkaịja, onye so ná ndị na-eji ọlaedo akpụ ihe. Ọ rụziri mgbidi ruo n’ụlọ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ na ndị ahịa, n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Nnyocha, ruokwa n’ọnụ ụlọ dị n’elu ebe mgbidi a na mgbidi ọzọ sụkọtara isi. 32  Ndị na-eji ọlaedo akpụ ihe na ndị ahịa rụzikwara mgbidi n’agbata ọnụ ụlọ dị n’elu ebe mgbidi a na mgbidi ọzọ sụkọtara isi na Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nyefere ya Chineke.”
Ma ọ bụ “ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Ma ọ bụ “ndị na-emepụta ihe na-esi ísì ọma.”
Ma ọ bụ “mpaghara a tụrụ atụ̀.”
Ihe dị ka mita 445 (amaụkwụ 1,460). Gụọ B14.
Ọ ga-abụ ebe e liri Devid na ndị ọzọ mechara chịa Juda.
O nwere ike ịbụ, “n’ógbè dị nso.”
Ma ọ bụ “n’Obí Eze.”
Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “ọnụ ụlọ.”
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”