Zefanaya 2:1-15

  • Chọọnụ Jehova tupu ụbọchị ọ ga-ewesa unu iwe eruo (1-3)

    • Chọọnụ ezi omume na ịdị umeala n’obi (3)

    • “Ikekwe, a ga-echebe unu” (3)

  • Ihe Jehova ga-eme mba ndị dị Jeruselem nso (4-15)

2  Zukọtanụ, zukọtanụ,+Unu mba ihere na-anaghị eme.+   Tupu e mee ihe e kpebiri ime,Tupu ụbọchị agafee otú ifufe si ebupụ mkpo ọka,Tupu Jehova ewesa unu iwe dị ọkụ,+Tupu ụbọchị Jehova ga-ewesa unu iwe eruo,   Chọọnụ Jehova,+ unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa,Ndị na-edebe iwu ya ziri ezi. Chọọnụ ezi omume. Chọọnụ ịdị umeala n’obi. Ikekwe,* a ga-echebe unu n’ụbọchị iwe Jehova.+   N’ihi na o nweghịzi onye ga-ebi na Gaza. Ashkelọn ga-abụkwa ebe tọgbọ chakoo.+ A ga-achụpụ Ashdọd n’etiti ehihie. A ga-efopụkwa Ekrọn.+   “Ndị Keretaịt, ndị bi n’akụkụ oké osimiri, ga-ata ahụhụ.+ Jehova amala unu ikpe. Kenan, bụ́ ala ndị Filistia, m ga-ebibi gị,Ka a ghara inwe onye ga-ebi na gị.   Akụkụ oké osimiri ga-aghọ ala ụmụ anụmanụ na-ata ahịhịa. Olulu mmiri maka ndị na-azụ atụrụ na ogige atụrụ ndị e ji nkume gbaa ga-adịkwa na ya.   Ọ ga-aghọkwa ógbè nke ndị fọdụrụ na Juda.+ Ha ga-erikwa nri na ya. Ná mgbede, ha ga-edina n’ụlọ ndị dị n’Ashkelọn. N’ihi na Jehova Chineke ha ga-echeta ha.* Ọ ga-eme ka ndị a dọọrọ n’agha n’ime ha lọghachite.”+   “Anụla m nkọcha Moab na-akọcha ndị m,+ nụkwa mkparị ụmụ Amọn na-akparị ha.+ Ha kwara ndị m emo, tuokwa ọnụ na ha ga-eweghara ala ha.”+   Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwukwara, sị: “N’ihi ya, ebe ọ bụ na m na-adị ndụ,Moab ga-adị ka Sọdọm,+Ụmụ Amọn ga-adịkwa ka Gọmọra,+ Ebe ahịhịa akụwa* juru, ala bụ́ nnu nnu, ebe tọgbọkwa nkịtị mgbe niile.+ Ndị fọdụrụ ná ndị m ga-akwakọrọ ihe dị na ha. Ndị fọdụrụ ná mba m ga-ebichi ha. 10  Ihe a ga-eme ha maka na ha dị mpako,+N’ihi na ha kwara ndị Jehova nke ụsụụ ndị agha emo, tuokwa ọnụ ihe ha ga-eme ha. 11  Mụnwa bụ́ Jehova ga-emenye ha egwu,N’ihi na m ga-ebibi chi niile dị n’ụwa.* Agwaetiti niile nke mba dị iche iche ga-akpọkwara m isiala.*+ Nke ọ bụla ga-esi n’ebe nke ya kpọọrọ m isiala. 12  Ununwa kwa, ndị Etiopia, mma agha m ga-egbu unu.”+ 13  Chineke ga-esetị aka ya n’ebe ugwu ma bibie Asiria. Ọ ga-emekwa ka Ninive tọgbọrọ chakoo,+ kpọọkwa nkụ ka ala ịkpa. 14  Ìgwè anụmanụ, ya bụ, ụdị anụ ọhịa niile,* ga-amakpu na ya. Ma okwolo ma ebi ogwu ga na-alakpu n’isi ogidi ya ndị dara ada. A ga na-anụ ubé nnụnụ na windo ya.* Chineke ga-ala ụzọ e si abata ya n’iyi,N’ihi na ọ ga-ewepụsị osisi sida e ji kụchie ya. 15  Obodo a bụ obodo dị mpako, nke obi rukwara ala,Nke nọ na-asị n’obi ya, ‘Anọ m ya. O nweghị onye ọzọ nọnụ.’ Ma, ọ ghọọla ebe a jụrụ ajụ,Ebe anụ ọhịa na-amakpu. Onye ọ bụla nke na-agafere ya ga-afụ mkpọrọhịhị, gbaakwa n’aka.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “O nwere ike bụrụ na.”
Ma ọ bụ “ga-elekọta ha.”
Ma ọ bụ “ahịhịa ogwu.”
Ma ọ bụ “m ga-eme ka chi niile dị n’ụwa taa ahụ́.”
Ma ọ bụ “ga-efekwa m.”
Na Hibru, “anụ ọhịa ọ bụla dị n’otu mba.”
O nwere ike ịbụ, “mkpọtụ ifufe ma ọ bụ ubé anụ ọhịa.”