Nehemaya 9:1-38

  • Ndị mmadụ kwupụtara mmehie ha (1-38)

    • Jehova bụ Chineke na-agbaghara mmehie (17)

9  N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa a, ndị Izrel gbakọtara. Ha yiiri ákwà iru uju, wụkwasịkwa onwe ha ájá n’isi, na-ebu ọnụ.+  Ndị bụ́ ụmụ afọ Izrel wee kwụsị iso ndị niile bụ́ ndị mba ọzọ emekọ ihe.+ Ha guzokwara ọtọ kwupụta mmehie ha na mmehie ndị nna nna ha.+  Ha wee guzoro n’ebe ahụ ha guzo na-agụpụta akwụkwọ Iwu+ Jehova bụ́ Chineke ha ruo awa atọ. Ha nọkwa na-ekwupụta mmehie ha ma na-akpọrọ Jehova bụ́ Chineke ha isiala ruo awa atọ ọzọ.  Jeshụa, Benaị, Kadmiel, Shebanaya, Bọnaị, Sherebaya,+ Benaị, na Kenenaị guzooro ọtọ n’elu ihe dị elu ndị Livai na-eguzo ekwu okwu+ ma jiri oké olu kpọkuo Jehova bụ́ Chineke ha.  Ndị Livaị bụ́ Jeshụa, Kadmiel, Benaị, Hashabnaya, Sherebaya, Hodaya, Shebanaya, na Petahaya wee sị: “Bilienụ too Jehova bụ́ Chineke unu ruo mgbe ebighị ebi.*+ Chineke, ka ha tookwa aha gị dị ebube, nke karịrị ngọzi niile na otuto niile.  “Naanị gị bụ Jehova.+ Ọ bụ gị kere eluigwe, ya bụ, eluigwe niile na ndị mmụọ ozi niile,* ụwa na ihe niile dị na ya, oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya. Ị na-echebe ha niile ndụ. Ndị mmụọ ozi niile na-akpọkwara gị isiala.  Ị bụ Jehova bụ́ ezi Chineke, onye họọrọ Ebram,+ kpọpụta ya n’obodo Ọọ+ nke ndị Kaldia ma gụọ ya Ebreham.+  Ị chọpụtara na ọ tụkwasịrị gị obi,+ gị na ya wee gbaa ndụ na ị ga-enye ya ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Jebus, na ndị Gegash, nakwa na ị ga-enye ụmụ* ya ala ndị ahụ.+ I mezuru nkwa gị n’ihi na ị bụ onye ezi omume.  “Ị hụrụ ahụhụ nna nna anyị hà tara n’Ijipt,+ ị nụkwara mkpu ákwá ha n’Oké Osimiri Uhie. 10  I wee mee ihe àmà dị iche iche, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche iji mesie Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile ike,+ n’ihi na ị ma na ha mekpara ndị gị ahụ́.+ I meere onwe gị aha nke dị ruo taa.+ 11  I kewara oké osimiri n’ihu ha, ha wee si n’ala nkịtị n’etiti oké osimiri gafee.+ Ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’ala ala oké osimiri ka nkume a tụbara n’osimiri ifufe na-enugharị.+ 12  I ji ogidi ígwé ojii duo ha n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị ka ọ na-enye ha ìhè n’ụzọ ha kwesịrị iso.+ 13  Ị gbadatara n’Ugwu Saịnaị+ wee si n’eluigwe gwa ha okwu+ ma mee ka ha mara ihe ndị dị mma i kpebiri, nyekwa ha iwu eziokwu,* ntụziaka dị mma nakwa iwu.+ 14  I mere ka ha mara Ụbọchị Izu Ike gị dị nsọ.+ I si n’aka Mosis ohu gị nye ha ntụziaka na iwu. 15  I sikwa n’eluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ na-agụ ha.+ I mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụta mgbe mmiri na-agụ ha.+ Ị gwakwara ha ka ha banye ma weghara ala ahụ ị ṅụrụ iyi* na ị ga-enye ha. 16  “Ma hanwa, bụ́ ndị nna nna anyị, buliri onwe ha elu+ ma mee isi ike,*+ ha egeghịkwa ntị n’iwu gị. 17  Ha ekweghị ege ntị,+ ha echetaghịkwa ọrụ ebube gị ndị ị rụụrụ ha. Kama, ha mere isi ike* ma họpụta onyeisi ka ha wee laghachi n’Ijipt gaa gbawakwa ohu.+ Ma ị bụ Chineke dị njikere ịgbaghara mmehie,* onye nwere ọmịiko* ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na onye ịhụnanya ya* dị ukwuu.+ Ị hapụghịkwa ha.+ 18  Mgbe ha meere onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ ma na-asị, ‘Ihe a bụ Chi unu nke dupụtara unu n’Ijipt,’+ ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe. 19  Ma ị hapụghị ha n’ala ịkpa n’ihi na ebere gị dị ukwuu.+ Ogidi ígwé ojii nke na-edu ha n’ụzọ esighị n’ebe ha nọ pụọ n’ehihie. Ogidi ọkụ ahapụghịkwa inye ha ìhè n’abalị n’ụzọ ha kwesịrị iso.+ 20  I nyere ha mmụọ gị* ka o mee ka ha mara ihe.+ I meghị ka mana gị kwụsị ịdara ha,+ i nyekwara ha mmiri mgbe mmiri na-agụ ha.+ 21  I nyere ha nri n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ.+ E nweghị ihe kọrọ ha. Uwe ha akaghị nká,+ ụkwụ ha azaghịkwa aza. 22  “I nyere ha alaeze dị iche iche na ndị dị iche iche, keere ha ala ndị ahụ ná mpaghara ná mpaghara.+ Ha wee weghara ala Saịhọn,+ ya bụ, ala eze Heshbọn,+ nakwa ala Ọg+ nke eze Beshan. 23  I mere ka ụmụ ha dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+ I wee kpọbata ha n’ala ahụ i kwere ndị nna nna ha nkwa na ha ga-abanye ma biri.+ 24  Ụmụ ha wee banye weghara ala ahụ.+ I meriiri ha ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ.+ I nyefere ndị Kenan n’aka ha, ma ndị eze ha ma ndị ala ahụ, ka ha mee ha ihe masịrị ha. 25  Ha weghaara obodo ndị a rụsiri ike+ na ala na-eme nri.+ Ha weghakwaara ụlọ ndị ihe ọma dị iche iche jupụtara, olulu mmiri e gwuru egwu, ubi vaịn, ubi oliv,+ na ọtụtụ osisi na-amị mkpụrụ. Ha wee rie ihe, rijuo afọ, buo ibu ma nwee obi ụtọ n’ihi otú i si dị mma. 26  “Ma, ha nupụụrụ gị isi, meere gị isi ike+ ma leghara Iwu gị anya.* Ha gburu ndị amụma gị ndị dọrọ ha aka ná ntị ka ha laghachikwute gị. Ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe.+ 27  N’ihi ya, i nyefere ha n’aka ndị iro ha,+ bụ́ ndị nọ na-emesi ha ike.+ Ma ha na-akpọku gị n’oge ha na-ata ahụhụ, gị anọrọ n’eluigwe nụ. Ị na-enye ha ndị ga-azọpụta ha n’aka ndị iro ha n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+ 28  “Ma ozugbo ha nweere onwe ha, ha na-ebidokwa mewe ihe na-adịghị gị mma.+ Ị na-ahapụ ha ka ndị iro ha kpara ha aka, ha na-emegbukwa ha.*+ Ha na-alọghachi kpọkuo gị ka i nyere ha aka.+ Ị na-anọ n’eluigwe nụ ma napụta ha ugboro ugboro n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+ 29  N’agbanyeghị na ị na-adọ ha aka ná ntị ka i wee mee ka ha bidokwa idebe Iwu gị, ha buliri onwe ha elu ma jụ ige ntị n’iwu gị.+ Ha mebikwara ntụziaka i nyere ha, bụ́ nke na-eme ka onye na-edebe ya dị ndụ.+ Ma, ha nọ na-eme isi ike ma na-agba isi akwara,* ha ekweghịkwa ege ntị. 30  I nweere ha ndidi+ ruo ọtụtụ afọ, sikwa n’ọnụ ndị amụma gị i nyere mmụọ gị na-adọ ha aka ná ntị. Ma ha ekweghị ege ntị. N’ikpeazụ, i nyefere ha n’aka ndị bi n’ala ndị gbara ha gburugburu.+ 31  N’ihi ebere gị nke dị ukwuu, i kpochapụghị ha,+ ị hapụghịkwa ha n’ihi na ị bụ Chineke nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+ 32  “Ugbu a, Chineke anyị, Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye na-emebighị ọgbụgba ndụ ya, onye hụrụ ndị ya n’anya,+ echefula nsogbu niile bịaara anyị, ndị eze anyị, ndị isi anyị,+ ndị nchụàjà anyị,+ ndị amụma anyị,+ nna nna anyị hà, na ndị gị niile malite n’oge ndị eze Asiria+ ruo taa. 33  N’agbanyeghị ihe niile merela anyị, ị bụ onye ezi omume n’ihi na i mere ihe ziri ezi. Ma, ọ bụ anyịnwa mere ihe ọjọọ.+ 34  Ndị eze anyị, ndị isi anyị, ndị nchụàjà anyị, na nna nna anyị hà edebeghị Iwu gị. Ha egeghịkwa ntị ná ntụziaka gị ma ọ bụ n’aka ná ntị ị dọrọ ha.* 35  Mgbe ha nọ n’alaeze ha na-eri uru ọtụtụ ihe ọma i nyere ha, nọrọkwa n’ala sara mbara i nyere ha nke na-eme nri, ha efeghị gị,+ ha ahapụghịkwa omume ọjọọ ha. 36  Taa, anyị bụzi ndị ohu.+ N’eziokwu, anyị bụzi ndị ohu n’ala i nyere nna nna anyị hà ka ha rie mkpụrụ ya na ihe ọma ndị dị na ya. 37  Mmehie anyị emeela ka ọtụtụ ihe ala anyị na-emepụta na-alara ndị eze i mere ka ha chịwa anyị.+ Ha na-achị anyị* na anụ ụlọ anyị otú ha si chọọ. Anyị atagbuola onwe anyị n’ahụhụ. 38  “N’ihi ihe a niile, anyị na-ede ihe anyị kwekọrịtara ime+ n’akwụkwọ. Ndị isi anyị, ndị Livaị anyị, na ndị nchụàjà anyị na-abịanyekwa aka na ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
O nwekwara ike ịbụ na anyanwụ, ọnwa, na kpakpando so n’ihe ndị Chineke kere a na-ekwu ebe a.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “iwu ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi.”
Na Hibru, “i weliri aka gị.”
Na Hibru, “kwesie olu ike.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “Chineke nke na-agbaghara mmehie.”
Na Hibru, “kwesiri olu ike.”
Na Hibru, “mmụọ gị dị mma.”
Na Hibru, “tụfee Iwu gị n’azụ ha.”
Ma ọ bụ “na-egweri ha.”
Na Hibru, “kwesie olu ike.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “n’ihe ncheta i ji dọọ ha aka ná ntị.”
Na Hibru, “ahụ́ anyị.”