Zekaraya 5:1-11

  • Ọhụụ nke Isii: Akwụkwọ mpịakọta na-efe efe (1-4)

  • Ọhụụ nke Asaa: Ihe e ji atụ̀ ihe (5-11)

    • Aha nwaanyị nọ n’ime ya bụ Ajọ Omume (8)

    • E bugara ihe ahụ e ji atụ̀ ihe n’ala Shaịna (9-11)

5  M leliri anya ọzọ hụ akwụkwọ mpịakọta na-efe efe.  Mmụọ ozi ahụ jụrụ m, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?” M zara, sị: “M na-ahụ akwụkwọ mpịakọta na-efe efe. Ọ dị kubit* iri abụọ n’ogologo, dịkwa kubit iri n’obosara.”  O wee sị m: “Ihe a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-agagharị n’elu ụwa niile, n’ihi na a taghị ndị na-ezu ohi+ ahụhụ n’agbanyeghị na e dere n’ihu akwụkwọ a na izu ohi bụ arụ. A taghịkwa ndị na-aṅụ iyi ụgha+ ahụhụ n’agbanyeghị na e dere n’azụ akwụkwọ a na mmadụ ịṅụ iyi ụgha bụ arụ.  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ezipụla m ya. Ọ ga-abanye n’ụlọ onye ohi nakwa n’ụlọ onye ji aha m aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide n’ime ụlọ ahụ ma bibie ya na osisi ya nakwa nkume ya.’”  Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu wee bịakwute m ma sị m: “Biko, lelie anya hụ ihe na-apụta.”  M wee jụọ ya, sị: “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ zara, sị: “Ọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe* na-apụta.” Ọ sịkwara: “Ọ bụ otú a ka ha dị n’ụwa niile.”  M wee hụ na e buliri okwuchi ya dị okirikiri nke e ji nkume led* rụọ, e nwekwara otu nwaanyị nọ ọdụ n’ime ya.  O wee sị: “Ihe a bụ Ajọ Omume.” O nubaghachiri ya n’ime ihe ahụ e ji atụ̀ ihe, buruzie okwuchi ahụ e ji nkume led* rụọ kwuchie ọnụ ya.  M leliri anya hụ ụmụ nwaanyị abụọ ndị na-abịa, ha na-efekwa efe n’ikuku. Ha nwere nku yiri nku ụgbala ọcha.* Ha wee bulie ihe ahụ e ji atụ̀ ihe elu n’agbata eluigwe na ụwa. 10  M wee jụọ mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, sị: “Ebee ka ha na-ebuga ihe ahụ e ji atụ̀ ihe?” 11  Ọ zara, sị: “Ọ bụ n’ala Shaịna,*+ ka a gaa rụọrọ nwaanyị ahụ ụlọ. A rụchaa ya, a ga-ekusa ya ebe ahụ, n’ebe o kwesịrị ịnọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Na Hibru, “efa.” N’amaokwu a, ọ pụtara ihe ma ọ bụ nkata ga-aba ihe dị otu efa. Otu efa bụ lita 22. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “opu.”
Ma ọ bụ “opu.”
Ma ọ bụ “shekeleke.”
Ya bụ, Babịlonia.