Nehemaya 4:1-23

  • Ọrụ gara n’ihu n’agbanyeghị mmegide (1-14)

  • Ndị ọrụ ji ngwá ọgụ na-arụ ọrụ (15-23)

4  Ozugbo Sanbalat+ nụrụ na anyị na-arụghachi mgbidi ahụ, iwe were ya, ọnụma jukwara ya obi. O wee jiri ndị Juu na-eme ihe ọchị.  O kwuru n’ihu ụmụnne ya na ndị agha Sameria, sị: “Gịnị ka ndị Juu a na-enweghị ume na-eme? Hà ga-arụ ihe a n’onwe ha? Hà ga-achụ àjà? Hà ga-arụcha ya n’otu ụbọchị? Hà ga-esili n’ikpo ntụ ahụ nweta nkume ndị dị mma?”+  Tobaya+ onye Amọn,+ onye guzo n’akụkụ ya, wee sị: “Nkịta ọhịa nwedịrị ike ịkwatu mgbidi ahụ ha ji nkume na-arụ ma ọ magoro n’elu ya.”  M wee kpee ekpere, sị: “Chineke anyị, nụrụ, n’ihi na a na-elelị anyị.+ Mee ka ha taa ahụhụ maka mkparị ha na-akparị anyị,+ meekwa ka ha dị ka ihe a kwatara n’agha, ka a dọrọkwa ha n’agha laa mba ọzọ.  Ekpuchikwala ihe ọjọọ ha mere ma ọ bụ kwe ka e hichapụ mmehie ha n’ihu gị+ n’ihi na ha akparịala ndị na-arụ mgbidi a.”  Anyị wee na-arụ mgbidi ahụ, rụzuo ya gburugburu, rụruokwa ya ọkara otú ọ ga-aha n’ịdị elu. Ndị obodo anyị jikwa obi ha na-arụ ọrụ ahụ.  Ozugbo Sanbalat, Tobaya,+ ndị Arebia,+ ndị Amọn, na ndị Ashdọd+ nụrụ na mgbidi Jeruselem anyị na-arụzi na-aga n’ihu nakwa na e mechiwela ebe ndị ghere oghe na ya, ezigbo iwe were ha.  Ha wee gbaa izu ka ha bịa lụso Jeruselem agha ma kpata ọgba aghara na ya.  Ma anyị kpere ekpere rịọ Chineke anyị ka o nyere anyị aka, dowekwa ndị nche ka ha na-eche nche ehihie na abalị ka ha ghara ime anyị ihe ọ bụla. 10  Ma, ndị Juda nọ na-asị: “Ike agwụla ndị ọrụ,* ihe ndị a ga-ekpofu ekpofu karịkwara akarị. Anyị agaghị arụchali mgbidi a.” 11  Ndị iro anyị nọ na-asị: “Ha agaghị amata, ha agaghịkwa ahụ anyị ruo mgbe anyị batara n’etiti ha gbuo ha ma kwụsị ọrụ ahụ.” 12  Mgbe ọ bụla ndị Juu bi ha nso batara, ha na-agwa anyị ugboro ugboro,* sị: “Ha ga-esi n’ebe dị iche iche lụso anyị agha.” 13  M wee dowe ụmụ nwoke n’azụ mgbidi ahụ, n’ebe ndị kacha ala ndị iro nwere ike isi bata. M dowere ha n’ebe ahụ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ha jikwa mma agha ha, ube ha, na ụta ha. 14  Mgbe m hụrụ na ụjọ na-atụ ha, m biliri ozugbo gwa ndị a ma ama+ na ndị osote onye na-achị achị na ndị ọzọ niile, sị: “Unu atụla ha egwu.+ Chetanụ Jehova, bụ́ onye ukwu na onye e kwesịrị ịtụ egwu.+ Lụọrọnụ ụmụnne unu ọgụ, ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị nwunye unu na ụlọ unu.” 15  Mgbe ndị iro anyị nụrụ na anyị amatala ihe ha na-eme nakwa na ezi Chineke aghasaala ihe ha gbara izu ime anyị, anyị niile gaghachiri ná mgbidi ahụ maliteghachi ọrụ. 16  Malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ọkara n’ụmụ nwoke m na-arụ ọrụ,+ ọkara nke ọzọ ejiri ube, ọta, na ụta, yirikwa uwe agha. Ndị isi+ na-akwadokwa ụlọ Juda niile,* 17  bụ́ ndị na-arụ mgbidi ahụ. Ndị na-ebu ihe ji otu aka na-arụ ọrụ ma jiri aka nke ọzọ jide ngwá agha. 18  Onye ọ bụla n’ime ndị na-arụ mgbidi ahụ kere mma agha n’úkwù na-arụ ọrụ. Onye ga-afụ opi+ kwụkwa m n’akụkụ. 19  M wee gwa ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị na ndị ọzọ niile, sị: “Ọrụ a buru ezigbo ibu, anyị nọkwa ibe anyị n’ebe dị anya ná mgbidi a. 20  Mgbe unu nụrụ ụda opi, zukọtanụ n’ebe anyị nọ. Chineke anyị ga-alụrụ anyị agha.”+ 21  Anyị wee na-arụ ọrụ. Ma ọkara ndị nke ọzọ ji ube, malite mgbe chi bọrọ ruo mgbe kpakpando pụtara. 22  N’oge ahụ, m gwara ndị obodo anyị, sị: “Ka nwoke ọ bụla na onye na-ejere ya ozi nọbọọ chi n’ime Jeruselem. Ha ga-eche anyị nche n’abalị ma rụọ ọrụ mgbe chi bọrọ.” 23  N’ihi ya, mụ na ụmụnne m, ndị na-ejere m ozi,+ na ndị na-eche nche, bụ́ ndị na-eso m, eyipụghị uwe anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị jikwa ngwá agha ya n’aka nri.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị na-ebu ibu arọ.”
Na Hibru, “ugboro iri.”
Na Hibru, “kwụ ụlọ Juda niile n’azụ.”