Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka

Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka

FEBỤWARỊ 1, 2021

 E nwere ọtụtụ ọdachi ndị na-emere onwe ha mere n’afọ 2020. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka ọrịa koronavaịrọs malitere kpawa ike n’ụwa niile. Olee otú Ndịàmà Jehova sirila gbatara ndị ọdachi ndị a metụtara ọsọ enyemaka?

 N’afọ ije ozi 2020, a Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ kwadoro ka e jiri nde dọla iri abụọ na asatọ b gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. E nwere ihe karịrị narị ọdachi abụọ kpara ndị mmadụ aka. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọrịa koronavaịrọs, oké ifufe e nwere n’ebe dị iche iche, idei mmiri mere n’Afrịka, ụkọ nri e nwere na Venezuela, nakwa oké ọkọchị e nwere na Zimbabwe. E si n’ego ahụ a mawapụtara zụta nri, mmiri, uwe, ihe ndị e ji ehicha ihe, na ọgwụ e bugaara ndị ahụ ọdachi dakwasịrị. A rụzikwara ụlọ ndị ọdachi ndị ahụ mebiri, lekọtakwa ndị ahụ́ na-adịghị. Lee ụzọ ụfọdụ e si gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka.

 Ọrịa Koronavaịrọs. Ọrịa a kpataara ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile ọtụtụ nsogbu. Iji nyere ha aka, e hiwere Kọmitii Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka karịrị narị asatọ (800) n’ụwa niile. Kọmitii ndị a na-achọpụta otú ihe si dịrị ụmụnna anyị ma gwa Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ, ka kọmitii ahụ mara otú kacha mma a ga-esi gbatara ụmụnna ndị ahụ ọsọ enyemaka.

 N’afọ ije ozi 2020 niile, kọmitii ndị ahụ na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka nyeere ọtụtụ ndị aka inweta nri, mmiri, ihe ndị e ji ehicha ihe, na ọgwụ. N’ebe ụfọdụ, kọmitii ndị ahụ na ndị okenye ọgbakọ rụkọrọ ọrụ iji nyere ụmụnna aka inweta ihe enyemaka gọọmentị na-eke.

 Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova achọpụtakwala otú anyị si agbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka. Dị ka ihe atụ, Field Simwinga, bụ́ kọmishọna kachanụ e nwere n’obodo Nakonde dị na Zambia, gwara ụmụnna anyị, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka otú unu si bịa ngwa ngwa gbatara ezinụlọ dị iche iche ọdachi a metụtara ọsọ enyemaka.”

 Ụkọ Nri E Nwere n’Angola. Ọrịa koronavaịrọs mere ka e nwee ụkọ nri n’Angola. O mekwara ka ihe na-ada oké ọnụ. Ihe a mere ka o siere ọtụtụ ụmụnna anyị ike ịzụta ihe oriri.

E si Brazil bugara ụmụnna anyị ndị Angola nri ndị dị na katọn

 A gwara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Brazil ka ha zigara ụmụnna anyị nọ n’Angola ihe oriri iji gbatara ha ọsọ enyemaka. Iji hụ na e ji ego e ji agbata ọsọ enyemaka mee ihe otú kacha mma, ụmụnna chọpụtara otú ha ga-esi zụta ihe oriri, ma bugakwara ya ndị ọdachi dakwasịrị n’emefughị nnukwu ego. Ha zụkwara ihe oriri ndị ahụ n’ebe o buru ibu kama ịzụwa ha otu otu. Ha zụtara nri ndị gbara na katọn. Nri dị na katọn nke ọ bụla na-afọ ntakịrị ka o ruo kilogram iri abụọ. Ego e ji zụta ma zipụ katọn nri nke ọ bụla bụ ihe dị ka dọla iri abụọ na abụọ. Ihe ndị dị ka osikapa, àgwà na mmanụ e ji esi nri na-adị na katọn nke ọ bụla. Ka ọ dị ugbu a, e bugarala ndị ọdachi dakwasịrị katọn nri ruru puku iri atọ na atọ, narị ise na iri anọ na anọ (33,544). Ha nwere ike iju gwongworo iri itoolu na ise. E ji ihe oriri ndị a nakwa ihe oriri ndị nke e nwetara n’Angola gbatara ihe karịrị puku mmadụ iri ise ọsọ enyemaka.

 Olee otú obi dị ụmụnna anyị maka ihe ndị a e ji gbatara ha ọsọ enyemaka? Nwanna Alexandre, onye bi n’otu ime obodo n’Angola kwuru, sị: “M weere ihe a ka otú Jehova si gosi m na ọ hụrụ m n’anya nakwa na anọghị m naanị m. Nzukọ Jehova ji m kpọrọ ihe.” Nwanna Nwaanyị Mariza, bụ́ nne naanị ya na-azụ ụmụ kwuru, sị: “Jehova nụrụ arịrịọ m. M na-ekele ya na nzukọ ya.”

Obi dị ụmụnna ndị Angola ụtọ maka ihe oriri e buteere ha

 Ịgbatara Ndị Mmadụ Ọsọ Enyemaka Mgbe E Nwere Oké Ọkọchị na Zimbabwe. N’afọ ije ozi 2020, e nwere oké ọkọchị na Zimbabwe. O mere ka agụụ nyụọ ọtụtụ nde mmadụ ịkpakwu. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ na Zimbabwe enweghị ihe oriri ga-ezuru ha.

 E hiwere kọmitii ise na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, ka ha nye aka hụ na ụmụnna anyị ndị ahụ nwetara ihe oriri. Ọtụtụ narị ụmụnna anyị nyere aka hazie nri ndị ahụ ma buba ha n’ụgbọala. Ụfọdụ wepụtakwara ụgbọala ha ka e jiri buga nri ndị ahụ ebe ha dị mkpa. c N’afọ ije ozi 2020, e mefuru $691,561 iji nye ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na abụọ na narị asaa (22,700) nri.

E bugaara ụmụnna ndị Zimbabwe ihe oriri (tupu ọrịa koronavaịrọs amalite)

 N’ebe ụfọdụ, nri ụmụnna anyị nwere agwụla tupu e butere ha nri e ji gbatara ha ọsọ enyemaka. Mgbe e buteere ha nri ndị ahụ, ụmụnna anyị kelere Jehova. Ụfọdụ bidodịrị bụwa abụ Alaeze.

 N’otu ebe, ụmụnna nwaanyị abụọ di ha nwụrụ gara nnọkọ e nwere n’obodo ha, ebe a nọ na-ekwu otú a ga-esi eke nri otu òtù na-abụghị nke gọọmenti ga-eweta iji gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. Ma egwú bịara dagharịa ná nnọkọ ahụ. Ihe ha kwuru mmadụ ga-eme tupu e nye ya nri ahụ ga-eme ka onye ahụ tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi ya, ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ sịrị na ha agaghị eme ya. Mgbe ha si ná nnọkọ ahụ na-ala, ụfọdụ ndị chịwara ha ọchị, na-asị ha, “Ụnụ abịakwala ịrịọ anyị nri.” Ma mgbe naanị izu abụọ gachara, ụmụnna anyị rutere n’obodo ahụ ma butere ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ nri e ji gbatara ha ọsọ enyemaka, tupudị òtù ahụ ebute nri nke ha.

Prisca sịrị na “Jehova ahapụtụbeghị ndị na-efe ya.”

 Ọsọ enyemaka ahụ a gbataara ụmụnna anyị nọ na Zimbabwe e meela ka ndị mmadụ matakwuo gbasara Jehova. Dị ka ihe atụ, legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị bi n’otu obere obodo. Aha ya bụ Prisca. N’agbanyeghị nsogbu ndị oké ọkọchi ahụ kpatara, Prisca kpebiri na ya ga na-eji Wenezdee na Fraịdee aga ozi ọma, ma n’oge ọrụ ugbo. Ndị obodo ya nọ na-achị ya ọchị. Ha sịrị ya: “Agụụ ga-egbu gị na ndị ezinụlọ gị n’ihi ozi ọma a ị na-ekwusa.” Ma Prisca gwara ha, sị: “Jehova ahapụtụbeghị ndị na-efe ya.” Obere oge ihe a mechara, nzukọ Jehova buteere ya ihe oriri. Ihe a masịrị ụfọdụ ndị agbata obi Prisca, ha agwa ya, sị: “Chineke ahapụtụbeghị gị. Anyị chọrọ ịmatakwu banyere Chineke.” Mmadụ asaa n’ime ndị agbata obi ya na-esozi egere ọmụmụ ihe anyị na redio ugbu a.

 Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, a ga na-enwekwu ọdachi ndị na-emere onwe ha. (Matiu 24:​3, 7) Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka onyinye ndị i si n’ụzọ dị iche iche e kwuru na donate.pr418.com na-enye. A ga na-eji ha na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka ozugbo.

a Afọ ije ozi 2020 bụ malite na Septemba 2019 ruo Ọgọst 2020.

b Dọla niile e kwuru okwu ha n’isiokwu a bụ dọla ndị Amerịka.

c N’ihi iwu ndị ọchịchị nyere maka ọrịa koronavaịrọs, ụmụnna anyị na-anata ikike tupu ha ebuga nri ndị ahụ. Ha na-akpachapụkwa anya ka ha ghara ime ihe ndị ga-eme ka ha bute ọrịa ahụ.