AJỤJỤ NKE 13
Ajụjụ nke 13: Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara mmadụ ịrụ ọrụ?
“Ọ bụrụ na mmadụ ma ọrụ ya nke ọma, ọ ga-eguzo n’ihu ndị eze. Ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.”
“Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama, ka ọ na-arụsi ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ dị mma, ka o wee nwee ihe ọ ga-enye onye nọ ná mkpa.”
“Ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ mmanya ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ọrụ niile ọ na-arụsi ike. Ọ bụ onyinye Chineke.”