Nehemaya 7:1-73

  • Ọnụ ụzọ ámá na ndị na-eche nche na ha (1-4)

  • Aha ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta (5-69)

    • Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ (46-56)

    • Ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi (57-60)

  • Onyinye ndị e nyere maka ọrụ ahụ (70-73)

7  Ozugbo a rụghachiri mgbidi ahụ,+ m tinyere ibo ụzọ ya niile.+ M wee họpụta ndị ga na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá,+ ndị na-abụ abụ,+ na ndị Livaị.+  M họpụtaziri Hanenaị+ nwanne m ka o lekọtawa Jeruselem, ya na Hananaya onyeisi Ebe A Rụsiri Ike,+ n’ihi na Hananaya bụ nwoke a kacha tụkwasị obi. Ọ na-atụkwa egwu ezi Chineke+ karịa ọtụtụ ndị ọzọ.  M wee sị ha: “A gaghị emeghe ọnụ ụzọ ámá Jeruselem ruo mgbe anyanwụ chasiwara ike. Mgbe ndị nche ka guzo na-eche nche, ha ga-emechi ọnụ ụzọ niile ma kpọchie ha. Kenyekwanụ ndị bi na Jeruselem ebe ha ga na-eche nche, ka ụfọdụ na-eche nche n’ebe e kenyere ha, ụfọdụ ana-eche nche n’ihu ụlọ ha.”  Jeruselem buru ibu. Ala ya sara mbara, ndị bi n’ime ya dịkwa ole na ole.+ A rụghachibeghị ụlọ ndị dị na ya.  Ma Chineke m tinyere n’obi m ka m kpọkọta ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị na mmadụ niile ka ha deba aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ M wee hụ akwụkwọ e debara aha ndị bu ụzọ lọta n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ihe a bụ ihe m hụrụ e dere na ya:  Ndị a bụ ndị Juu si n’ógbè* ahụ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, ya bụ, ndị Eze Nebukadneza+ nke Babịlọn dọọrọ n’agha.+ Ha mechara lọta Jeruselem na Juda, onye nke ọ bụla alaa n’obodo nke ya.+  Ha so Zerubabel,+ Jeshụa,+ Nehemaya, Azaraya, Ramaya, Nehamanaị, Mọdekaị, Bilshan, Misperet, Bigvaị, Nihọm, na Beana lọta. Ihe a bụ ole ụmụ nwoke Izrel ahụ dị:+  ụmụ Perọsh dị puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172);  ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372); 10  ụmụ Era,+ narị isii na iri ise na abụọ (652); 11  ụmụ Pehat-moab,+ ndị bụ́ ụmụ Jeshụa na Joab,+ puku abụọ, narị asatọ na iri na asatọ (2,818); 12  ụmụ Ịlam,+ otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254); 13  ụmụ Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845); 14  ụmụ Zakaị, narị asaa na iri isii (760); 15  ụmụ Binuaị, narị isii na iri anọ na asatọ (648); 16  ụmụ Bibaị, narị isii na iri abụọ na asatọ (628); 17  ụmụ Azgad, puku abụọ, narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322); 18  ụmụ Adọnaịkam, narị isii na iri isii na asaa (667); 19  ụmụ Bigvaị, puku abụọ na iri isii na asaa (2,067); 20  ụmụ Edin, narị isii na iri ise na ise (655); 21  ụmụ Eta, ndị si n’ezinụlọ Hezekaya, iri itoolu na asatọ; 22  ụmụ Heshọm, narị atọ na iri abụọ na asatọ (328); 23  ụmụ Bizaị, narị atọ na iri abụọ na anọ (324); 24  ụmụ Herif, otu narị na iri na abụọ (112); 25  ụmụ Gibiọn,+ iri itoolu na ise; 26  ndị Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188); 27  ndị Anatọt,+ otu narị na iri abụọ na asatọ (128); 28  ndị Bet-azmavet, iri anọ na abụọ; 29  ndị Kiriat-jierim,+ Kefaịra, na Bierọt,+ narị asaa na iri anọ na atọ (743); 30  ndị Rema na Giba,+ narị isii na iri abụọ na otu (621); 31  ndị Mikmas,+ otu narị na iri abụọ na abụọ (122); 32  ndị Betel+ na E-aị,+ otu narị na iri abụọ na atọ (123); 33  ndị Nibo nke ọzọ, iri ise na abụọ; 34  ụmụ Ịlam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254); 35  ụmụ Herim, narị atọ na iri abụọ (320); 36  ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345); 37  ụmụ Lọd, Hedid, na Ono,+ narị asaa na iri abụọ na otu (721); 38  ụmụ Senea, puku atọ, narị itoolu na iri atọ (3,930). 39  Ndị nchụàjà:+ ụmụ Jedeya ndị si n’ezinụlọ Jeshụa, narị itoolu na iri asaa na atọ (973); 40  ụmụ Ịma, otu puku na iri ise na abụọ (1,052); 41  ụmụ Pash-họ,+ otu puku, narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247); 42  ụmụ Herim,+ otu puku na iri na asaa (1,017). 43  Ndị Livaị:+ ụmụ Jeshụa, ndị si n’ezinụlọ Kadmiel,+ bụ́ ụmụ Hodeva, iri asaa na anọ. 44  Ndị na-abụ abụ:+ ụmụ Esaf,+ otu narị na iri anọ na asatọ (148). 45  Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá:+ ụmụ Shalọm, ụmụ Eta, ụmụ Talmọn, ụmụ Akọb,+ ụmụ Hataịta, ụmụ Shobaị, otu narị na iri atọ na asatọ (138). 46  Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ:*+ ụmụ Zaịha, ụmụ Hasufa, ụmụ Tabeọt, 47  ụmụ Kirọs, ụmụ Saya, ụmụ Pedọn, 48  ụmụ Lebena, ụmụ Hagaba, ụmụ Salmaị, 49  ụmụ Henan, ụmụ Gidel, ụmụ Geha, 50  ụmụ Reeya, ụmụ Rizin, ụmụ Nekoda, 51  ụmụ Gazam, ụmụ Ọza, ụmụ Pasia, 52  ụmụ Bisaị, ụmụ Meyunim, ụmụ Nefọshesim, 53  ụmụ Bakbọk, ụmụ Hakufa, ụmụ Hahọ, 54  ụmụ Bazlit, ụmụ Mehaịda, ụmụ Hasha, 55  ụmụ Bakọs, ụmụ Sisera, ụmụ Tima, 56  ụmụ Nezaya, ụmụ Hataịfa. 57  Ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi:+ ụmụ Sotaị, ụmụ Sofiret, ụmụ Peraịda, 58  ụmụ Jeala, ụmụ Dakọn, ụmụ Gidel, 59  ụmụ Shefataya, ụmụ Hatil, ụmụ Pokeret-hazebem, ụmụ Emọn. 60  Ndị niile na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392). 61  Ndị a bụ ndị si Tel-mila, Tel-hasha, Kirọb, Adọn, na Ịma lọta. Ma ha enweghị ihe ha ga-eji gosi ezinụlọ bụ́ ezinụlọ nna ha nakwa ebe ha si, ka a mata ma hà bụkwa ndị Izrel:+ 62  ụmụ Deleya, ụmụ Tobaya, ụmụ Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642). 63  Ndị a bụ ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà: ụmụ Habaya, ụmụ Hakọz,+ ụmụ Bazilaị, onye lụrụ otu n’ime ụmụ ndị nwaanyị Bazilaị+ onye Gilied ma zawa aha ya.* 64  Ha chọrọ akwụkwọ e dere aha ndị ezinụlọ ha, ma ha ahụghị aha ha. N’ihi ya, e kwuru na ha erughị eru ịbụ ndị nchụàjà.*+ 65  Gọvanọ*+ gwara ha ka ha ghara iso na-eri ihe ndị kacha nsọ+ ruo mgbe a ga-enwe onye nchụàjà nke ga-eji Yurim na Tọmịm*+ jụta Chineke ase. 66  Ọgbakọ ahụ niile dị puku mmadụ iri anọ na abụọ, narị atọ na iri isii (42,360),+ 67  e wepụ ndị ohu ha ndị nwoke na ndị nwaanyị,+ ndị dị puku asaa, narị atọ na iri atọ na asaa (7,337). Ha nwekwara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-abụ abụ.+ Ha dị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 68  Ịnyịnya ha dị narị asaa na iri atọ na isii (736), nnukwu jakị* ha adịrị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 69  Kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), obere jakị ha adịrị puku isii, narị asaa na iri abụọ (6,720). 70  Ụfọdụ ndị isi ọnụmara ha dị iche iche nyere onyinye maka ọrụ ahụ.+ Gọvanọ* nyere otu puku (1,000) mkpụrụ ego drakma ọlaedo* a ga-etinye n’ebe a na-edosa akụ̀, efere iri ise, na uwe mwụda ndị nchụàjà+ dị narị ise na iri atọ (530). 71  Ụfọdụ ndị isi ọnụmara ha dị iche iche nyekwara puku mkpụrụ ego drakma ọlaedo iri abụọ (20,000) na puku maịna* ọlaọcha abụọ na narị abụọ (2,200) a ga-etinye n’ebe a na-edosa akụ̀. 72  Ndị ọzọ nyere puku mkpụrụ ego drakma ọlaedo iri abụọ (20,000), puku maịna ọlaọcha abụọ (2,000), na uwe mwụda ndị nchụàjà dị iri isii na asaa. 73  Ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-abụ abụ,+ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* na ndị Izrel ndị ọzọ wee biri n’obodo ha dị iche iche.+ N’ọnwa nke asaa,+ ndị Izrel ebirila n’obodo ha dị iche iche.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ná mpaghara.” O nwere ike ịbụ mpaghara Babịlọn ma ọ bụkwanụ mpaghara Juda ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”
Ya bụ, aha ọgọ ya nwoke.
Ma ọ bụ “e wepụrụ aha ha ná ndị nchụàjà n’ihi na e weere ha ka ndị na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.
Okwu Hibru a sụgharịrị nnukwu jakị pụtara jakị nke nne ịnyịnya na oké jakị mụtara.
Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.
Drakma a hà ka mkpụrụ ego darik ndị Peshia e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ́ gram 8.4. Ma, ọ bụghị drakma e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Gụọ B14.
Maịna e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ gram 570. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”