Zekaraya 1:1-21

  • Jehova gwara ndị ya ka ha lọghachikwute ya (1-6)

    • ‘Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwute unu’ (3)

  • Ọhụụ nke Mbụ: Ndị na-agba ịnyịnya n’ebe e nwere osisi metụl (7-17)

    • “Jehova ga-akasi Zayọn obi ọzọ” (17)

  • Ọhụụ nke Abụọ: Mpi anọ na ndị omenkà anọ (18-21)

1  N’ọnwa nke asatọ, n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Darayọs,+ Jehova gwara onye amụma bụ́ Zekaraya*+ nwa Berekaya nwa Ido, sị:  “Jehova wesara nna unu hà na ndị nna nna unu oké iwe.+  “Gwa ha na ọ bụ ihe a ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: ‘Abụ m Jehova nke ụsụụ ndị agha. Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.’+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-agwa unu ihe a.”  “Jehova kwuru, sị: ‘Unu emela ka nna unu hà na ndị nna nna unu, ndị ndị amụma oge mbụ gwara, sị: “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Biko, hapụnụ ụzọ ọjọọ unu na omume ọjọọ unu.’”’*+ “‘Ma ha egeghị ntị, ha aṅaghịkwa m ntị.’+  “‘Olee ebe nna unu hà na ndị nna nna unu nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ hà dị ndụ ruo ebighị ebi?  Ma, ọ̀ bụ na ihe m gwara ndị amụma, bụ́ ndị ohu m, ka ha gwa nna unu hà na ndị nna nna unu emezughị n’isi ha mgbe ha nupụụrụ iwu m isi?’+ Ha wee lọghachikwute m ma sị: ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha emeela anyị ihe o kwuru ọ ga-eme anyị n’ihi omume anyị na ụzọ anyị.’”+  N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke iri na otu, ya bụ, n’ọnwa Shibat,* n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Darayọs,+ Jehova gwara onye amụma bụ́ Zekaraya nwa Berekaya nwa Ido okwu.  Zekaraya wee kwuo, sị: “Ahụrụ m ọhụụ n’abalị. E nwere otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O wee kwụrụ otu ebe n’ebe e nwere osisi metụl ndị dị na ndagwurugwu. N’azụ ya, e nwere ịnyịnya ndị na-acha uhie uhie, ndị na-acha nchara nchara, nakwa ndị na-acha ọcha.”  M wee sị: “Onyenwe m, ole ndị ka ndị a bụ?” Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu zara m, sị: “M ga-egosi gị ndị ha bụ.” 10  Nwoke ahụ nke kwụ otu ebe n’ebe ahụ e nwere osisi metụl wee sị: “Ha bụ ndị Jehova zipụrụ ka ha gagharịa n’ụwa.” 11  Ha gwara mmụọ ozi Jehova nke kwụ otu ebe n’ebe ahụ e nwere osisi metụl, sị: “Anyị agagharịala n’ụwa. Lee, ụwa niile dị jụụ, e nweghịkwa nsogbu na ya.”+ 12  Mmụọ ozi Jehova wee sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, olee mgbe ị ga-anọru tupu gị emeere Jeruselem na obodo ndị dị na Juda ebere,+ bụ́ ndị ị na-ewesa iwe kemgbe afọ iri asaa a?”+ 13  Jehova zara mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu. Ọ gwara ya okwu dị mma, nke na-akasi obi. 14  Mmụọ ozi ahụ nke nọ na-agwa m okwu sịrị m: “Jiri olu dara ụda kwuo, sị, ‘Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Ihe gbasara Jeruselem na Zayọn na-anụsi m ọkụ n’obi ike.+ 15  M na-ewesa mba ndị chere na e nweghị ihe ọ bụla ga-eme ha oké iwe.+ M wesatụrụ ndị m iwe,+ ma mba ndị ahụ mere ka ọdachi dakwasịrị ha ka njọ.”’+ 16  “N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: ‘“M ga-alọghachikwute Jeruselem ka m meere ya ebere.”+ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị: “A ga-arụghachi ụlọ m n’ime ya,+ a ga-ejikwa eriri e ji atụ̀ ihe tụọ Jeruselem.”’+ 17  “Jiri olu dara ụda kwuo ọzọ, sị, ‘Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Ịdị mma m ga-ejupụta n’obodo m dị iche iche. Jehova ga-akasi Zayọn obi ọzọ,+ ọ ga-ahọrọkwa Jeruselem ọzọ.”’”+ 18  M wee lelie anya hụ mpi anọ.+ 19  M jụziri mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu, sị: “Gịnị ka ihe ndị a bụ?” Ọ zara, sị: “Ha bụ mpi ndị chụsasịrị Juda,+ Izrel,+ na Jeruselem.”+ 20  Jehova wee gosi m ndị omenkà anọ. 21  M jụrụ, sị: “Gịnị ka ndị a na-abịa ime?” Ọ sịrị: “Ndị a bụ mpi ndị chụsasịrị Juda nke na o nweghị onye welitere isi elu. Ndị nke ọzọ a ga-abịa ka ha menye ha ụjọ, ka ha kụjisie mpi mba ndị sọrọ ala Juda mpi iji chụsasịa ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Zekaraya pụtara “Jehova Echetala.”
Ma ọ bụ “sinụ n’ụzọ ọjọọ unu na omume ọjọọ unu lọghachi.”
Gụọ B15.