Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

A Na-eziga Ndị Ozi Ala Ọzọ “n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa”

A Na-eziga Ndị Ozi Ala Ọzọ “n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa”

JUN 1, 2021

 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Unu ga-abụ ndị àmà m ruo n’ebe kacha anya n’ụwa.’ (Ọrụ Ndịozi 1:8) Taa, Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe a o kwuru. Ma, a ka nwere ebe ụfọdụ n’ụwa, ma ebe ndị mmadụ bijuru ebiju, ozi ọma a na-erubeghị nke ọma. N’obodo ụfọdụ, Ndịàmà Jehova ehighịkwa nne. (Matiu 9:37, 38) Gịnị ka anyị na-eme ka anyị nwee ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma?

 Iji nye aka mee ihe a Jizọs kwuru, Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eziga ndị ozi ala ọzọ n’ebe a chọrọ ndị ga-enye aka kwusaa ozi ọma. Ka ọ dị ugbu a, e nwere ndị ozi ala ọzọ dị puku atọ na iri itoolu (3,090) n’ụwa niile. a A zụrụ ọtụtụ n’ime ha n’ụlọ akwụkwọ, dị ka Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ndị ozi ala ọzọ na-eji obi ha niile kweta ịhapụ ụlọ ha ma kwaga ná mba ọzọ. Ebe ọ bụ na ụmụnna ndị a ma nke a na-akọ n’ọgbakọ, bụrụkwa ndị a zụrụ nke ọma na ndị mụtara ọtụtụ ihe, ha na-enye aka ekwusa ozi ọma ma na-akpa ezigbo àgwà ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ na-eṅomi.

Ndị ozi ala ọzọ na-enye aka ekwusa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa

Inyere Ndị Ozi Ala Ọzọ Aka Ka Ha Na-enyere Ndị Ọzọ Aka

 N’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla, Ndị Na-ahụ Maka Ndị Ozi ná Ngalaba Ije Ozi na Kọmitii Alaka na-agbakọ aka egboro ndị ozi ala ọzọ mkpa ha, dị ka inweta ụlọ dị mma, ịhụ maka ahụ́ ike ha, na inye ha ego mmachi akpa. N’afọ ije ozi 2020, Ndịàmà Jehova ji ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde dọla iri abụọ na asaa lekọta ndị ozi ala ọzọ. Ihe a emeela ka ndị ozi ala ọzọ nwee ike iji oge ha niile na ike ha niile na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ha sikwuo ike n’okwukwe.

Ndị ozi ala ọzọ na-eme ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ sikwuo ike

 Olee uru ọrụ ndị ozi ala ọzọ na-arụ bara? Frank Madsen, onye so na Kọmitii Alaka dị na Malawi, kwuru, sị: “N’ihi obi ike ndị ozi ala ọzọ nwere na nkà ha ji ezi ozi ọma, ha enyerela ọtụtụ ọgbakọ aka ijezu ozi ọma ebe e kenyere ha na-esiburu ha ike ijezu, dị ka ebe ndị a gbara ogige na ebe a na-asụ asụsụ ọzọ. Otú ha si agbasi mbọ ike amụta asụsụ ndị ha na-ezi ozi ọma na-asụ na omenala ha na-agbakwa ndị ọzọ ume. Ha na-enyekwara ndị na-eto eto aka ịhụ na ha ga-ejeli ozi oge niile. Anyị na-ekele Jehova na o nyere anyị ndị ozi ala ọzọ ndị a.”

 Nwanna so na Kọmitii Alaka mba ọzọ kwuru, sị: “Ndị ozi ala ọzọ na-egosi n’eziokwu na ndị Jehova dị n’otu n’ụwa niile. Ndị na-abụghịdị Ndịàmà Jehova na-ahụkwa na anyị anaghị akpa ókè agbụrụ, kama na eziokwu dị na Baịbụl anyị mụtara emeela ka anyị dịrị n’otu.”

 Olee otú ndị ozi ala ọzọ si enyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ aka? Obi dị nwanna Paulo, onye Timọ-Lest, ụtọ na ha nwere di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ n’ọgbakọ ha. Ọ sịrị: “Obodo anyị na-ekpo ajọ ọkụ. Ma, n’agbanyeghị na ndị ozi ala ọzọ a si n’ebe na-ajụ ezigbo oyi, ha ekweghị ka okpomọkụ mee ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. A naghị achọ ha achọ ná nzukọ ozi ubi a na-enwe n’ụtụtụ. M na-ahụkwa ha ka ha na-aga nletaghachi n’etiti ehihie, mgbe ebe niile na-ekpo ọkụ, nakwa ná mgbede. Ha enyerela ma mụnwa ma ọtụtụ ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. Otú a ha si eme na-agba ndị ọgbakọ anyị niile ume ịna-ejekwuru Jehova ozi.”

 Nwanna nwaanyị aha ya bụ Ketti, onye bụ́ ọsụ ụzọ oge niile na Malawi, kọrọ otú otu nwanna nwoke na nwunye ya bụ́ ndị ozi ala ọzọ si nyere ezinụlọ ya aka. Ọ sịrị: “Mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ batara ọgbakọ anyị, ọ bụ sọọsọ m bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ m. Ma, di na nwunye ahụ nyeere m aka. Ha na ndị ezinụlọ m bịara dị ná mma. Àgwà ọma ha mere ka ụmụ m hụ otú ife Jehova si eme ka obi na-adị mmadụ ụtọ, obi erukwa onye ahụ ala. N’ihi àgwà ọma ha, ụmụ m ndị nwaanyị atọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ugbu a, di m ebidokwala ịbịa ọmụmụ ihe.”

 Ebee ka e si enweta ego e ji elekọta ndị ozi ala ọzọ? Ọ bụ onyinye ndị a na-enye iji kwado ọrụ ịkwusa ozi ọma a na-arụ n’ụwa niile, nke ọtụtụ na-esi n’ụzọ dị iche iche a kọwara na donate.pr418.com enye. Obi dị anyị ụtọ maka onyinye ndị a ndị mmadụ ji obi ha niile na-enye.

a A na-eziga ndị ozi ala ọzọ a n’ọgbakọ ndị a chọkwuru ndị ga na-enye aka n’ikwusa ozi ọma. E nwekwara ndị ozi ala ọzọ dị otu puku na otu (1,001) bụ́ ndị nlekọta sekit.