Nehemaya 6:1-19

  • Ndị iro ka nọ na-agbalị ka a kwụsị ịrụghachi mgbidi ahụ (1-14)

  • A rụchara mgbidi ahụ n’ụbọchị iri ise na abụọ (15-19)

6  Ozugbo a kọọrọ Sanbalat, Tobaya,+ Gishem onye Arebia,+ na ndị iro anyị ndị ọzọ na m rụghachila mgbidi ahụ+ nakwa na e nweghịzi oghere ọ bụla na ya (ọ bụ eziokwu na etinyebeghị m ibo ụzọ n’ọnụ ụzọ ámá ya dị iche iche n’oge ahụ),+  Sanbalat na Gishem ziteere m ozi a ozugbo: “Bịa ka anyị yie oge anyị ga-ahụ n’otu n’ime obodo nta ndị dị na Ndagwurugwu Ono.”+ Ma ha nọ na-akpa nkata imerụ m ahụ́.  M wee zigara ha ndị ozi, sị: “Eji m nnukwu ọrụ n’aka. Agaghị m agbadatali. Gịnị mere m ga-eji kwụsị ọrụ a bịakwutewe unu?”  Ha ziteere m otu ozi a ugboro anọ, ma m zakwara otu ihe ahụ na ha niile.  Sanbalat ziteziiri m onye na-ejere ya ozi, kwuo otu ihe ahụ nke ugboro ise. Onye ozi ahụ jikwa akwụkwọ ozi a na-emechighị emechi.  E dere na ya, sị: “A nụla ya ná mba niile, Gishem+ na-ekwukwa ya, na gị na ndị Juu na-akpa nkata inupụ isi.+ Ọ bụ ya mere i ji na-arụ mgbidi ahụ. Ihe a niile a na-ekwu gosiri na ị chọrọ ịbụrụ ha eze.  Ị họpụtakwala ndị amụma ka ha kọsaa banyere gị na Jeruselem niile, sị, ‘E nweela eze na Juda!’ Eze ga-anụ ihe ndị a. N’ihi ya, bịa ka anyị kpaa ihe a.”  Ma, ozi m zigaara ya bụ: “Ihe niile a ị na-ekwu enweghị nke mere eme. Ọ bụ gịnwa na-echepụta ha.”*  Ha niile na-agba mbọ ka ha menye anyị ụjọ, na-asị: “Ike ga-agwụ ha n’ọrụ ahụ, ha aghara ịrụcha ya.”+ Ma, m na-arịọ Chineke ka o mee ka obi sie m ike.*+ 10  M wee gaa n’ụlọ Shemaya nwa Deleya nwa Mehetabel mgbe ọ na-ekweghị apụta èzí. Ọ sịrị: “Ka anyị yie oge anyị ga-aga n’ụlọ ezi Chineke, n’ime ụlọ nsọ, ka anyị mechiekwa ọnụ ụzọ ụlọ nsọ, n’ihi na ha na-abịa igbu gị. Ha na-abịa igbu gị n’abalị.” 11  Ma m sịrị: “Nwoke dị ka m ò kwesịrị ịgba ọsọ? Onye dị ka m ọ̀ ga-abanye n’ụlọ nsọ, a ghara igbu ya?+ Agaghị m abanye.” 12  M wee ghọta na ọ bụghị Chineke zitere onye amụma a, kama ọ bụ Tobaya na Sanbalat+ goro ya ka o duhie m. 13  Ha goro ya ka o menye m ụjọ ma mee ka m mehie, ka ha nweta ihe ha ga-eji mebie aha m ma kọchaa m. 14  Chineke m, biko, cheta Tobaya+ na Sanbalat na ihe ndị a ha mere. Chetakwa Noadaya, onye amụma nwaanyị, na ndị amụma ndị ọzọ nọ na-agba mbọ imenye m ụjọ. 15  E wee rụchaa mgbidi ahụ n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Ilọl,* n’ime ụbọchị iri ise na abụọ. 16  Ozugbo ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile gbara anyị gburugburu ahụkwa ya, ezigbo ihere mere ha.*+ Ha ghọtakwara na ọ bụ Chineke anyị nyeere anyị aka ịrụcha ọrụ a. 17  N’ụbọchị ndị ahụ, ndị a ma ama+ na Juda nọ na-ezigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, Tobaya ana-azaghachikwa ha. 18  Ọtụtụ ndị bi na Juda ṅụrụ iyi na ha ga na-akwado ya n’ihi na ọ bụ ya lụrụ nwa Shekanaya nwa Era.+ Jehohenan nwa ya nwoke lụkwara nwa Meshọlam+ nwa Berekaya. 19  Ha na-akọkwara m akụkọ ọma banyere ya mgbe niile, na-agwakwa ya ihe m kwuru. Tobaya na-eziteziri m akwụkwọ ozi ka o menye m ụjọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ha si gị n’obi.”
Na Hibru, “mee ka aka m dị ike.”
Gụọ B15.
Na Hibru, “ha dara ezigbo ọdịda n’anya onwe ha.”