Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ha Nyere Ihe Ndị Kacha Mma Ha Nwere

Ha Nyere Ihe Ndị Kacha Mma Ha Nwere

 Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri n’afọ 1945, a laala ọtụtụ ebe n’iyi na Jamanị. Ụlọ akwụkwọ dị iche iche tọgbọzi chakoo, e nweghịzi ụlọ ọgwụ ka na-arụ ọrụ, bọmbụ ndị na-agbawaghị agbawa jukwara ebe niile. Ihe ọzọ bụ na ihe oriri dị ụkọ, nke mere ka ọnụ ahịa ihe oriri rịa elu. Dị ka ihe atụ, ndị gọọmentị na-enyeghị ikike ire bọta na-ere nke na-anyị arọ ka obere akị bekee ego ole a na-akwụ onye ọrụ ngo maka ọrụ ọ rụrụ izu isii.

 E nwere ihe karịrị puku Ndịàmà Jehova abụọ ihe a metụtara. Ndị a anọọla ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ nakwa n’ogige ịta ahụhụ n’ihi na ha ekweghị aga agha. Mgbe a tọhapụrụ ha n’afọ 1945, a gbawara ha aka ihe niile, e wezụga uwe ndị mkpọrọ ha yi. Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nweburu ụlọ na ihe ndị ọzọ enweghịzi nke ha nwe. Agụụ nyụrụ ndị mmadụ ịkpakwụ n’oge ahụ, nke na ụfọdụ ụmụnna na-atụbọ ma ha bịa ọmụmụ ihe.

Ndịàmà Jehova Nọ ná Mba Ndị Ọzọ Gbataara Ha Ọsọ Enyemaka Ozugbo

 Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ndị ọzọ wetaara ụmụnna ndị a ihe ndị kacha ha mkpa, ya bụ, ihe oriri na uwe. Ụmụnna ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka gwara alaka ụlọ ọrụ dị na Ben, Swizaland, ka ha nyere ụmụnna ndị nọ na Jamanị aka. Nwanna Nathan H. Knorr, onye nnọchianya si n’isi ụlọ ọrụ anyị, gara Yurop ka ọ hụ na a haziri ma zigara ụmụnna anyị ihe e ji agbatara ha ọsọ enyemaka ozugbo.

Ebe Nwanna Nathan H. Knorr na-agwa ụmụnna ndị nọ na Visbadin, Jamanị, okwu n’afọ 1947. Ihe e dere n’elu ebe ahụ ọ nọ bụ: “Toonụ Jehova, Unu Mba Niile.” Ọ bụ isiokwu afọ ahụ nke e dere n’asụsụ Jaman

 Ụmụnna anyị ndị bi na Swizaland ji obi ha niile tụkọta ihe oriri, uwe, na ego. E bu ụzọ buga ihe ndị ahụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Ben, bụ́ ebe a nọ hazie ma kechie ha tupu e jiri ụgbọ mmiri buga ha Jamanị. Ndịàmà Jehova nọ ná mba ndị ọzọ dị ka Swidin, Kanada, na Amerịka wetakwara ihe enyemaka. E nyekwara ụmụnna anyị nọ ná mba ndị ọzọ agha kpara aka ọjọọ n’Eshia nakwa na Yurop ụfọdụ ihe ndị ahụ.

Ihe Ọma Ndị Ọ Rụpụtara

 N’ime ọnwa ole na ole, alaka ụlọ ọrụ dị na Swizaland bugaara ha kọfị, mmiri ara ehi, shuga, ọka na ihe ndị yiri ya, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, nakwa anụ na azụ̀ a gbara ná mkpọ. Ha nyekwara ha ego.

 Ụmụnna ndị nọ na Swizaland zitekwara uwe ga-afọ obere ka o ju otu gwongworo. Uwe ụmụ nwoke, uwe ụmụ nwaanyị, na uwe oyi dị na ya. Ụlọ Nche Jenụwarị 15, afọ 1946, sịrị: “Ụmụnna ndị ahụ enyeghị ihe ndị ha chọrọ ịtụfu atụfu. Kama, ihe niile ha nyere bụ ihe ndị kacha mma ha nwere. Inyere ụmụnna ha ndị nọ na Jamanị aka furu ha ezigbo ihe.”

 Ụmụnna ndị nọ na Swizaland wetakwara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu puku akpụkpọ ụkwụ. E lerukwara ha anya nke ọma ka a hụ na ha dị mma tupu e zigara ha ụmụnna ndị Jamanị. Mgbe ụmụnna nọ n’obodo Visbadin, dị na Jamanị natara ihe ndị ahụ, tọghee ha, ma hụ otú ha si maa mma, dịkwa n’ụdị dị iche iche, o nyeghị ha ọnụ okwu. Otu nwanna sịrị: “Ọ ga-ara ahụ́ ịhụ ebe a na-ere ọmarịcha ákwà ndị a na Jamanị.”

 E butegidere ihe enyemaka ndị a ruo ọnwa Ọgọst afọ 1948. Ihe niile ụmụnna nọ na Swizaland zigaara ụmụnna ha nọ na Jamanị ga-eju gwongworo anọ, fọkwa. Dị ka anyị kwuburu, ọ bụghị naanị ụmụnna anyị nọ na Swizaland gbataara ụmụnna ndị a ọsọ enyemaka. Ma, ha so ná ndị kacha ntakịrị n’ime ndị niile so nye aka, n’ihi na Ndịàmà Jehova e nwere na Swizaland n’oge ahụ dị naanị otu puku na narị isii (1,600).

‘Hụnụ Ibe Unu n’Anya’

 Jizọs Kraịst sịrị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 13:​34, 35) Ọ bụ ịhụnanya mere ndị Jehova ji nye ihe ndị kacha mma ha nwere, kama inye ihe ndị na-adịghịzi ha mkpa. (2 Ndị Kọrịnt 8:​1-4) Otu akwụkwọ ozi si Zurik kwuru na “ọtụtụ ụmụnna ndị na-enweghị nri ma ọ bụ uwe ha ga-enye nyere ego na kaadị mmadụ nwere ike iji nweta nri n’aka ndị ọchịchị.”

 Ndị Jehova nọ na Jamanị nwetara onwe ha ngwa ngwa n’agbanyeghị nsogbu agha ahụ kpataara ha. Otu ihe nyeere ha aka bụ na ụmụnna ha ji obi ha niile gbatara ha ọsọ enyemaka, a haziekwa ihe niile nke ọma.

Ebe Ndịàmà Jehova nọ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Ben, Swizaland, na-ahazi uwe ndị a tụkọtara maka ụmụnna ha nọ na Jamanị

Ebe a na-ebuba onyinye ụmụnna nyere n’otu nnukwu ụgbọala n’alaka ụlọ ọrụ dị na Ben

Otu nnukwu ụgbọala bu onyinye ndị e dere “Ihe Ndịàmà Jehova Ji Agbata Ọsọ Enyemaka”

Ebe a na-ebuba onyinye ndị ụmụnna nyere n’ụgbọ okporo ígwè ka e buru ha gawa Jamanị