Zekaraya 10:1-12

  • Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo (1, 2)

  • Jehova ga-eme ka ndị ya dị n’otu (3-12)

    • E si n’ụlọ Juda nweta onyeisi (3, 4)

10  “Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo n’ụla mmiri. Ọ bụ Jehova na-eme ka mmiri ruo n’ígwé ojii. Ọ na-eme ka mmiri zooro ndị mmadụ,+Na-emekwa ka ala mepụtara onye ọ bụla ihe.   N’ihi na arụsị ezinụlọ* dị iche iche ekwuola okwu aghụghọ.* Ndị na-agba afa ahụla ọhụụ ụgha. Ha na-akọ nrọ na-abaghị uru. Mbọ ha na-agba ka ha kasie ndị mmadụ obi enweghị isi. Ọ bụ ya mere ha ga-eji wagharịa ka atụrụ. Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na e nweghị onye ọzụzụ atụrụ.   M na-ewesa ndị ọzụzụ atụrụ iwe dị ọkụ,M ga-emekwa ka ndị isi* obi tara mmiri zaa ajụjụ,N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha elebarala ìgwè atụrụ ya anya,+ ya bụ, ụlọ Juda. O meekwala ka ha sie ike ma dị ebube ka ịnyịnya o ji aga agha.   E si na ya nweta onyeisi.* E si na ya nweta onye ọchịchị na-akwado ya.* E si na ya nweta ụta agha. E si na ya nweta onye nlekọta* ọ bụla, ha niile.   Ha ga-adịkwa ka ndị aghaNa-azọ apịtị ndị dị n’okporo ámá ụkwụ mgbe ha na-alụ agha. Ha ga-alụ agha n’ihi na Jehova nọnyeere ha.+ A ga-emenye ndị na-agba ịnyịnya ihere.+   M ga-eme ka ụlọ Juda ka ndị ọzọ ike,M ga-azọpụtakwa ụlọ Josef.+ M ga-akpọghachi ha n’ala ha,N’ihi na m ga-emere ha ebere.+ Ha ga-adị ka ndị ọ na-enwebeghị mgbe m chụpụrụ ha,+N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha, m ga-azakwa ha.   Ndị Ifrem ga-adị ka dike n’agha. Obi ga-atọ ha ụtọ ka à ga-asị na ha ṅụrụ mmanya.+ Ụmụ ha ga-ahụ ihe a ma ṅụrịa ọṅụ. Obi ha ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.+   ‘M ga-afụrụ ha mkpọrọhịhị ma kpọkọta ha,N’ihi na m ga-agbapụta ha,+ ha ga-adịkwa ọtụtụ,Ma na-adịkwu ọtụtụ.   N’agbanyeghị na m ga-aghasasị ha ka mkpụrụ n’etiti ndị dị iche iche,Ha ga-anọ n’ebe ndị dị anya cheta m. Ha na ụmụ ha ga-enwetaghachi ume ma lọta. 10  M ga-esi n’Ijipt kpọlata ha,Sikwa n’Asiria kpọkọta ha.+ M ga-akpọta ha na Gilied+ nakwa na Lebanọn,A gaghịkwa enwe ebe ga-aba ha.+ 11  Ọ ga-agafere oké osimiri kpata nsogbu na ya. Ọ ga-eti ebili mmiri ihe n’oké osimiri ahụ, ya adajụọ.+ Mmiri niile dị n’osimiri Naịl ga-ata. A ga-eweda ihe Asiria ji anya isi ala,Mkpanaka Ijipt agaghịkwa adị.+ 12  Mụnwa bụ́ Jehova ga-eme ka ha ka ndị ọzọ ike,+Ha ga na-azakwa aha m.’*+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “terafim.”
Ma ọ bụ “okwu siri ike nkọwa; ihe dị mgbagwoju anya.”
Na Hibru, “mkpi.”
Na Hibru, “ụlọ elu dị n’isi mgbidi.” Ọ pụtara nwoke dị ezigbo mkpa.
Na Hibru, “mkpọ́.” Ọ pụtara onye na-akwado onye ọzọ; onye ọchịchị.
Ma ọ bụ “onyeisi ọrụ.”
Na Hibru, “Ha ga na-ejegharị n’aha m.”