Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IRMA BENTIVOGLI | AKỤKỌ NDỤ

M Jeere Onye Na-enye “Onyinye Ọ bụla Dị Mma” Ozi

M Jeere Onye Na-enye “Onyinye Ọ bụla Dị Mma” Ozi

 Anyị nụrụ otu nnukwu ụda e ji maa ọkwa na a ga-atụ bọmb n’obodo anyị. Mama m kuuru nwanne m nwoke nke obere, kpọrọkwa m anyị agbaga n’otu ubi dị nso ma zoo n’okpuru osisi. Adị m naanị afọ isii mgbe ahụ.

 Mgbe a tụchara bọmb ahụ, m sooro mama m gawa ịchọ otu ezigbo enyi ya. Obi gbawara anyị mgbe anyị matara na bọmb ahụ a tụrụ gburu ya. Mgbe a tụrụ bọmb ọzọ n’obodo ahụ abalị ole na ole a tụchara nke mbụ ahụ, papa m kuuru m kukwasị n’ihu ígwè ya ma gbara ígwè ahụ ọsọ ọsọ otú ike ya ha, anyị esi n’obodo ahụ gbapụ.

 Agha Ụwa nke Abụọ kpara mkpamkpa n’Ịtali, m ka na-echetakwa ihe niile mere n’oge ahụ. Ma ihe kacha nyere m aka ná ndụ bụ na ndị ma Jehova ma hụ ya n’anya gbara m gburugburu kemgbe m bụ nwata.

Otú Eziokwu Dị na Baịbụl Si Ruo M Aka

 N’oge oyi afọ 1936, ọnwa ole na ole tupu amụọ m, papa m na otu nwoke aha ya bụ Vincenzo Artusi rụkọrọ ọrụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. N’oge ahụ, Vincenzo abụbeghị Onyeàmà Jehova, ma o jighị eziokwu dị na Baịbụl egwu egwu. Ka papa m na Vincenzo na-ekpopụ snoo n’ụzọ okporo ígwè, ọ na-akọrọ papa m ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl.

 Papa m chọpụtara ozugbo na ihe ọ na-akọrọ ya bụ eziokwu. Ya na mmadụ ole na ole ọzọ n’obodo anyị bụ́ Faenza chọkwara ịmụtakwu ihe. Ma n’oge ahụ, Ndịàmà Jehova anaghị ezukọta amụ Baịbụl n’ihi na ndị ọchịchị aka ike na-akpagbu ha, e nwekwara ike ịnwụchi onye ọ bụla a hụrụ ji akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. A tụdịrị ụfọdụ Ndịàmà mkpọrọ n’oge ahụ. N’ihi ya, papa m na ndị enyi ya na-ezukọ n’ụlọ ndị dịpụrụ adịpụ n’ime ime obodo ka ha gụọ Baịbụl ma mụọ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ha nwere. N’izu ọ bụla, papa m na-akpọkọtakwa mmadụ niile nọ n’ezinụlọ anyị ka anyị jiri otu mgbede mụọ Baịbụl.

Ndị M Mụtara Ihe n’Aka Ha

 N’afọ 1943, a hapụrụ ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọro maka na ha na-efe Chineke. Otu n’ime ha bụ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Maria Pizzato. Mgbe Maria si n’ụlọ mkpọrọ na-ala n’ụlọ ya dị n’ebe ugwu Ịtali, ọ nọrọ otu abalị n’ụlọ anyị. O so ná ndị gbara mbọ hụ na ụmụnna anyị nọ na-enweta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-enwetakwa ozi si n’aka alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Swizaland, bụ́ ndị na-elekọta ọrụ anyị na-arụ n’Ịtali n’oge ahụ. Ị na-ele Maria anya, o yiri onye na-esighị ike, ma o siri ezigbo ike, ọ naghịkwa atụ egwu. Mgbe agha biri, ọ na-abịa Faenza oge ụfọdụ, obi na-atọkwa anyị ezigbo ụtọ ma ọ bịa.

 Nwanna nwaanyị ọzọ obi na-atọ m ụtọ ma m cheta ya bụ Albina Cuminetti. Mgbe m ka na-eto eto, ọ bụ nwaanyị isi mkpe merela agadi, o bikwa n’ụlọ anyị na-anọ amụ ihe. Ọ bụ onye kọpọtụa (ya bụ, onye na-ekwusa ozi ọma oge niile) n’Ịtali n’agbata afọ 1920 ruo 1925. Albina kọọrọ m ọtụtụ akụkọ na-atọ ụtọ banyere ikwusa ozi ọma n’oge ahụ.

 Albina nwere ọtụtụ akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl nakwa ihe ndị mgbe ochie ndị ọzọ. Otu ụbọchị, m hụrụ obe na okpueze Ndị Mmụta Baịbụl (bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ) na-etinyebu n’uwe ha. Obe ahụ m hụrụ tụrụ m n’anya mụ achịakwa ọchị n’ihi na ama m na ọ bụ ihe ndị na-ekpere arụsị. Albina gwaziri m ihe m na-agaghị echefu echefu. O kwuru ihe dị na Zekaraya 4:10. Ọ sịrị: “Eledakwala ụbọchị ihe ji nke nta nke nta malite anya.”

Mgbe m dị afọ iri na anọ

 Amụtara m nnukwu ihe n’ihe ahụ ọ gwara m. N’agbanyeghị na Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ aghọtachaghị eziokwu ndị dị na Baịbụl nke ọma, m kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. Ihe ọzọ bụ na o wetụrụ ụfọdụ ụmụnna anyị oge tupu ha amụta otú nzukọ Jehova si kọwaa ihe ụfọdụ, n’ihi na e nweghị akwụkwọ anyị niile n’asụsụ Ịtalian. N’agbanyeghị ihe a niile, Jehova ji mbọ ha gbara n’ozi ya kpọrọ ihe, mụnwa kwesịkwara iji ya kpọrọ ihe.

 Mụ na Albina ikwurịta okwu na-atọ m ụtọ n’agbanyeghị na o ji ọtụtụ afọ tọọ m. M na-agba mbọ ime ka ya na Maria na ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ, ndị ji obi ha niile fee Jehova ma na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ya n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ha. Obi dị m ụtọ na mụ na ha mekọrọ ihe.

Ije Ozi na Betel

 N’oge ọkọchị afọ 1955, m gara mgbakọ “Alaeze nke Na-enwe Mmeri” na Rom. Mụ na ndị ọzọ si mba dị iche iche bịa mgbakọ ahụ gakwara Betel. M nọkwa na-agwa onwe m, sị: ‘Ije ozi ebe a ga-atọgbu onwe ya.’

 M mere baptizim n’abalị 18 n’ọnwa Disemba afọ 1955. N’agbanyeghị na m ka na-aga akwụkwọ n’oge ahụ, m kpebiri na m ga-amalite ije ozi oge niile. Ná mgbakọ e nwere na Jenoa n’afọ 1956, anụrụ m ka a mara ọkwa na a chọrọ ndị ga-ewepụta onwe ha ije ozi na Betel. Ma, onye na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ ná mgbakọ ahụ kwuru na a chọghị ụmụnna nwaanyị.

 M mechara gwa onye nlekọta sekit anyị bụ́ Nwanna Piero Gatti a ihe ndị m chọrọ ime n’ozi Jehova. Nwanna Gatti na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ọ sịrị m: “M ga-atụrụ alaka ụlọ ọrụ aro ka ị bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche.”

 Ka oge na-aga, alaka ụlọ ọrụ ziteere m akwụkwọ ozi. M chere na akwụkwọ ozi ahụ bụ iji gwa m ka m bụrụ ọsụ ụzọ, ma ọ bụghị ya. E ji ya gwa m ka m dejupụta akwụkwọ maka ije ozi na Betel.

Mụ na Ilaria Castiglioni (ọ kwụ ọtọ), onye mụ na ya rụkọrọ ọrụ nsụgharị na Betel n’afọ 1959

 M gara Betel na Jenụwarị afọ 1958. N’oge ahụ, ndị na-eje ozi na Betel akarịghị mmadụ iri na abụọ. Ọrụ e nyere m bụ inyere ụmụnna abụọ na-asụgharị ihe n’alaka ụlọ ọrụ anyị aka. Ihe a ga-asụgharị karịrị akarị, amaghịkwanụ m ihe ọ bụla gbasara nsụgharị. Ma, Jehova nyeere m aka, ọrụ ahụ emechaa tọwa m ụtọ.

 Mgbe otu afọ na ọnwa asatọ gachara, a hazigharịrị otú e si asụgharị ihe, gwazie m ka m gaa bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ihe a tụrụ m n’anya maka na m chere na m ga-anọrọwazi na Betel. Ma ka oge na-aga, m mechara were ọrụ ahụ e nyere m ka onyinye si n’aka Jehova.

Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi Mụ na Ha Kwusakọrọ Ozi Ọma

 M malitere ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba afọ 1959 n’obodo Kremona. Onye mụ na ya sụkọrọ ụzọ bụ Doris Meyer, o si Denmak bịa. Ọ bụ naanị afọ ole na ole ka o ji tọ m, ma ọ rụọla ọrụ ọsụ ụzọ ọtụtụ afọ, m na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù. Doris na-ama ihe o kwesịrị ime n’oge ọ bụla, ọ na-akata obi, ọ naghịkwa atụ egwu. Àgwà ndị a bụkwanụ àgwà anyị abụọ kwesịrị inwe iji na-ekwusa ozi ọma ebe ahụ e zigara anyị n’ihi na ọ bụ naanị anyị abụọ bụ Ndịàmà Jehova n’obodo ahụ.

Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka Doris (ọ nọ n’aka ekpe) na Brunilde (ọ nọ n’aka nri), ndị mụ na ha sụkọrọ ụzọ na Kremona

 Doris bu m ụzọ bịa Kremona, ọ haziekwala ka a na-amụ ihe n’otu ụlọ a na-akwụ ụgwọ ya tupu mụ abịa. Ndị ụkọchukwu chọọchị Katọlik chọpụtara ozugbo na anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-enwe ọmụmụ ihe n’obodo ahụ, ha wekwara ezigbo iwe. Ha maliteziri ịgwa ndị òtù ha ka ha ghara ịna-ege anyị ntị.

 Otu ụbọchị, a gwara anyị ka anyị bịa n’otu ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Mgbe anyị gara, ndị uwe ojii ahụ ejichighị anyị, ma ha gwara anyị hoo haa na Doris ga-esirịrị Kremona pụọ maka na ọ bụghị onye obodo ahụ. O mechara laghachi Denmak, jirikwa obi ya niile na-ejere Jehova ozi ebe ahụ.

 N’oge na-adịghị anya, e zitere nwanna nwaanyị ọzọ na-alụbeghị di na Kremona. Aha ya bụ Brunilde Marchi. Àgwà Brunilde magburu onwe ya, obi ruru ya ala, o jighịkwa ozi ọma egwu egwu. Anyị malitere ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl, ụfọdụ n’ime ha nọkwa na-eme nke ọma.

 M na-ekele Jehova na m so ná ndị malitere ikwusa ozi ọma na Kremona. E nwere ọgbakọ ise n’obodo ahụ taa.

Ozi Na-enye Obi Ụtọ

 Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ abụọ m bịara Kremona, alaka ụlọ ọrụ kpọrọ m na telefon. E nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ịsụgharị maka mgbakọ abalị isii a ga-enwe n’ọnwa Julaị afọ 1961. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Ndị Dị n’Otu n’Ofufe.” N’ihi ya, ha kpọrọ m ka m bịaghachi Betel. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ nke na m nọ na-awuli elu na-aṅụrị ọṅụ. Alaghachiri m Betel n’abalị mbụ n’ọnwa Febụwarị afọ 1961.

 Anyị rụrụ ọrụ ọtụtụ awa kwa ụbochị, ma obi dị m ụtọ na m na-arụsi ọrụ ike kwa ụbọchị iji nye aka na-ewepụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. O teghị aka oge mgbakọ ahụ eruo.

 Ná mgbakọ ahụ, anụrụ m ka a mara ọkwa na a ga-asụgharị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Ịtalian. M gwara onwe m, sị: ‘Ihe a pụtara na e nwere nnukwu ọrụ anyị ga-arụ.’ Ọ bụkwa ihe mechara mee. A gbatịkwuru oge m ga-anọ na Betel. M ka nọkwa ebe ahụ ruo taa kemgbe ihe karịrị afọ iri isii.

Mgbe m na-arụ na Ngalaba Nsụgharị n’afọ 1965

Onyinye Ndị Ọzọ Magburu Onwe Ha Jehova Nyere M

 Ihe ọzọ na-eme m obi ụtọ m weere ka onyinye bụ na alụghị m di. Ọ bụghị maka na ịlụ di abatatụbeghị m n’obi. E nwedịrị mgbe m nọ na-echegbu onwe m maka na alụbeghị m di. M gwara Jehova otú obi dị m n’ekpere. Ọ ma m nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. Arịọrọ m ya ka o nyere m aka ịmata ihe kacha mma m kwesịrị ime.

 Amaokwu ndị dị ka Matiu 19:11, 12 na 1 Ndị Kọrịnt 7:8, 38 nyeere m aka pụrụ iche. M na-ekelekwa Jehova maka ime ka m ghọta ha nke ọma nakwa maka otú o si mee ka obi ruo m ala. E nwetụbeghị mgbe m kwara ụta maka ihe ndị m kpebiri ime, obi dịkwa m ụtọ na m nyere Jehova ihe kacha mma m nwere n’oge a niile m mọ na-alụghị di.

 N’afọ ndị a niile, ahụla m ka a gbanwere ọtụtụ ihe na Ngalaba Nsụgharị maka na nzukọ Jehova na-ejizi ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ na “akụ̀ mba dị iche iche” arụ ọrụ. (Aịzaya 60:5) Ihe ndị ahụ niile a gbanwere na-eme ka anyị na ụmụnna n’ụwa niile dịkwuo n’otu. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1985, a malitere ibipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Ịtalian n’otu oge ahụ a na-ebipụta nke Bekee. Taa, e nwere isiokwu na vidio dị iche iche n’ọtụtụ asụsụ na jw.org, ọtụtụ n’ime ha na-agbakwa n’otu oge ahụ nke Bekee gbara. O doro anya na Jehova na-eme ka ndị ya dịrị n’otu ma na-enweta ihe ndị e ji akụziri ha Okwu Chineke n’oge kwesịrị ekwesị.

 Jehova emeerela m ọtụtụ ihe. O kwere ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche ma mee ka m nyere ndị mmadụ aka ka ha na ya dị ná mma. O mere ka m bịa jewe ozi na Betel, nke bụ́ ihe gụsiri m agụụ ike. M metekwara ndị si ebe dị iche iche enyi, ma ndị tọrọ m ma ndị m tọrọ. Ihe ọma ọzọ pụrụ iche meere m bụ na m dị ndụ hụ ka mama m mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri isii na asatọ. Ana m atụsi anya ike ịhụ ya na ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nọ n’ili.​—Jọn 5:28, 29.

 Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ ihe Jehova ga-emere ndị na-ejere ya ozi n’ọdịnihu, mgbe ọ ga-eme “ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Obi siri m ike na Jehova agaghị akwụsị inye anyị “onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.”​—Jems 1:17.

Ebe m na-arụ ọrụ taa na Ngalaba Nsụgharị