Zekaraya 4:1-14

  • Ọhụụ nke Ise: Ihe e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ (1-14)

    • ‘Ọ bụghị ike mmadụ, kama ọ bụ mmụọ m ga-eme ha’ (6)

    • Eledala ụbọchị ihe ji nke nta nke nta malite anya (10)

4  Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu bịaghachiri kpọtee m otú e si akpọte onye nọ n’ụra.  O wee jụọ m, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?” M wee sị ya: “M na-ahụ ihe e ji adọsa ọkụ.* Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji rụọ ya,+ otu efere dịkwa n’elu ya. Ọkụ* asaa dị na ya.+ N’eziokwu, ha dị asaa. Ọkụ ndị ahụ dị n’elu ya nwekwara okporo asaa mmanụ ọkụ si abanye na ha.  Osisi oliv abụọ dịkwa n’akụkụ ya.+ Otu dị n’aka nri efere ahụ, otu adịrị n’aka ekpe ya.”  M wee jụọ mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, sị: “Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a pụtara?”  Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu wee jụọ m, sị: “Ọ̀ bụ na ị maghị ihe ihe ndị a pụtara?” M zara ya, sị: “Mba, onyenwe m.”  Ọ sịziri m: “Jehova gwara Zerubabel, sị: ‘“Ọ bụghị ìgwè ndị agha ga-eme ihe ndị a, ọ bụghịkwa ike mmadụ,+ kama ọ bụ mmụọ m+ ga-eme ha.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  Nnukwu ugwu, ònye ka ị bụ? Ị ga-abụ ala dị larịị+ n’ihu Zerubabel.+ Ọ ga-ewepụtakwa nkume ga-adị n’elu elu mgbe a ga na-eti mkpu, sị: “Ọ mara ezigbo mma! Ọ mara ezigbo mma!”’”  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Ọ bụ aka Zerubabel tọrọ ntọala ụlọ a,+ ọ bụkwa aka ya ga-arụcha ya.+ Unu ga-amarakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute unu. 10  È nwere onye ledara ụbọchị ihe ji nke nta nke nta malite* anya?+ N’ihi na ha ga-aṅụrị ọṅụ, hụkwa eriri e ji atụ̀ ihe* n’aka Zerubabel. Ha* asaa bụ anya Jehova. Ha na-elezu ụwa* niile.”+ 11  M wee jụọ ya, sị: “Gịnị ka osisi oliv abụọ a dị n’aka nri na n’aka ekpe ihe a e ji adọsa ọkụ* pụtara?”+ 12  M jụkwara ya nke ugboro abụọ, sị: “Gịnị ka alaka* ndị dị n’osisi oliv abụọ a pụtara, bụ́ ndị na-agbapụta mmanụ na-acha ọlaedo ọlaedo ndị na-esi n’okporo abụọ e ji ọlaedo rụọ na-asọba n’efere?” 13  O wee jụọ m, sị: “Ọ̀ bụ na ị maghị ihe ihe ndị a pụtara?” M zara ya, sị: “Mba, onyenwe m.” 14  Ọ sịrị: “Ha bụ ndị e tere mmanụ. Ha dị abụọ, ha guzokwa n’akụkụ Onyenwe elu ụwa niile.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “Oriọna.”
Ma ọ bụ “ụbọchị ihe nta.”
Na Hibru, “okwute,” ya bụ, okwute e kegidere eriri nke e ji amata ma ihe ọ̀ kwụkwa ọtọ.
“Ha” nwere ike ịbụ ọkụ asaa ahụ ma ọ bụkwanụ anya Jehova.
Na Hibru, “na-awagharị n’ụwa.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ya bụ, alaka ndị mkpụrụ mịjuru na ha n’osisi ahụ.