IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME
A Na-eji Ihe Mafọrọnụ Mejuo Ihe Kọrọ Ndị Ọzọ
ỌKTOBA 1, 2020
Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ dị mkpa ha ji na-enyere ndị mmadụ aka n’ihe karịrị narị mba abụọ. Ma ọ bụ naanị ihe dị ka mba iri atọ na ise n’ime ha na-enweta ego onyinye na-ezuru ha igbo mkpa ndị e nwere ná mba ha. Oleezi otú e si enweta ego e ji egbo mkpa ná mba ndị na-abaghị ọgaranya?
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eleba anya n’ihe ndị ga-enyere Ndịàmà Jehova n’ụwa niile aka ka ha na-efe Jehova ma na-ekwusa ozi ọma. Ha na-elezikwa anya hazie ihe a ga-eji ego e nwetara n’onyinye eme ma jiri ya mee ihe e kwesịrị iji ya mee. Ọ bụrụ na otu alaka ụlọ ọrụ enweta ego onyinye karịrị ihe ha ga-eji gboo mkpa ndị e nwere n’obodo ndị ha na-elekọta, ha na-enye mba ndị na-enweghị nke ga-ezuru ha nke mafọọrọ ha. Ihe a ha na-eme dabara n’ihe Ndị Kraịst oge mbụ mere. Ha mere ‘ka ihe ha nwere na ihe ndị ọzọ nwere hara otu.’ (2 Ndị Kọrịnt 8:14) Ha ji ihe mafọọrọ ha mejuo ihe kọrọ Ndị Kraịst ndị ọzọ.
Olee otú obi dị ụmụnna anyị ndị natara ego ndị alaka ụlọ ọrụ ndị ọzọ ziteere ha? Ka anyị were otu ihe atụ. Na Tanzania, ebe ihe karịrị ọkara ndị bi na ya anaghị akpataru narị naịra asatọ n’ụbọchị, e ji ụdị ego ahụ e zitere rụzigharịa Ụlọ Nzukọ Alaeze ọgbakọ Mafinga na-anọ amụ ihe. Ọgbakọ ahụ detara akwụkwọ ozi ekele, sị: “Kemgbe a rụzigharịchara Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, e nweela nnọọ ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abịa ọmụmụ ihe anyị! Anyị na-ekele nzukọ Jehova na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile maka otú ha si emesapụ aka, nke mere ka o kwe omume na anyị ga-enwe ebe mara mma otú a anyị na-anọ efe Chineke.”
Ụkọ nri akpaala ụfọdụ ụmụnna anyị na Siri Lanka aka ọjọọ kemgbe a ọrịa koronavaịrọs malitere ịkpa ike. Nwanna nwaanyị Imara Fernando na obere nwa ya nwoke bụ́ Enosh, so ná ndị ụkọ nri ahụ metụtara. Ma n’ihi onyinye ụmụnna anyị sí ná mba ndị ọzọ nyere, ha enwetala ihe oriri ndị dị ha mkpa. Ha ji aka ha rụta otu kaadị ozi ekele ha degaara alaka ụlọ ọrụ. Ihe ha dere na ya bụ: “Anyị na-ekele ụmụnna niile gosiri anyị na ha hụrụ anyị n’anya n’oge ndị a ihe siri ike. Obi atọgbuola anyị na anyị so n’ezinụlọ a zuru ụwa ọnụ. Anyị na-ekpekwa ekpere ka Jehova nyere ụmụnna anyị niile aka n’oge ikpeazụ a.”
N’agbanyeghị ebe ụmụnna anyị bi, ha na-enwe obi ụtọ inyetụ ndị ọzọ ihe ha nwere. Dị ka ihe atụ, Enosh rụtara otu obere igbe ọ ga na-etinye ego onyinye, ka o nweekwa ihe ọ ga-eji enyere ezinụlọ ndị nọ ná mkpa aka. Guadalupe Álvarez na-emesapụkwa aka otú ahụ. O bi n’otu steeti dị na Meziko ebe ọ bụ mmadụ ole na ole na-eri ezigbo ụgwọ ọnwa ma ọ bụdị na-akpata ego mgbe niile. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enye ihe o nwere ike inye. N’akwụkwọ ozi o dere, ọ sịrị: “Ana m ekele Jehova maka ịdị mma ya na ịhụnaya ya na-enweghị atụ. Amakwa m na onyinye ndị m na-enye na nke ndị ọzọ na-enye ga-abara ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa uru.”
Alaka ụlọ ọrụ ndị na-ezigara ndị nọ ná mkpa ego ji obi ụtọ na-eme ya. Anthony Carvalho, onye so na Kọmitii Alaka Brazil, sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ, alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ndị ọzọ ziteere anyị ego. N’ihi aka a ha nyeere anyị, anyị hụrụ ka ọgbakọ dị iche iche si too n’ụdị dị egwu. Ugbu a, ihe esighịziri anyị ike otú ahụ, obi dị anyị ụtọ na anyị na-enyekwara ndị ọzọ aka. Ụmụnna anyị na-echeta na a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile ma ghọta na ha kwesịrị inye aka ugbu a n’ikwusa ya ebe ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ.”
Olee otú kasị mma Ndịàmà Jehova ga-esi kwadoo ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ ná mkpa? Ọ bụghị izigara alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ndị ọzọ ego, kama ọ bụ ịna-enye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Otú e nwere ike isi eme ya bụ itinye onyinye anyị n’igbe onyinye e dere “Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ” ma ọ bụ isi na donate.pr418.com nye onyinye. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ maka onyinye ọ bụla e nyere.