Zekaraya 3:1-10

  • Ọhụụ nke Anọ: E yiwere nnukwu onye nchụàjà uwe dị mma (1-10)

    • Setan megidere Joshụa, nnukwu onye nchụàjà (1)

    • ‘M ga-akpọbata ohu m bụ́ Ome’ (8)

3  O wee gosi m Joshụa+ nnukwu onye nchụàjà ka o guzo n’ihu mmụọ ozi Jehova, Setan+ guzokwa n’aka nri Joshụa ka o megide ya.  Mmụọ ozi Jehova wee sị Setan: “Ka Jehova baara gị mba, Setan.+ Ka Jehova, onye họọrọ Jeruselem,+ baara gị mba! Ọ̀ bụ na onye a abụghị nkụ ka na-enwu enwu a lọpụtara n’ọkụ?”  Ma Joshụa yi uwe ruru unyi guzoro n’ihu mmụọ ozi ahụ.  Mmụọ ozi ahụ gwara ndị guzo n’ihu ya, sị, “Yipụnụ ya uwe ya ruru unyi.” O wee sị ya: “Lee, ewepụla m mmehie gị,* a ga-eyiwekwa gị uwe dị mma.”*+  M wee sị: “Keenụ ya ákwà dị ọcha n’isi.”+ Ha wee kee ya ákwà dị ọcha n’isi, yiwekwa ya uwe; mmụọ ozi Jehova guzokwa n’akụkụ.  Mmụọ ozi Jehova gwaziri Joshụa, sị:  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na ị ga-eje ije n’ụzọ m ma rụọ ọrụ niile m nyere gị ka ị rụọrọ m, ị ga-abụ onyeikpe n’ụlọ m+ ma na-elekọta ogige m.* M ga-emekwa ka ị na-abata n’ihu m mgbe ọ bụla otú ndị a guzo ebe a si eme.’  “‘Joshụa Nnukwu Onye Nchụàjà, biko, nụrụ, gị na ndị nchụàjà nọ ọdụ n’ihu gị, n’ihi na ha bụ ihe àmà. Lee, m na-akpọbata ohu m+ aha ya bụ Ome.+  Lee nkume m dowere n’ihu Joshụa. Anya asaa dị na nkume ahụ. M ga-akanye akara na ya, m ga-ewepụkwa mmehie ala ahụ n’otu ụbọchị.’+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 10  “‘N’ụbọchị ahụ, onye ọ bụla n’ime unu ga-akpọ onye agbata obi ya ka ọ bịa n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya.’+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ikpe mara gị.”
Ma ọ bụ “uwe ememme.”
Ma ọ bụ “na-ahụ maka ogige m; na-eche ogige m nche.”