Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Maka ihe nkiri ahụ si na Baịbụl e mere, e kpobatara okwute e gweriri egweri dị ihe dị ka iri puku kilogram abụọ na asatọ wụọ n’ime Maụnt Ebo, ebe anyị na-anọ eme ihe nkiri

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Imepụta Vidio Ndị Dị n’Ihe Omume Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020

Imepụta Vidio Ndị Dị n’Ihe Omume Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020

ỌGỌST 10, 2020

 Vidio ndị anyị na-ele ná mgbakọ ukwu anyị na-eru anyị n’obi, na-emekwa ka anyị ghọtakwuo ihe ndị e si n’Akwụkwọ Nsọ na-akụziri anyị. Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020 nwere otu narị vidio na iri na anọ, okwu iri anọ na atọ ndị so n’Òtù Na-Achị Isi na nke ndị na-enyere ha aka kwuru sokwa na ya. Ò nwetụla mgbe i chere banyere ọrụ dị n’imepụta vidio ndị a, nakwa ego ọ na-efu iji mepụta ha?

 Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị itoolu ndị si ebe dị iche iche n’ụwa ji oge ha na ike ha nye aka mepụta ihe omume mgbakọ a. A gụkọta oge niile ha ji rụọ ọrụ a, ọ fọrọ obere ka o ruo otu narị puku awa. Ha jikwa afọ abụọ rụọ ya. Ihe so n’awa ndị ahụ bụ puku awa iri asaa e ji mepụta ihe nkiri ahụ si na Baịbụl e ji nkeji iri asaa na isii ele, nke isiokwu ya bụ Nehemaya: “Ọṅụ Jehova Bụ Ebe Unu E Wusiri Ike.”

 O doro anya na ị ma na e mefuru ego buru ibu e ji lekọta ụmụnna ndị a wepụtara onwe ha nye aka, mefuokwa ego buru ibu e ji zụta ngwá ọrụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa ha ji rụchaa ọrụ a.

 Jared Gossman, bụ́ nwanna na-arụ ọrụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Vidio na Ihe Ndị A Na-egere Egere, sịrị: “Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi chọrọ ka a na-egosi ndị dị iche iche na otú ndị obodo dị iche iche si eme ihe na vidio anyị. Ihe mere e ji eme ya otú a bụ iji gosi na e nwere ụmụnna anyị n’ụwa niile. Ka e nwee ike imezu nke a, ndị ọrụ e kere ụzọ iri abụọ na anọ, ndị nọ ná mba iri na otu, gbakọrọ aka rụọ ọrụ a. Tupu e nwee ike ịnọ ebe dị iche iche n’ụwa rụọ ụdị ọrụ a, a ga-ahazi ọtụtụ ihe, mefuo ego buru ibu, mekọọkwa ọtụtụ ihe ọnụ.”

 A na-ejikwa ihe ndị pụrụ iche emepụta ọtụtụ vidio anyị. Dị ka ihe atụ, a rụrụ ihe niile e ji mepụta ihe nkiri Nehemaya: “Ọṅụ Jehova Bụ Ebe Unu E Wusiri Ike” n’ime Maụnt Ebo, bụ́ ebe anyị na-anọ eme ihe nkiri, nke dị nso na Patasin, Niu Yọk, Amerịka. Ka anyị nwee ike hụ na e mefusịghị ego ụmụnna anyị nyere n’onyinye, ma hụkwa na anyị mepụtara ihe nkiri ahụ ka ọ daba adaba n’otú ihe dị n’oge Nehemaya, ụmụnna anyị ji ihe ndị na-adịghị arọ rụọ ihe ndị yiri mgbidi Jeruselem oge ochie. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ yiri mgbidi dị mita isii n’ogologo. Ahụ́ ya bụ osisi, ma ihe dị n’ime ya bụ fom. E jizi ihe ọzọ tee ya ka o yie nnukwu nkume. E nwere ike ibugharị ihe ndị a yiri mgbidi ma e mewe agba nke ọ bụla n’ihe nkiri ahụ. Ihe mere e ji mee ya otú a bụ ka a ghara imefu ego buru ibu rụọ ọtụtụ ihe ndị ahụ yiri mgbidi. N’agbanyeghị nke ahụ, e ji ihe dị ka otu narị puku dọla ma ọ bụ ihe dị ka nde naịra iri atọ na isii rụọ naanị ihe ndị e ji mepụta ihe nkiri ahụ. a

 Ihe ndị a anyị matara ugbu a ga-eme ka anyị kelekwuo Jehova maka ihe omume mgbakọ ukwu anyị nke afọ a. Obi siri anyị ike na ọrụ niile a rụrụ iji wepụta ihe omume mgbakọ ukwu anyị nke afọ a ga-eme ka e too aha Jehova n’ụwa niile. Anyị na-ekele unu maka otú unu si na-emesapụ aka ma si na donate.pr418.com nakwa n’ụzọ ndị ọzọ na-enye onyinye maka ọrụ a a na-arụ n’ụwa niile.

a A rụrụ ihe ndị e ji mepụta ihe nkiri ahụ bụ́ Nehemaya: “Ọṅụ Jehova Bụ Ebe Unu E Wusiri Ike” tupu ọrịa koronavaịrọs akpawa mkpamkpa n’ụwa. N’oge ahụ, e kwuwebeghị ka ndị mmadụ ghara ịna-anọ ibe ha nso.