Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ ASTER PARKER

M Chọrọ Iji Ndụ M Jeere Jehova Ozi

M Chọrọ Iji Ndụ M Jeere Jehova Ozi

 Obi dị m ụtọ na papa m na mama m kụziiri m eziokwu Baịbụl mgbe m ka bụ nwata. Ha ji ihe osise na akụkọ ndị dị n’akwụkwọ anyị bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri kụziere m ihe ya eruo m n’obi. M na-eji ịnụ ọkụ n’obi akọrọ ụmụaka bi anyị nso na papa ukwu m ihe ndị m mụtara mgbe ọ bụla ọ bịara ileta anyị. Papa m na mama m gbara mbọ hụ na anyị na ha na-efekọ Jehova ọnụ oge niile, ihe a ha mere nyekwaara ezinụlọ anyị aka iji ihe gbasara ife Chineke kpọrọ ihe mgbe anyị si Asmara dị n’Eritria kwaga Adis Ababa dị n’Etiopia.

 M bidoro mgbe m ka dị obere jiri eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe. M chọrọ inyefe Jehova onwe m ma mee baptizim. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na m mechara mee ya mgbe m dị afọ 13. Mgbe m dị afọ 14, Nwanna Helge Linck a jụrụ m ma ò nwetụla mgbe m chere echiche ịmalite ọsụ ụzọ oge niile. M ka na-echeta nnọọ ihe ndị anyị kwurịtara n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ eziokwu na papa m na mama m abụtụla ndị ọsụ ụzọ nwa oge (ihe a na-akpọzi ya ugbu a bụ ọsụ ụzọ inyeaka), amaghị m ihe ọ pụtara mmadụ ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ajụjụ ahụ Nwanna Linck jụrụ m mere ka ọ gụwa m agụụ ijekwuru Jehova ozi.

Mụ na Josiah nwanne m nwoke mgbe m dị afọ iri na ụma

Anyị Jikeere Maka Mkpagbu

 N’afọ 1974, ọgba aghara ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpatara n’Etiopia mere ka a na-anwụchi ndị mmadụ, na-egbu ha, obi ekorokwa ọtụtụ ndị n’elu. Ka oge na-aga, anyị kwụsịrị ịga ozi ụlọ n’ụlọ, na-ezukọkwa maka ọmụmụ ihe n’obere ìgwè n’obere ìgwè. Papa m na mama m malitere ịkwadebe mụ na ụmụnne m ndị ọzọ maka mkpagbu nwere ike ịmalite. Ihe ndị Baịbụl kwuru nyeere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị mụtakwara na Jehova ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-ekwu ma a jụwa anyị ajụjụ banyere ihe anyị kweere, mụtakwa na e nwere oge ndị anyị kwesịrị ịgba nkịtị.​—Matiu 10:19; 27:12, 14.

AFP PHOTO

Mgbe e nwere ọgba aghara n’obodo n’afọ 1974

 Mgbe m gụchara akwụkwọ, m malitere ịrụ n’ọdụ ụgbọelu ndị Etiopia. Mgbe m bịara ọrụ n’otu ụtụtụ, ndị mụ na ha na-arụ ọrụ kelere m maka na a họọrọ m idu ndị ga-akwụ n’ahịrị na-agagharị n’oge gọọmenti na-eme otu ememme. M gara ozugbo gwa onyeisi anyị na agaghị m eso n’ememme ahụ, n’ihi na anaghị m etinye aka n’ihe gbasara ọchịchị maka na m bụ Onye Kraịst.

 N’echi ya, ka m nọ na-arụ ọrụ n’ọdụ ụgbọelu ahụ, m hụrụ ụfọdụ ụmụ nwoke bụ́ ndị amị n’ebe dịtụ anya, ka ha jicha égbè na-aga ebe a na-agba tiketi. M chere na ha na-aga ịnwụchi onye chọrọ isi n’obodo ahụ gbapụ. Ma, ha tụwara m aka. M nọ na-eche ihe mere ha ji na-atụ m aka? Otú ahụ ka ọrụ m bịara ụbọchị ahụ si ghọọrọ m nsogbu.

Jehova Nyeere M Aka n’Ụlọ Mkpọrọ

 Ndị amị ahụ kpọ m gaa n’otu ọfis ma na-agba m ajụjụ ruo ọtụtụ awa. Ajụjụ ụfọdụ ha jụrụ m bụ, “Ònye na-akwụ Ndịàmà Jehova ụgwọ?” “Ị̀ na-arụrụ òtù na-agba mbọ ka Eritria nwere onwe ya ọrụ? Gịnwa ma ọ bụ papa gị ùnu na-arụrụ ndị ọchịchị Amerịka ọrụ?” Ọ bụ eziokwu na ụdị ihe a na-amapụ obi, ma Jehova nyeere m aka obi eruo m ala.​—Ndị Filipaị 4:6,7.

 Mgbe ha gbachara m ajụjụ, ha bugara m n’otu ụlọ ha ji mere ụlọ mkpọrọ ma kpọba m n’otu obere ọnụ ụlọ. E nwere ihe dị ka ụmụ nwaanyị iri na ise nọbu ebe ahụ tupu mụnwa. Ihe mere e ji nwụchie ha bụ n’ihi ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Mgbe m na-arụ n’ọdụ ụgbọelu

 N’abalị ụbọchị ahụ, m yi uwe ọrụ m dinara n’ala nkịtị, na-eche otú obi ga-adị papa m na mama m na ụmụnne m. Ha ma na a nwụchiri m, ma ha amaghị ebe a kpọchiri m. M rịọrịọ Jehova ka o nyere ha aka ka ha mata ebe m nọ.

 Mgbe m tetara ụra n’ụtụtụ echi ya, m hụrụ na otu nwa okorobịa na-eche nche ebe ahụ bụ onye m ma. O juru ya anya ịhụ m ebe ahụ. Ọ jụrụ m, sị: “Aster, gịnị ka ị na-eme ebe a?” M rịọrọ ya ka ọ gaa gwa papa m na mama m ebe m nọ. Ka oge na-aga ụbọchị ahụ, papa m na mama m ziteere m nri na uwe. Ihe a gosiri na onye nche ahụ gwara ha ebe m nọ. Jehova zara ekpere m. Ihe a mere ka obi sie m ike na anọghị m naanị m.

 Amachiri m inwe Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla ọzọ, machiekwa ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m ịbịa leta m. N’agbanyeghị ya, Jehova si n’aka ndị mkpọrọ ibe m gbaa m ume. M na-ezi ha ozi ọma n’ụbọchị ọ bụla, eziokwu ndị ha na-amụta banyere Alaeze Chineke na-atọkwa ha ụtọ. Ha na-agwakarị m, sị: “Anyịnwa na-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ, ma gịnwa na-akwado ọchịchị Chineke. Akwụsịkwala ịkwado ya, ọ bụrụgodị na ha ekwuo na ha ga-egbu gị.”

 Mgbe ụfọdụ, ndị nche na-agba ndị mkpọrọ ajụjụ ma na-eti ha ihe. N’otu abalị, n’ihe dị ka n’elekere iri na otu, ha bịara kpụrụ m. Mgbe anyị ruru n’ọnụ ụlọ ha na-anọ agba ajụjụ ahụ, ha boro m ọtụtụ ebubo. Ha sịrị na anaghị m akwado ọchịchị. Mgbe m jụrụ ikwu okwu e ji akwado ọchịchị ha sịrị m kwuo, ụmụ nwoke abụọ n’ime ha tiri m ihe. Ha kpọ m gaa gbaa m ajụjụ ọtụtụ ugboro. Na nke ọ bụla n’ime ha, m na-arịọsi Jehova ike n’ekpere ka o nyere m aka, m na-ahụkwa na ọ na-enyere m aka.

 Mgbe ọnwa atọ gachara, otu n’ime ndị nche ahụ bịara gwa m na m nweziri ike ịlawa. Ihe a juru m anya, meekwa m obi ụtọ. Ma o wutetụkwara m n’ihi na ọ na-atọ m ụtọ izi ụmụ agbọghọ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ozi ọma Alaeze Chineke.

 Mgbe ọnwa ole na ole a tọhapụrụ m gachara, ndị amị bịara oge m na-anọghị n’ụlọ kpụrụ ndị niile nọ afọ iri na ụma n’ezinụlọ anyị. Ha kpụụrụ ụmụnne m ndị nwaanyị abụọ na otu nwanne m nwoke. Mgbe ihe a mere, m kpebiri na ọ ga-akara m mma isi n’obodo ahụ pụọ. Ọ bụ eziokwu na ọ nọ na-ewute m na ọ ga-eme ka m hapụ ndị ezinụlọ anyị ọzọ, ma mama m gbara m ume ka m nwee obi ike ma tụkwasị Jehova obi. O teghị aka, mụ abanye ụgbọelu gawa Amerịka. N’abalị otu ụbọchị ahụ, ndị amị bịara n’ụlọ anyị ka ha nwụchie m nke ugboro abụọ. Ma ebe ọ bụ na ha ahụghị m n’ụlọ mgbe ha bịara, ha chụụrụ m bịawa n’ọdụ ụgbọelu. Ma ụgbọelu m banyere apụọla tupu ha erute.

 Mgbe m rutere Meriland, Nwanna Haywood Ward na nwunye ya Joan, bụ́ ndị ozi ala ọzọ ahụ mụụrụ papa m na mama m ihe, bịara nabata m. Mgbe ọnwa ise gachara, m malitere ịsụ ụzọ oge niile, bụkwanụ ihe m bu n’obi ime kemgbe. Onye mụ na ya sụkọrọ ụzọ bụ nwa Nwanna Ward aha ya bụ Cyndi, anyị nwekwara ọtụtụ ihe tọrọ anyị ụtọ n’ozi anyị.

Mụ na Cyndi Ward, bụ́ onye mụ na ya sụkọrọ ụzọ

M Ji Oge M Niile Jeere Chineke Ozi na Betel

Mgbe mụ na di m na-eje ozi na Betel dị na Wọlkil dị na Niu Yọk

 N’afọ 1979, m gara leta Betel dị na Niu Yọk. Ọ bụkwa ebe ahụ ka m matara Wesley Parker. Àgwà ọma ya na ihe ndị o kpebiri ime n’ozi Jehova masịrị m. Mụ na Wesley lụrụ n’afọ 1981. Mụ na ya jekwara ozi Betel na Wọlkil dị na Niu Yọk. M rụrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Idebe Ụlọ Ọcha, rụọ n’ebe a na-asa ákwà, mechaakwa rụọ na Ngalaba Na-ahụ Maka Kọmpụta. N’ebe ahụ, m so ná ndị na-ahụ maka Ihe Na-eme Ka E Nwee Ike Ide Asụsụ Dị Iche Iche na Kọmputa. Ije ozi na Betel mere ka m jiri oge m niile jeere Jehova ozi, meekwa ka m mata ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị anyị na ha ka bụ enyi ruo taa.

 Ma a nọ na-akpagbu papa m na mama m na ụmụnne m n’Etiopia, ihe a nọkwa na-ewute m. Ụmụnne m atọ ahụ ndị amị bịara kpụrụ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ. b Mama m na-esi nri kwa ụbọchị ebugara ha n’ihi na a naghị enye ha nri n’ụlọ mkpọrọ ahụ.

 N’oge ahụ nsogbu zuru m ahụ́, Jehova bụụrụ m ebe mgbaba, ndị ezinụlọ Betel kasikwara m obi ma nyere m aka. (Mak 10:29, 30) E nwere ụbọchị Nwanna John Booth gwara m, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ị na-eje ozi na Betel ebe a. Ọ garaghị ekwe omume ma a sị na Jehova akwadoghị gị.” c Okwu ọma a ọ gwara m mere ka obi sie m ike na Jehova kwadoro mkpebi m mere ịkwapụ n’Etiopia nakwa na ọ ga-elekọta ndị ezinụlọ m.

Anyị Jekọrọ Ozi Jehova Ọnụ n’Ezinụlọ Anyị

 Na Jenụwarị afọ 1989, anyị matara na m dị ime. Ná mmalite, obi wụnyere anyị n’afọ. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gachara, anyị kwụsịrị ịtụ ụjọ ma malite inwe obi ụtọ. Ma anyị nọkwa na-eche ụdị nne na nna anyị ga-abụ, ebe anyị ga-ebi, nakwa ihe anyị ga na-arụ ma anyị hapụ Betel.

 N’abalị iri na ise n’onwa Eprel afọ 1989, anyị ji ụgbọala anyị buru ngwongwo anyị niile gawa Oregọn, bụ́ ebe anyị kpebiri ịnọ bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ma, obere oge anyị rutere ebe ahụ, ụfọdụ ndị enyi anyị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi gwara anyị na ọ ga-akara anyị mma ma anyị kwụsị ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị enwechaghị ego, anyị nọkwa na-atụ anya ịmụ nwa n’oge na-adịghị anya. Gịnịzi ka anyị ga-eme? N’oge ahụ, Nwanna Guy Pierce bụ́ onye nlekọta sekit anyị na nwunye ya bụ́ Penny bịara leta anyị. d Ha gbara anyị ume ka anyị ghara ịhapụ ihe anyị kpebiri ime n’ozi Jehova. N’ihi ya, anyị malitere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka. (Malakaị 3:10) Anyị ka bụ ndị ọsụ ụzọ mgbe anyị mụchara nwa mbụ anyị bụ́ Lemuel na nke abụọ bụ́ Jadon.

 Ịsụ ụzọ mgbe ụmụ anyị ka dị obere bụ ihe pụrụ iche mere ná ndụ anyị. Ebe anyị bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile, anyị nwere ohere ịkụziri ma ndị agbata obi anyị ma ụmụ anyị eziokwu Baịbụl. (Diuterọnọmi 11:19) Ma, mgbe anyị mụchara nwa anyị nke atọ bụ́ Japheth, ọ bịara dị mkpa ka anyị kwụsịtụ ozi oge niile.​—Maịka 6:8.

Anyị Kụziiri Ụmụ Anyị Ijere Jehova Ozi

 O doro anyị anya na ọrụ kacha mkpa anyị nwere bụ ime ka nwa anyị nke ọ bụla hụ Jehova n’anya ma nyere ha aka ime ka ha na ya dịrị n’ezigbo mma. N’ihi ya, anyị gbara mbọ mee ka ofufe ezinụlọ anyị na-atọ ha ụtọ, nke na ha na-achọ ka o ruwe eruwe. Mgbe ha ka dị ezigbo obere, anyị na ha na-agụkọ akwụkwọ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti na Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible ọnụ. Anyị na-ejidị ụfọdụ akụkọ ndị dị na ha eme ihe nkiri. Mgbe anyị mere ihe nkiri gbasara Jezibel, ọ bụ m bụ Jezibel maka na ọ bụ naanị m bụ nwaanyị n’ezinụlọ anyị. Ọ tọrọ ụmụ anyị nwoke atọ ụtọ mgbe ha mere ka hà si n’elu oche kwatuo m, meekwa ka hà bụ nkịta. E wezụga na anyị na-enwe ofufe ezinụlọ, di m na-amụkwara ụmụ anyị atọ Baịbụl otu otu.

 Anyị hụrụ ụmụ anyị n’anya, lekọtakwa ha nke ọma. Anyị kpekwara ekpere rịọ Jehova ka o mee ka anyị niile dịrị n’ezigbo mma n’ezinụlọ anyị. Ka ha na-eto, anyị na-akụziri ha otú e si arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ha na-asa efere, na-edebe ụlọ ha ọcha, na-asakwa efe ha. Ha mụtakwara otú e si esi nri.

 Ọ bụghị naanị ụmụ anyị mụtara ihe, anyịnwa mụrụ ha mụtakwara ihe. E nwere mgbe ụfọdụ anyị na-emejọ ha ma ọ bụ ibe anyị ma ọ bụkwanụ gwa ha ma ọ bụ ibe anyị okwu ọjọọ. Ọ dị otú ahụ, anyị na-ewetu onwe anyị ala rịọ mgbaghara.

 Ọtụtụ mgbe, anyị na-akpọ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ n’ọgbakọ anyị, ndị si Betel bịa ileta ọgbakọ anyị, ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ka ha bịa n’ụlọ anyị soro anyị rie nri. (Ndị Rom 12:13) Mgbe ọ bụla anyị nwere ụdị ndị ọbịa a, anyị anaghị agwa ụmụ anyị ka ha gaa gwuwe egwu. Anyị niile na-anọkọ akparịta ụka, ha ana-anụkwa ka onye ọ bụla na-akọ ihe ọma ndị merela n’ozi ya. Ọtụtụ mgbe, ụmụ anyị na-echeta ihe ndị e kwurịtara ụbọchị ahụ karịa mụ na papa ha.

 Mụ na di m gbara mbọ mee ihe ndị mere ka ozi anyị na-ejere Jehova na-atọ anyị ụtọ. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahazi ihe niile n’ezigbo oge, chekwaa ego, ma wepụta oge iji gaa ebe dị iche iche n’ụwa. Ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-aga elegharị anya n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’obodo ahụ, gaakwa ọmụmụ ihe na ozi ọma ebe ahụ. Ihe a emeela ka anyị jiri nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ kpọrọkwuo ihe, meekwa ka anyị dịkwuo ná mma n’ezinụlọ anyị.

Mgbe ezinụlọ anyị gara ilegharị anya n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin dị na Niu Yọk n’afọ 2013

Anyị Ji Obi Anyị Niile Nọgide Na-ejere Jehova Ozi

 Anyị chọpụtara na e nwere ọtụtụ ndị bi n’obodo anyị na-asụ asụsụ Spanish, ma a naghị ezi ha ozi ọma mgbe niile. N’ihi ya, ebe ọ bụ na ụmụ anyị ka dị obere, anyị jụrụ Nwanna Pierce ihe o chere banyere ezinụlọ anyị ịgafe n’ọgbakọ Spanish. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya asị, “Onye na-akụ azụ̀ na-aga ebe azụ̀ juru ọ ga-egbute ha.” Ihe a o kwuru gbara anyị ume, anyị agafee n’ọgbakọ Spanish dị na Woodburn, n’Oregọn. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị malitere ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl, ha ana-emekwa nke ọma. Obi dịkwa anyị ụtọ inyere ụfọdụ n’ime ha aka ha emee baptizim nakwa ịhụ ka obere ìgwè na-amụ ihe n’asụsụ Spanish ghọrọ ọgbakọ.

 Ka oge na-aga, a chụrụ di m n’ọrụ, anyị akwagazie Kalịfọnịa bụ́ ebe o nwetara ọrụ ọzọ. Mgbe afọ abụọ gachara, mụ na ụmụ anyị abụọ bụ́ Lemuel na Jadon malitere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. N’afọ 2007, obi bụ m sọ aṅụrị mgbe mụ na ha gakọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. Obere oge anyị gachara ụlọ akwụkwọ ahụ, anyị chọpụtara na e nwere ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ Arabik n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị anọọla afọ iri na atọ n’ọgbakọ Spanish, ezinụlọ anyị kpebiri ịgafe n’ọgbakọ Arabik. Kemgbe ahụ, obi dị anyị ụtọ na anyị na-ezi ndị na-asụ Arabik ozi ọma, ma ọtụtụ ndị nke bi n’obodo a ma ndị nke anyị na-ahụ ma anyị gaa mkpọsa pụrụ iche ná mba ọzọ. Anyị ka bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile n’ọgbakọ Arabik anyị nọ ugbu a na San Diego dị na Kalịfọnịa.

 Wesley di m bụ nnọọ ezigbo di na ezigbo onyeisi ezinụlọ. O jitụdịghị nzukọ Jehova egwu egwu. E nwetụbeghị mgbe o kwuru ihe na-adịghị mma banyere Betel ma ọ bụ banyere otú ihe si aga n’ọgbakọ. Kama, ọ na-ekwu ihe dị mma gbasara ha. Ọ na-ekpere m ekpere, mụ na ya na-ekpekọkwa ekpere. N’oge ndị nsogbu bịaara anyị, ekpere ya kasiri m obi, nyekwa aka mee ka obi ruo m ala.

 Obi na-atọ m ụtọ ma m cheta otú ndụ anyị si gaa. Anyị jere ozi oge niile, mụọ ụmụ, jeekwa ozi n’ọgbakọ ndị chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Anyị ahụla na Jehova na-agọzi ndị na-ebute ihe gbasara ya ụzọ ná ndụ ha, e nwetụbeghị mgbe ihe ọ bụla kọrọ anyị. (Abụ Ọma 37:25) Obi siri m ike na iji ndụ m jeere Jehova ozi bụ mkpebi kacha mma m mere ná ndụ m.​—Abụ Ọma 84:10.

Ezinụlọ anyị: Japheth bụ onye nke mbụ n’aka ekpe, Lemuel na-esote ya, mụnwa, Jadon, na Wesley

a Nwanna Linck jere ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kenya, bụ́ alaka ụlọ ọrụ nọ na-ekekọta ọrụ anyị n’Etiopia.

b A tọhapụrụ ụmụnne m n’ụlọ mkpọrọ mgbe afọ anọ gachara.

c Nwanna Booth so n’Òtù Na-achị Isi ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 1996.

d Nwanna Pierce mechara soro n’Òtù Na-achị Isi ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 2014.