Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TERRY REYNOLDS | AKỤKỌ NDỤ

Jehova Nyeere M Aka Ka M Nye Ya Ihe Kacha Mma M Nwere

Jehova Nyeere M Aka Ka M Nye Ya Ihe Kacha Mma M Nwere

 Mgbe m dị afọ iri na anọ, otu nwanna nwoke nọrọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ nyere m Baịbụl ya. Aha nwanna ahụ bụ Cecil. Baịbụl ahụ bụ Baịbụl ọ na-eji amụ ihe, e nwekwara ihe ndị o ji aka ya denye na ya. M weere Baịbụl ahụ ka nnukwute onyinye.

 Nwanna nwoke Cecil dị umeala n’obi, na-echekwa banyere ndị ọzọ. Àgwà nwanna a na nke mama m nakwa nke ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova, mere ka m “nwee mmasị ime ihe,” ya bụ, inye Jehova ihe kacha mma m nwere. (Ndị Filipaị 2:13) Ka m kọọrọ unu akụkọ ndụ m.

Otú Mama M Si Anụ Ọkụ n’Obi Nyeere M Aka

 A mụrụ m n’afọ 1943. Ndị mụrụ m bi n’ugbo dị nso na Bundaberg. Obodo a dị n’ebe a na-akọ shuga ken na Kwinsland dị n’Ọstrelia. Ndị obodo a na-agakarị n’ebe mepere emepe n’obodo ha ná mgbede Satọdee ọ bụla ka ha na ibe ha nọrịa. Mgbe ndị mụrụ m gara ụdị ihe a n’otu Satọdee n’afọ 1939, ha hụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile abụọ (ya bụ, Ndịàmà Jehova ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile). Ha na ha kwuru banyere Baịbụl. Ihe ndị mụrụ m mụtara n’aka ha masịrị ha. Ka oge na-aga, ha ghọrọ Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, mụ na nwanne m nwaanyị, bụ Jean, toro n’ezinụlọ Ndị Kraịst. Ma, ọ dị nwute na papa m nwụrụ mgbe o si na steepụ daa. Adị m naanị afọ asaa mgbe ahụ, ọnwụ ya kpakwara m aka. Ma, m ka na-echeta na ọ bụ nwoke na-arụsi ọrụ ike, na-emekwa ihe ọchị. M na-atụsi anya ike ịhụ mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, mụ amatakwuo ya nke ọma.​—Ọrụ Ndịozi 24:15.

 Mama m dị obiọma, na-echebakwara mmadụ echiche. Ọ na-ahapụ mụ na nwanne m nwaanyị ka anyị kwuo uche anyị. Ma, a bịa n’ihe gbasra ihe Baịbụl kwuru nakwa ife Jehova, mama m na-akwụsi ike n’ihe Baịbụl kwuru. Anyị na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya. Mama anyị gwakwara mụ na nwanne m ka anyị na ụmụaka ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ghara ịna-akpachi anya ma anyị gbasaa akwụkwọ. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) M cheta ihe ndị ahụ ọ kụziiri anyị ugbu a, obi na-adị m ezigbo ụtọ na mama m kwụsiri ike n’ihe Baịbụl kwuru.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ 14

 Mama m na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, mgbe ụfọdụ, ọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge ozuzu ike (A na-akpọzi ya ọsụ ụzọ inyeaka). M chetara na ọ ga-aga n’ihe karịrị ụlọ iri ise ka o nye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! Mgbe o medịrị agadi, ọ ka na-agụsi ya agụụ ike inyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, karịchaa anyịnwa bụ́ ụmụ ya. N’ihi ya, anyị hụkwara ya n’anya, na-agbakwa mbọ ịna-eme ka ya. N’afọ 1958, mgbe m dị afọ 14, m nyefere Jehova onwe m, meekwa baptizim.

Ezigbo Ndị Enyi Gbara M Ume

 Mgbe obere oge gara, otu nwanna nwoke aha ya bụ Rudolf, onye nọkwa n’ọgbakọ anyị, mere baptizim. Ọ dị ihe dị ka afọ 20. O si Jamanị kwata. Oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-anọ n’ụgbọala na-eche ndị ezinụlọ ha na-azụ ihe. N’ihi ya, mụ na Rudolf na-aga ezi ndị ahụ nọ n’ụgbọala ozi ọma kwa ụtụtụ Satọdee.

 Rudolf bụ nwanna na-anụ ọkụ n’obi, ọ gbakwara m ume ka m soro ya sụwa ụzọ ma ụlọ akwụkwọ mechie. Otu oge m mere otú ahụ, mụ na ya nọrọ izu isii na Gladstone, nke dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri itoolu ma e si ebe ndịda Bundaberg gawa ya. Otú nwanna a si gbalịa inyere m aka ka m̀ bụ nwanne ya nakwa obi ụtọ m na-enwe n’ozi ọma mere ka ịbụ ọsụ ụzọ oge niile gụwa m agụụ. Mgbe m dị afọ 16, m malitere ịsụ ụzọ oge niile, kpebiekwa na ọ bụ ihe m ga-eji ndụ m eme.

 Ebe mbụ m sụrụ ụzọ bụ na Mackay, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Bundaberg. Ọ dịghịkwa anya n’ebe a na-akpọ Great Barrier Reef. Ka ihe dị ka otu afọ gara, mgbe m dị afọ 17, a họpụtara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche a n’ime ime obodo ndị dị n’Ọstrelia, ebe ọtụtụ ndị na-ebighị. Ọ bụ mụ na Bennett (Ben) Brickell sụkọrọ ụzọ ebe ahụ. Ọ bụ onye e tere mmanụ, o jikwa ihe karịrị afọ 30 tọọ m. b Ọ bụ ihe ọma ka Jehova meere m kwe ka mụ na ọsụ ụzọ a bụ́ aka ochie rụkọọ ọrụ. Ọ bụkwa ọsụ ụzọ ọtụtụ ndị ji ama atụ.

Ebe m na-ezi otu nwaanyị Ọstrelia ozi ọma n’ime ime obodo ahụ n’afọ 1963

 Ebe anyị na-aga ozi ọma na Kwinsland bụ n’obodo ndị dị n’ikpere mmiri, ha dị n’ókè ikpere mmiri Carpentaria na obodo ọzọ. N’oge ahụ, ọ bụ naanị mụ na nwanna Ben bụ Ndiàmà Jehova nọ n’ebe ahụ ọtụtụ ndị na-ebighị. Oge ụfọdụ, ọ na-ewe anyị ọtụtụ awa iji ụgbọala si n’otu ụlọ gaa n’ụlọ ọzọ. Anyị kwọrọ ụgbọala na-aga ogologo njem ndị ahụ, Nwanna Ben na-akọrọ m otú ozi ya sibu na-aga. Otu n’ime ihe ndị ọ kọọrọ m bụ otú o si jiri ụgbọala ndị a rụnyere ígwè okwu c kwusaa ozi ọma mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe a machiri ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’Ọstrelia.

Ebe mụ (n’etiti) na otu nwanna nwoke (n’aka nri) na-amụrụ mmadụ Baịbụl n’ime ime obodo ahụ

 Anyị zichaa ozi ọma n’ụbọchị, anyị na-ama ụlọikwuu anyị n’akụkụ ụzọ, ebe anyị ga-ehi. d Anyị na-akpata nkụ, kwanyekwa ọkụ iji sie ihe anyị ga-eri. Ihe m ji ehi ụra bụ wọtapruf m tụrụ n’ala, blanket, na otu pilo. M ka na-echeta otú obi na-adị m ma m na-ele kpakpando ndị juru n’ígwé, ndị m na-ahụ nke ọma maka na ọkụ eletrik adịghị ebe ahụ. Kpakpando ndị ahụ na-echetara m otú Jehova si dị ebube.

 Ụgbọala imebi n’ebe a dịpụrụ adịpụ bụ nnukwu nsogbu. E nwere mgbe ihe a na-akpọ axle gbajiri n’ụgbọala anyị. Okpomọkụ dị n’oge ahụ, anyị enweghịkwa mmiri ga-ezuru anyị. Nwanna Ben sooro ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ gawa Cloncurry ka ọ zụta axle ọhụrụ. M nọ n’ụgbọala anyị na-eche ya ruo ihe dị ka ụbọchị atọ. Ọ bụ naanị ụgbọala ole na ole na-agafe kwa ụbọchị, ndị kwọkwa ha meere m ebere nyetụ m mmiri. Otu nwoke nyekwara m otu akwụkwọ dọkasịrị adọkasị. Ọ sịrị m, “Nnaa, gụọ ya. O nwere ike inyere gị aka.” Ọ tụrụ m n’anya na akwụkwọ ahụ kwuru banyere Ndịàmà Jehova a tara ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi, ọ bụghịkwa Ndịàmà Jehova dere akwụkwọ ahụ.

 Mụ na Ben rụkọrọ ọrụ ọsụ ụzọ ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu afọ. Ihe ikpeazụ ọ gwara m mgbe ikpeazụ mụ na ya hụrụ bụ, “Nwanna m, jidesie okwukwe gị ike.” Otú Ben si jiri obi ya niile na-efe Jehova ma na-anụ ọkụ n’obi mere ka m kpebisie ike ịnọ n’ozi oge niile.

M Gara Gilied, Gawazie Taịwan

 Ka m sụrụ ụzọ ọtụtụ afọ n’ime ime obodo ndị ahụ, a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit. Ihe a pụtara na m ga na-aga eleta ọgbakọ na ìgwè nọ n’ebe ọgbakọ na-adịghị na sekit ahụ, mụ na ha anọọ ihe dị ka otu izu. M lekọtara sekit anọ. Ụfọdụ n’ime ọgbakọ ndị m nlekọtara dị na Kwinsland nakwa na Niu Saụt Wels. N’afọ 1971, a kpọrọ m ka m gaa klas nke 51 n’ụlọ akwụkwọ Gilied. Atụghị m anya ya. Ụlọ akwụkwọ a bụ ebe Ndịàmà Jehova na-azụ ndị ozi ala ọzọ. Ọ dị n’Amerịka. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, m ji ọnwa ise mụọ Baịbụl nke ọma, mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m na ndị kụziiri anyị ihe kparịtakwara nke ọma. Ihe ndị a nyeere m aka ịdị njikere ịrụ ọrụ ọhụrụ e nyeziri m, ya bụ, ịbụ onye ozi ala ọzọ na Taịwan.

Klas anyị na Gilied

 E zigara mmadụ itoolu na klas anyị Taịwan. Ian Brown onye si Niu Ziland so na ha. Ọ bụ mụ na ya ka e zigara otu ebe. E nweghị ihe ọ bụla anyị ma gbasara Taịwan. Anyị amaghịdị ebe ọ dị ruo mgbe anyị chọrọ ya na map.

 E nweghịdị otú Taịwan na Kwinsland si yie. Nsogbu mbụ anyị nwere bụ ịsụ asụsụ Chaịniiz. Ruo oge ụfọdụ, anaghị m aghọta ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe, bụkwanụ ebe anyị si amụta ihe ndị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Mụ na ụmụnna m enweghịkwa ike ịna-ekwurịta okwu nke ọma. Ihe a mere ka mụ na Ian ghọta ihe mere e ji kụziere anyị ọtụtụ ihe na Gilied. Ihe ndị ahụ a kụziiri anyị na ịmụchi Baịbụl anya na ikpe ekpere mere ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma. N’agbanyeghị na anyị na ụmụnna ndị ebe ahụ anaghị ekwurịta okwu nke ọma, otú ha si hụ anyị na Jehova n’anya gbara anyị ezigbo ume.

Ịmụta Asụsụ Chaịniiz

 Mgbe anyị rutere Taịwan, a kụzitụụrụ ndị ozi ala ọzọ niile e zitere ebe ahụ asụsụ Chaịniiz. Ọ bụ nwanna nwaanyị si Ọstrelia aha ya bụ Kathleen Logan e kụziiri anyị ya. Ọ gara klas nke 25 n’ụlọ akwụkwọ Gilied. Anyị tinyere obi anyị niile n’ịmụ asụsụ ahụ. Anyị bidokwara na-asụ ya ozugbo otú a gwara anyị. Ụbọchị mbụ mụ na Ian gara ozi ọma, anyị butere ihe anyị ga-ekwu n’isi. Mgbe anyị nọ n’ụzọ na-aga, anyị kpara banyere onye ga-ebu ụzọ zie ozi ọma. Ebe ọ bụ m tọrọ Ian, m ji egwuregwu gwa ya na ọ bụ ya ga-ebu ụzọ zie ozi ọma. Onye anyị gara izi ozi ọma bụ nwoke Chaịniiz dị nnọọ ọgọ n’anya. O weturu obi gee Ian ntị ka o ji Chaịniiz na Bekee gwa ya okwu. Ma, o juziri anyị anya mgbe nwoke ahụ ji Bekee jụọ anyị ihe anyị chọrọ. Anyị na ya kparịtara, mgbe anyị kwuchara, ọ gbara anyị ume ka anyi jisie ike na-amụ Chaịniiz. Ihe ọ gwara anyị mere ka obi sie anyị ike “ijisi okwukwe anyị ike” otú ahụ Ben na-ekwukarị.

 Ebe e kenyere anyị ikwusa ozi ọma buru ibu. Ọ bụ otu mpaghara n’isi obodo Taịwan bụ́ Taipei. E zibeghị ozi ọma n’ebe a mbụ maka na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova ole na ole bi na ya n’oge ahụ. Mụ na Ian adaghị mbà, kama anyị ji ịnụ ọkụ n’obi malite izi ozi ọma. Anyị na-enye ndị mmadụ ọtụtụ narị magazin n’otu ọnwa. Ma nke bụ eziokwu bụ na ụfọdụ na-anara anyị magazin ndị ahụ naanị ka ha wee mata ndị anyị bụ na ihe anyị chọrọ ịgwa ha. Ma, anyị gbara mbọ na-agha mkpụrụ Alaeze Chineke, buru n’obi na ọ ga-amị mkpụrụ n’obi ndị chọrọ ife Chineke.

Otú Nwunye M Si Nyere M Aka

Ebe mụ na Wen-hwa nọ n’ozi ọma n’afọ 1974

 N’oge ahụ, mụ na nwanna nwaanyị onye Taịwan aha ya bụ Wen-hwa ghọrọ enyi. Ọ hụrụ eziokwu Baịbụl n’anya, chọọkwa inyere ndị obodo ahụ aka ka ha rite uru n’eziokwu ahụ otú yanwa ritere. N’ihi ya, o nyeere ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ aka ịmụta Chaịniiz, ma mụnwa. M bịara hụwa nwanna nwaanyị a n’anya, anyị lụkwara n’afọ 1974.

 Wen-hwa nyeere ndị ozi ala ọzọ aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, o nyeere anyị aka ịghọta omenala ndị Taịwan na otú ha si eche echiche. O nyekwaara anyị aka ịma otú anyị ga-esi zie ozi ọma otú ọ ga-eru ndị ebe ahụ n’obi n’ihi na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Buda na ndị Tao. Ndị ebe ahụ na-efe ndị nna ochie ha, ọtụtụ n’ime ha agụtụbeghịkwa Baịbụl ma ọ bụdị hụ ya anya. N’ihi ya, ihe anyị na-ekwukarị bụ gbasara Onye kere ihe niile, na aha ya bụ́ Jehova, nakwa ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ọ dị adị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ọrụ ugbo ma ọ bụ onye na-akụ azụ̀ ekwuo na “ọ bụ n’eluigwe ka nri ga-esi abịa,” anyị ga-ajụzi ya, sị: “Ònye na-eme ka nri dị? Ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ Chineke onye kacha ike, onye anyị kwesịkwara ife ofufe?”

Mụ na Wen-hwa n’afọ 1975

 Ka oge na-aga, Jehova gọziri mbọ anyị na-agba. Mkpụrụ nke eziokwu malitere ito n’obi ndị chọrọ ife Chineke. Ụfọdụ n’ime ndị anyị na-amụrụ Baịbụl kwụsịrị ikwere ihe ndị na-abụghị eziokwu ha kwenyeburu kemgbe ọtụtụ afọ, kwụsịkwa ime omenala ndị na-adịghị Jehova mma. Ndị ozi ala ọzọ na ụmụnna ndị ọzọ nyeere ha aka ha emewe nke ọma, ndụ ha akakwa mma. (Jọn 8:32) E mechara họpụta ọtụtụ ụmụnna ndị nwoke n’ime ha ka ha bụrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ, ụfọdụ malitekwara ije ozi oge niile, jekwaa ozi na Betel.

 Malite n’afọ 1976, m so na Kọmitii Alaka Taịwan ma ka bụrụkwa onye ozi ala ọzọ. N’afọ 1981, a kpọrọ mụ na Wen-hwa ka anyị jewe ozi na Betel. M ka sokwa na Kọmitii Alaka kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ karịala afọ iri isii m malitere ozi oge niile. Ọ bụ na Taịwan ka m jere ozi ihe karịrị afọ iri ise n’ime ya. Mụ na nwunye m ebiekwala ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise. Ian Brown, bú enyi m na onye mụ na ya jekọrọ ozi, nọkwa ebe a na-eje ozi oge niile ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2013.

Ebe m nọ n’ọru n’ọfis m na Taịwan n’afọ 1997

 Mụ na Wen-hwa na-agba mbọ ịna-arụsi ọrụ anyị ike na Betel, n’ọgbakọ anyị ji Chaịniiz amụ ihe, nakwa n’ozi ọma. Anyị na-ekele Jehova maka ihe ndị a anyị na-eme. O mere ka m nwee mmasị ife ya, nyekwa m ike iji obi m niile jeere ya ozi mgbe m bụ nwata. Ọ ka na-emekwara mụ na Wen-hwa otú ahụ ugbu a anyị merela agadi.

a Ọsụ ụzọ pụrụ iche bụ onye na-ekwusa ozi ọma mgbe niile, onye wepụtara onwe ya ịga ebe ọ bụla alaka ụlọ orụ Ndịàmà Jehova kpebiri na a chọrọ ndị ga na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl.

b Akụkọ ndụ Bennett Brickell dị n’Ụlọ Nche September 1, 1972.

c A na-eji ụgbọala ndị a rụnyere ígwè okwu akpọnye ozi ọma Alaeze Chineke ka ndị nọ n’ebe dị anya na-anụ ya.

d Lee vidio bụ́ Ikwusa Ozi Ọma n’Ime Ime Obodo Ndị Dị n’Ọstrelia ka ị hụ otú ụmụnna anyị si ekwusa ozi ọma n’obodo ndị dị n’akụkụ Oké Osimiri Mediterenian.

e Akụkọ ndụ Harvey na Kathleen Logan dị n’Ụlọ Nche Jenụwarị 2021.