Obedaya 1:1-21

  • A ga-akwatu Ịdọm n’ala n’ihi mpako ya (1-9)

  • Ịdọm mesiri Jekọb ike (10-14)

  • Ụbọchị Jehova nke ga-abịakwasị mba niile (15, 16)

  • Ụlọ Jekọb ga-enwetaghachi ala ya (17-21)

    • Jekọb ga-amụnye Ịdọm ọkụ, repịa ya (18)

    • Jehova ga-abụ eze (21)

 Ọhụụ Obedaya* hụrụ: Ihe a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru banyere Ịdọm:+ “Anyị anụla ozi Jehova ziri. E nwere onye ozi e zigara ná mba dị iche iche, ya ana-asị: ‘Bilienụ, ka anyị jikere ịlụso ya agha.’”+   “Lee, emeela m ka ị ghara ịbụ ihe ọ bụla n’anya mba dị iche iche. A na-eledakwa gị anya.+   Mpako nke juru gị obi eduhiela gị,+Gị onye bi n’ebe mgbaba nke dị na nkume dị elu. I bi n’ebe dị elu, na-asị n’obi gị,‘Ònye ga-akwatu m n’ala?’   Ọ bụrụgodị na i mee ka ebe i bi dị elu ka ebe ugo na-ebi,*Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị kpaa akwụ́ gị n’ebe kpakpando dị,M ga-esi n’ebe ahụ kwatuo gị.” Ọ bụ ihe Jehova kwuru.   “Ọ bụrụ na ndị ohi abịa na nke gị, ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị n’abalị,Ọ̀ bụ na ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn abịakwute gị,Ọ̀ bụ na ha agaghị aghọfọ mkpụrụ?+ Ma, a ga-ebibi gị kpamkpam.*   Ewoo, a chọtala Ịsọ! A chọtala akụ̀ ya ndị e zoro ezo ma bukọrọ ha.   Ha achụpụla gị ruo n’ókè nke ala ha. Ndị niile gị na ha dị ná mma* aghọgbuola gị. Ndị gị na ha dị n’udo emeriela gị. Ndị gị na ha na-erikọ nri* ga-eji ụgbụ siere gị ọnyà,Ma, ị gaghị achọpụta.”   Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,Ọ̀ bụ na agaghị m ebibi ndị ma ihe n’Ịdọm,+Bibiekwa ndị nwere nghọta n’ala Ịsọ bụ́ ugwu ugwu?   Timan,+ ụjọ ga-ejidekwa ndị agha gị,+N’ihi na a ga-ebibi onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ala Ịsọ bụ́ ugwu ugwu.+ 10  Ebe ọ bụ na i mesiri nwanne gị, bụ́ Jekọb, ike,+Ihere ga-emegbu gị,+A ga-ebibikwa gị ruo mgbe ebighị ebi.+ 11  N’ụbọchị i guzo na-ele ya n’anya n’anya,N’ụbọchị ndị ala ọzọ dọọrọ ndị agha ya n’agha,+Mgbe ndị mba ọzọ banyere n’ọnụ ụzọ ámá ya, feekwa nza+ iji kerie Jeruselem,I mere ka otu n’ime ha. 12  I kwesịghị ịnọ na-achị nwanne gị ọchị n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya.+ I kwesịghị ịṅụrị ọṅụ n’ihi ihe mere ndị Juda n’ụbọchị a na-ebibi ha.+ I kwesịghịkwa ịnọ na-etu ọnụ n’ụbọchị ha na-ata ahụhụ. 13  I kwesịghị ịbata n’ọnụ ụzọ ámá nke ndị m n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ha.+ I kwesịghị ịnọ na-achị ọchị n’ihi ahụhụ ọ na-ata n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya. I kwesịghịkwa imetụ akụ̀ ya aka n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya.+ 14  I kwesịghị iguzo n’ebe ụzọ gbara mkpị ka i gbuo ndị ya gbapụrụ agbapụ.+ I kwesịghịkwa inyefe ndị ya gbara ọsọ ndụ n’aka ndị iro ha n’ụbọchị ahụhụ.+ 15  N’ihi na ụbọchị Jehova nke ga-abịakwasị mba niile dị nso.+ Otú i si meso ndị ọzọ ka a ga-esi emeso gị.+ Ihe i mere ndị ọzọ ga-alọghachi n’isi gị. 16  N’ihi na otú unu si ṅụọ mmanya n’ugwu nsọ mKa mba niile ga na-aṅụ iwe m mgbe niile.+ Ha ga-aṅụ ya ma loda ya,Ha ga-adịkwa ka ndị na-adịtụbeghị adị. 17  Ma, a ga-enwe ndị a ga-echebe n’Ugwu Zayọn,+Ọ ga-adịkwa nsọ,+Ụlọ Jekọb ga-ewegharakwa ihe bụ́ nke ha.+ 18  Ụlọ Jekọb ga-aghọ ọkụ,Ụlọ Josef aghọọ ire ọkụ. Ụlọ Ịsọ ga-adịkwa ka ahịhịa ọka. Ha ga-amụnye ụlọ Ịsọ ọkụ ma repịa ya. A gaghịkwa enwe onye si n’ụlọ Ịsọ ga-afọ ndụ,+N’ihi na Jehova ekwuola ya. 19  Ha ga-eweghara Negeb* nakwa ala Ịsọ bụ́ ugwu ugwu,+Wegharakwa Shefila* na ala ndị Filistia.+ Ha ga-eweghara ala Ifrem nakwa ala Sameria,+Benjamin ga-ewegharakwa Gilied. 20  Ndị e si ná mgbidi a siri ike+ dọrọ n’agha,Ya bụ, ndị Izrel, ga-enwezi ala ndị Kenan ruo Zarefat.+ Ndị e si na Jeruselem dọrọ n’agha, bụ́ ndị nọ na Sefarad, ga-ebirizi n’obodo ndị dị na Negeb.+ 21  Ndị nzọpụta ga-agbagokwa n’Ugwu ZayọnKa ha kpee ala Ịsọ bụ́ ugwu ugwu ikpe,+Jehova ga-abụkwa eze.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Obedaya pụtara “Onye Na-ejere Jehova Ozi.”
O nwere ike ịbụ, “i fegoo n’elu elu ka ugo.”
O nwere ike ịbụ, “Olee otú ha ga-ebibiru gị?”
Ma ọ bụ “gị na ha gbara ndụ.”
Na Hibru, “na-atakọ achịcha.”
Ma ọ bụ “ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “ebe ugwu.”