Zekaraya 14:1-21

  • Mmadụ niile ga-efewe ezi Chineke (1-21)

    • Ugwu Oliv ga-agbawa abụọ (9)

    • Jehova ga-abụ otu, nweekwa otu aha (9)

    • A ga-eme ka ndị iro Jeruselem rịa ọrịa ọjọọ (12-15)

    • A ga-eme Ememme Ụlọ Ndò (16-19)

    • Ite ọ bụla ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ (20, 21)

14  “Lee, ụbọchị na-abịa, bụ́ ụbọchị Jehova, mgbe a ga-anọ n’ime gị* kesaa ihe gị ndị a kwakọọrọ n’agha.  M ga-akpọkọta mba niile ka ha lụso Jeruselem agha. A ga-eweghara obodo a, kwakọrọ ihe dị n’ụlọ ndị dị na ya, dinaakwa ụmụ nwaanyị ya n’ike. A ga-adọrọ ọkara ndị bi n’obodo a n’agha, ma a ga-ahapụ ndị fọrọ afọ ka ha nọrọ n’obodo a.  “Jehova ga-aga lụso mba ndị ahụ agha+ otú o si alụ agha n’ụbọchị agha.+  N’ụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo n’elu Ugwu Oliv+ nke chere Jeruselem ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ugwu Oliv ga-agbawakwa abụọ, malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ,* mee ka e nwee nnukwu ndagwurugwu. Otu ọkara ugwu ahụ ga-aga n’ebe ugwu, ọkara nke ọzọ agaa n’ebe ndịda.  Unu ga-agbaga na ndagwurugwu nke ugwu m n’ihi na ndagwurugwu nke ugwu ahụ ga-eru n’Ezel. Unu ga-agba ọsọ otú unu gbara n’ihi ala ọma jijiji mere n’ụbọchị Eze Ọzaya nke Juda.+ Jehova bụ́ Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ niile.+  “N’ụbọchị ahụ, ìhè nke na-enwu gbaa agaghị adị.+ Ihe dị iche iche ga-akpụkọ akpụkọ.*  Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche nke a ma na ọ bụ ụbọchị Jehova.+ Ọ gaghị abụ ehihie, ọ gaghịkwa abụ abalị. Ìhè ga-adịkwa ná mgbede.  N’ụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ+ ga-esi na Jeruselem na-asọpụta.+ Otu ọkara mmiri ahụ ga na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,*+ ọkara nke ọzọ ana-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*+ Ọ ga-eme n’oge okpomọkụ nakwa n’oge oyi.  Jehova ga-abụkwa Eze ụwa niile.+ N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-abụ otu,+ ọ ga-enwekwa otu aha.+ 10  “Ala a niile ga-adị ka Araba,+ malite na Giba+ ruo Rimọn+ nke dị n’ebe ndịda Jeruselem. Ọ* ga-ebili dịrị n’ebe ọ dịbu.+ Ndị mmadụ ga-ebikwa na ya, malite n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin+ ruo n’ebe Ọnụ Ụzọ Ámá Mbụ dị, ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi, malitekwa n’Ụlọ Nche Hananel+ ruo n’ebe a na-azọchapụtara eze mmanya. 11  Ndị mmadụ ga-ebi na ya. A gakwaghị abụ ya ọnụ ka e wee bibie ya.+ Obi ga-erukwa ndị ga-ebi na Jeruselem ala.+ 12  “Ihe a bụkwa ọrịa ọjọọ Jehova ga-eme ka ndị niile na-alụso Jeruselem agha rịa:+ Anụ ahụ́ ha ga-erekapụsị ka ha guzo ọtọ, anya ha ga-erekapụsị n’oghere anya ha, ire ha ga-erekapụsịkwa n’ime ọnụ ha. 13  “N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-eme ka ha niile nọrọ n’ọgba aghara. Onye nke ọ bụla ga-ejide ibe ya n’aka, lụso ibe ya ọgụ.+ 14  Juda ga-eso lụọ agha na Jeruselem. A ga-achịkọta akụ̀ mba niile gbara ha gburugburu, ya bụ, ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha na uwe.+ 15  “A ga-eme ka ịnyịnya, nnukwu jakị,* kamel, obere jakị, na anụmanụ niile nọ n’ebe ndị ahụ mara ụlọikwuu rịa ụdị ọrịa ọjọọ ahụ. 16  “Onye ọ bụla fọrọ n’ime mba niile ndị na-alụso Jeruselem agha ga na-agbago kwa afọ+ ka ọ kpọọrọ Eze, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ isiala,* nakwa ka o mee Ememme Ụlọ Ndò.+ 17  Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ezinụlọ niile dị n’ụwa agbagoghị Jeruselem ịkpọrọ Eze, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, isiala, mmiri agaghị ezoro ya.+ 18  Ọ bụrụ na ezinụlọ Ijipt abịaghị, ọ bụrụkwa na ha abataghị, mmiri agaghị ezoro ha. Kama, Jehova ga-eme ka Ijipt rịa ọrịa ọjọọ ahụ ọ ga-eme ka mba ndị na-abịaghị mee Ememme Ụlọ Ndò rịa. 19  Ọ bụ ya bụ ahụhụ a ga-ata Ijipt na mba niile na-abịaghị mee Ememme Ụlọ Ndò. A ga-ata ha ahụhụ a maka na ọbịbịa ha na-abịaghị bụ mmehie. 20  “N’ụbọchị ahụ, a ga-ede ‘Jehova bụ Onye Dị Nsọ’+ ná mgbịrịgba ịnyịnya dị iche iche nya n’olu. Ite ndị e ji esi nri*+ n’ụlọ Jehova ga-adị ka efere+ ndị dị n’ihu ebe ịchụàjà. 21  Ite ọ bụla e ji esi nri* na Jeruselem nakwa na Juda ga-abụ ihe dị nsọ, bụrụkwa nke Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ndị niile na-achụ àjà ga-abata were ụfọdụ n’ime ha sie ihe. N’ụbọchị ahụ, a gakwaghị enwe onye Kenan* n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, obodo e kwuru okwu ya n’amaokwu nke 2.
Na Hibru, “n’osimiri.”
Ma ọ bụ “ga-akwụrụ otu ebe,” ka à ga-asị na oyi mere ka ọ kpụkọta.
Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.
Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.
Ya bụ, Jeruselem.
Okwu Hibru a sụgharịrị nnukwu jakị n’ebe a pụtara jakị nke nne ịnyịnya na oké jakị mụtara.
Ma ọ bụ “ka o fee Eze, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha.”
Ma ọ bụ “Ite ọnụ ha sara mbara e ji esi nri.”
Ma ọ bụ “Ite ọnụ ya sara mbara e ji esi nri.”
O nwere ike ịbụ, “onye na-azụ ahịa.”