Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Ọfis Ndị Nsụgharị Na-abara Ọtụtụ Nde Mmadụ Uru

Ọfis Ndị Nsụgharị Na-abara Ọtụtụ Nde Mmadụ Uru

MACH 1, 2021

 E kee ndị nsụgharị anyị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ isii n’ime ha anọghị n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche arụ ọrụ, kama ha na-anọ n’ọfis ndị nsụgharị dị iche iche. Olee uru ịnọ n’ọfis ndị nsụgharị na-arụ ọrụ bara? Olee ngwá ọrụ ndị ha kwesịrị inwe ka ọrụ ha na-aga aga? Ebe ọfis ndị nsụgharị dị ò nwere ike ime ka ihe ha na-asụgharị kakwuo mma?

 Ọfis ndị nsụgharị na-adị ebe ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ ahụ ha na-asụgharị bi. E nwere otu onye so ná ndị na-asụgharị asụsụ Low Jaman, aha ya bụ Karin. O kwuru, sị: “Kemgbe anyị bịara nọrọ n’ọfis anyị dị na Cuauhtémoc, na Chihuahua dị na Meziko, anyị na-asụzi Low Jaman mgbe niile, ma mgbe anyị na ibe anyị nọ ma mgbe anyị gara ozi ọma ma mgbe anyị gara ịzụrụ ihe. Ọ bụ ndị na-asụ asụsụ anyị gbara anyị gburugburu. Anyị na-anụ akpaala okwu dị iche iche anyị na-anụbeghị kemgbe ọtụtụ afọ, anyị na-anụkwa otú e sizi ekwu okwu ugbu a n’asụsụ anyị.”

 Nwanna James, onye so ná ndị na-asụgharị asụsụ Frafra a na-asụ na Gana, kwuru na mgbe ụfọdụ, ọ na-agụ ya agụụ ịhụ ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Ma o kwukwara, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na anyị nọzi n’ọfis ndị nsụgharị arụ ọrụ. Iji asụsụ anyị ezi ndị mmadụ ozi ọma na ịhụ otú ha si anabata ozi anyị na-eme ka obi bụrụ m sọ aṅụrị.”

 Olee otú ụmụnna anyị si ekpebi ebe e kwesịrị ịrụ ọfis ndị nsụgharị? Nwanna aha ya bụ Joseph na-arụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile nke dị na Wọwik, Niu Yọk, dị n’Amerịka. Ọ sịrị: “Otu nsogbu anyị na-enwe bụ na ọkụ eletrik na mmiri ọṅụṅụ anaghị adị mgbe niile n’ebe ụfọdụ. Ịntanet a ga-eji na-enweta ihe ndị nsụgharị ga-asụgharị anaghịkwa adị. N’ihi ya, anyị chọwa ebe a ga-arụ ọfis ndị nsụgharị, anyị na-atụle ebe dị iche iche a na-asụ asụsụ ahụ nke ga-akacha mma ịrụ ya.”

 Ọtụtụ mgbe, a na-ahazi ebe ụfọdụ n’Ụlọ Mgbakọ, Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ ebe ndị ozi ala ọzọ bi, ka ndị nsụgharị si n’ebe ha bi na-aga ọrụ ebe ahụ. Ịhazi ụdị ọfis a anaghị ewe oge, a naghịkwa emefuru ya nnukwu ego. Ọ bụrụ na e nweghị ebe a ga-ahazi, a na-enye ụmụnna anyị ikike ịzụta ụlọ ndị nsụgharị ga-anọ na-arụ ọrụ, birikwa na ya. Ọ bụrụ na ihe agbanwee, a ga-ere ụlọ ahụ jiri ego ya mee ihe ka mkpa.

A Na-enye Ndị Nsụgharị Ihe Ndị Ga-eme Ka Ọrụ Ha Na-aga Aga

 N’afọ ije ozi 2020, anyị mefuru nde dọla iri na atọ iji nweta ihe ndị nsụgharị ga-eji na-arụ ọrụ n’ọfis ndị nsụgharị niile. Ihe ndị kwesịrị ịdị n’ọfis ndị nsụgharị bụ kọmputa, ihe ndị e ji arụ ọrụ na kọmputa, ihe ndị e ji etinye okwu n’ìgwè, Ịntanet, ọkụ eletrik, mmiri na ihe ndị ọzọ. O nwere ike ifu ihe dị ka narị dọla asaa na iri ise ($750) iji nwetara otu onye kọmputa na ngwá ọrụ ndị ọzọ. A na-etinye ngwá ọrụ ụfọdụ ndị ọzọ rụpụtara na kọmputa ndị ahụ, tinyekwa ihe a na-akpọ Watchtower Translation System. Ihe a na-enyere ndị nsụgharị aka n’ọrụ ha nakwa n’ime nchọnchọ.

 A na-enyekwa ndị nsụgharị ihe ndị ha ga-eji na-etinye okwu n’ìgwè n’ọfis ha nke ọ bụla. Ihe ndị a bara ezigbo uru n’oge ọrịa koronavaịrọs malitere maka na ọtụtụ ndị nsụgharị bulara ha ụlọ ma jiri ha na-etinye ihe dị iche iche ha na-arụ n’ìgwè.

 Ụmụnna ndị ọzọ na-abịa enye aka n’ọfis ndị nsụgharị. Ha na-agụ ihe ndị nsụgharị sụgharịrị iji mara ma à sụgharịtakwara ha, na-enyekwa aka arụzi ihe dị iche iche. Nwanna Cirstin na-arụ ọrụ n’ọfis ndị nsụgharị dị na Kep Taụn, dị na Saụt Afrịka. Ha na-asụgharị asụsụ Afrịkans. Nwanna a sịrị: “Ọtụtụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ oge niile na-abịa ebe a arụ ọrụ.”

 Obi na-atọ ụmụnna ndị na-abịa ọrụ n’ọfis ndị ahụ ụtọ. Otu nwanna nwaanyị na-aga enye aka n’ọfis ndị nsụgharị sịrị na ịga ọrụ ebe ahụ na-eme ya obi ụtọ, na-agbakwa ya ume. Ụfọdụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-eso agụ ihe ndị a na-etinye n’ìgwè. Otu nwanna aha ya bụ Juana, onye so asụgharị asụsụ Totonac na Veracruz dị na Meziko kwuru, sị: “Ugbu a anyị nọzi ebe ndị na-asụ asụsụ anyị bi, ọ na-adịziri ọtụtụ ụmụnna mfe ịbịa tinyere anyị okwu n’ìgwè.”

 Ihe ndị nsụgharị na-asụgharị ọ̀ kakwuola mma maka na ha nọzi n’ọfis ndị nsụgharị arụ ọrụ? Ọtụtụ nde ndị na-agụ akwụkwọ anyị ekwuola na ihe ha na-asụgharị akakwuola mma. Nwanna Cédric, otu n’ime ndị so asụgharị asụsụ Kongo na Kongo Kinshasa, kwuru, sị: “Ụfọdụ ụmụnna na-ekwu na ihe anyị na-asụgharịbu bụ ‘Kongo nke Watch Tower,’ maka na ọ bụghị otú ndị Kongo si asụ asụsụ ha. Ma ugbu a, ha na-ekwuzi na anyị na-asụgharị ihe otú e si asụ asụsụ Kongo n’oge a, ya bụ, otú e si asụ asụsụ a kwa ụbọchị.”

 Nwanna Andile, onye so ná ndị na-asụgharị asụsụ Kosa na Saụt Afrịka, kwukwara ụdị ihe ahụ Cédric kwuru. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị na-agwa anyị na ha na-ahụzi ihe dị iche n’otú anyị si asụgharị ihe. Ụmụaka ndị na-agụbu Ụlọ Nche n’asụsụ bekee na-agụzi ha ugbu a n’asụsụ Kosa. Otú e si sụgharịa Baịbul Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ otú ndị mmadụ si asụ Kosa kwa ụbọchị na-atọ ha ezigbo ụtọ.”

 Ọ bụ onyinye ndị mmadụ si n’obi ha na-enye, ma ndị nke ha na-enye na donate.pr418.com, ka e ji arụ ọfis ndị nsụgharị, na-arụzi ihe ndị mebiri na ha, na-elekọtakwa ndị nsụgharị nọ na ha arụ ọrụ.