Zekaraya 7:1-14

  • Jehova anabataghị ibu ọnụ na-esighị ndị ya n’obi (1-14)

    • ‘Ọ̀ bụ m ka unu buuru ọnụ n’eziokwu?’ (5)

    • ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi, na-ahụnụ ibe unu n’anya, na-emerenụ ibe unu ebere’ (9)

7  N’afọ nke anọ n’ọchịchị Eze Darayọs, Jehova gwara Zekaraya+ okwu n’abalị anọ n’ọnwa nke itoolu, ya bụ, n’ọnwa Kislev.*  Ndị Betel zipụrụ Shariza na Rigem-melek na ndị obodo ya ka ha gaa rịọ Jehova ka o meere ha amara.*  Ha sịrị ndị nchụàjà nọ n’ụlọ* Jehova nke ụsụụ ndị agha na ndị amụma: “Ọ̀ bụ anyị* bee ákwá n’ọnwa nke ise,+ gharakwa iri nri, otú anyị* merela ọtụtụ afọ?”  Jehova nke ụsụụ ndị agha gwara m okwu ọzọ, sị:  “Gwa ndị niile bi n’ala a na ndị nchụàjà, sị, ‘Mgbe unu buru ọnụ ma bee ákwá arịrị n’ọnwa nke ise nakwa n’ọnwa nke asaa+ ruo afọ iri asaa,+ ọ̀ bụ m ka unu buuru ya n’eziokwu?  Mgbe unu riri ihe ma ṅụọ mmanya, ọ́ bụghị onwe unu ka unu riiri ya ma ṅụọrọ ya?  Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị irube isi n’okwu Jehova si n’ọnụ ndị amụma oge mbụ kwuo+ mgbe ndị mmadụ bi na Jeruselem nakwa n’obodo ya ndị gbara ya gburugburu, mgbe ha nọkwa n’udo, mgbe ndị mmadụ bikwa na Negeb* nakwa na Shefila?’”*  Jehova gwara Zekaraya okwu ọzọ, sị:  “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi.+ Na-ahụnụ ibe unu n’anya,*+ na-emekwaranụ ibe unu ebere. 10  Unu erigbula nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna,*+ onye ala ọzọ+ ma ọ bụ ogbenye.+ Unu akpakwala nkata ọjọọ n’obi unu ka unu mee ibe unu ihe ọjọọ.’+ 11  Ma ha ekweghị ege ntị.+ Ha mere isi ike,+ ha kpọchikwara ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe.+ 12  Ha mere ka obi ha sie ike ka dayamọnd.*+ Ha erubeghị isi n’iwu* nakwa n’okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha ji mmụọ ya mee ka ndị amụma oge mbụ kwuo.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha wee wee oké iwe.”+ 13  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Otú ahụ ha na-egeghị ntị mgbe m* kpọrọ ha,+ agaghịkwa m ege ntị ma ha kpọọ m.+ 14  M wee jiri oké ifufe fesasịa ha ná mba niile ha na-amaghị.+ Ala ha wee tọgbọrọ chakoo mgbe ha pụchara. E nweghị onye si na ya na-agafe, e nweghịkwa onye na-alọghachi na ya+ n’ihi na ha mere ka ala ahụ mara mma bụrụ ala na-atụ ụjọ.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B15.
Ma ọ bụ “mee ka obi Jehova jụrụ.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”
Na Hibru, “m.”
Na Hibru, “m.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
Ma ọ bụ “Na-egosinụ ibe unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
O nwere ike ịbụ, “nkume siri ike,” dị ka nkume emụri.
Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”
Na Hibru, “ọ.”