Zekaraya 6:1-15

  • Ọhụụ nke Asatọ: Ụgbọ ịnyịnya anọ (1-8)

  • Ome ahụ ga-abụ eze na onye nchụàjà (9-15)

6  M wee lelie anya ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ si n’agbata ugwu abụọ na-abịa. Ugwu ndị ahụ bụ ugwu ọla kọpa.  Ọ bụ ịnyịnya ndị na-acha ọbara ọbara dọkpụ ụgbọ ịnyịnya nke mbụ, ịnyịnya ndị na-eji oji adọkpụrụ ụgbọ ịnyịnya nke abụọ.+  Ịnyịnya ndị na-acha ọcha dọkpụ ụgbọ ịnyịnya nke atọ, ịnyịnya ndị tụrụ àgwà na ndị nwere ụcha dị iche iche adọkpụrụ ụgbọ ịnyịnya nke anọ.+  M jụrụ mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, sị: “Onyenwe m, gịnị bụ ihe ndị a?”  Mmụọ ozi ahụ zara m, sị: “Ha bụ mmụọ anọ+ nke eluigwe, ndị na-apụ mgbe ha guzochara n’ihu Onyenwe ụwa niile.+  Nke ahụ* ịnyịnya ndị na-eji oji dọkpụ na-aga n’ala dị n’ebe ugwu.+ Ndị nke na-acha ọcha na-aga n’ala dị n’ebe ọdịda anyanwụ.* Ndị nke tụrụ àgwà na-aga n’ala dị n’ebe ndịda.  Ndị nke nwere ụcha dị iche iche chọrọ ka ha gaa gagharịa n’ụwa.” O wee sị: “Gawanụ, gagharịanụ n’ụwa.” Ha wee malite ịgagharị n’ụwa.  O wee kpọọ m, sị m: “Lee, ndị nke na-aga n’ala dị n’ebe ugwu emeela ka mmụọ Jehova dịrị n’ala dị n’ebe ugwu.”  Jehova wee gwa m okwu ọzọ, sị: 10  “Nara Heldaị, Tobaịja, na Jedeya ihe ndị a dọọrọ n’agha nyere ha. N’ụbọchị ahụ, ị ga-aga n’ụlọ Josaya nwa Zefanaya, gị na ndị a si Babịlọn lọta. 11  Were ọlaọcha na ọlaedo kpụọ okpueze* ma kpuwe ya n’isi nnukwu onye nchụàjà bụ́ Joshụa+ nwa Jehozadak. 12  Sịkwa ya,“‘Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Ọ bụ nwoke a ka aha ya bụ Ome.+ Ọ ga-esi n’ebe ọ nọ pulite, ọ ga-arụkwa ụlọ nsọ Jehova.+ 13  Ọ bụ ya ga-arụ ụlọ nsọ Jehova, ọ bụkwa ya ga-enweta ebube. Ọ ga-anọ n’ocheeze ya na-achị, ọ ga-abụkwa onye nchụàjà n’ocheeze ya.+ Ọrụ abụọ ahụ* ga na-agakọ ọnụ. 14  Okpueze* ahụ ga-abụ ihe a ga-eji na-echeta Hilem, Tobaịja, Jedeya,+ na Hen nwa Zefanaya n’ụlọ nsọ Jehova. 15  Ndị nọ n’ebe dị anya ga-abịa soro rụọ ụlọ nsọ Jehova.” Unu ga-amatakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute unu. Ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ụgbọ ịnyịnya.
Ma ọ bụ “n’ofe oké osimiri.”
Ma ọ bụ “okpueze pụrụ iche.”
Ya bụ, ọrụ abụọ ọ ga-arụ nke bụ́ ịbụ eze na ịbụ onye nchụàjà.
Ma ọ bụ “Okpueze pụrụ iche.”