IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE
Inyere Ndị Mmadụ n’Ụwa Niile Aka Ịmụta Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede
Otu nwoke aha ya bụ Agostinho, onye bi na Brazil, sịrị: “Etoro m n’ugbo dị n’otu ime obodo. Ezinụlọ anyị bụ ogbenye ọnụ ntụ. Akwụsịrị m ịga akwụkwọ ka m nwee ike rụwa ọrụ ma nye aka kpatawa ihe ndị ezinụlọ anyị ga-eri.” Agostinho mechara mụta ịgụ ihe na ide ihe mgbe ọ dị afọ iri atọ na atọ. Ọ sịrị: “Ịmụta ịgụ ihe na ide ihe mere ka ndị mmadụ na-akwanyere m ùgwù, meekwa ka obi na-esikwu m ike.”
Agostinho bụ otu n’ime ihe dị ka narị puku mmadụ atọ Ndịàmà Jehova kụziiri otú e si agụ na otú e si ede kemgbe ihe karịrị iri afọ asaa. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji akụziri ndị mmadụ ịgụ ihe na ide ihe? Olee uru nkụzi ihe a baarala ndị mmadụ?
Amaghị Agụ na Amaghị Ide Na-egbochi Mmadụ Ịmụta Ihe
N’ihe dị ka n’afọ 1935, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ha n’otu narị mba na iri na ise. Ka ozi ọma nwee ike iru ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ntị, ndị ozi ala ọzọ n’oge ahụ na-akpọnyere ndị mmadụ okwu Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ ha ka ha gere, mgbe ụfọdụkwa, ha na-enye ha akwụkwọ anyị n’asụsụ ha. Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị gosiri mmasị na Baịbụl, amaghị agụ na amaghị ede mere ka ọtụtụ n’ime ha ghara ịmụta Baịbụl ngwa ngwa.
Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha agaghị agụli Baịbụl n’onwe ha, o siiri ha ike ime ihe ndị Baịbụl kwuru. (Joshụa 1:8; Abụ Ọma 1:2, 3) O sikwaara ha ike ịrụ ọrụ dịịrị Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nne na nna amaghị agụ ma ọ bụ ede, ọ ga-esiri ha ike ịkụziri ụmụ ha ihe. (Diuterọnọmi 6:6, 7) Ọ na-esikwara ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova ọhụrụ ike iji Baịbụl kụziere ndị ọzọ ihe ma ọ bụrụ na ha amaghị agụ ihe.
E Bido Ịkụziri Ndị Mmadụ Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede
N’ihe dị ka n’afọ 1941 ruo afọ 1959, Nwanna Nathan H. Knorr na Nwanna Milton G. Henschel, bụ́ mmadụ abụọ so ná ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, gara ọtụtụ mba gaa nyere ha aka hazie otú ọrụ ikwusa ozi ọma ga-esi na-aga. Mgbe ha ruru ná mba ndị e nwere ọtụtụ ndị na-amaghị ka e si agụ na ka e si ede, ha gbara alaka ụlọ ọrụ ndị dị ebe ahụ ume ka ha hazie otú a ga-esi na-akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede n’ọgbakọ dị iche iche.
Alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ nyeziri ọgbakọ dị iche iche ntụziaka otú ha ga-esi hazie nkụzi ihe a. Ná mba ụfọdụ, ndị ọchịchị enweelarị ihe ndị a kwadebere e ji akụziri ndị mmadụ akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, na Brazil, gọọmentị nyere alaka ụlọ ọrụ ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Alaka ụlọ ọrụ zigaziiri ọgbakọ dị iche iche ihe ndị ahụ. Ná mba ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova ji aka ha mepụta otú ha si akụziri ndị mmadụ akwụkwọ.
Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, ma ndị agadi ma ndị ka na-eto eto nwere ike ịbịa mụta akwụkwọ. Ihe bụ isi bụ ka a kụziere ndị mmadụ ịmụta ịgụ asụsụ e ji mụọ ha. Nke a mekwara ka a na-akụzi ọtụtụ asụsụ n’otu ọgbakọ.
Ọ Na-enyere Ọtụtụ Ndị Aka
Olee uru nkụzi ihe a baarala ndị mmadụ? Otu Onyeàmà Jehova bi na Meksiko, sịrị: “Ugbu a aghọtawala m ihe Baịbụl na-ekwu, nke a na-emekwa ka ihe m na-amụta na-eru m n’obi. Ugbu a m mụtara otú e si agụ ihe, ụjọ anaghịzi atụ m izi ndị agbata obi m ozi ọma, o nyekwarala m aka izi ọtụtụ mmadụ ozi ọma.”
Uru ịmụta otú e si agụ na otú e si ede baara ndị mmadụ akwụsịghị naanị n’inyere ha aka ịghọta Baịbụl. Otu nwoke aha ya bụ Isaac, onye Burundi, sịrị: “Ịmụta ka e si agụ na ka e si ede nyeere m aka ịmụta otú e si arụ ụlọ. Ịrụ ụlọ bụzi aka ọrụ m, ugbu a kwa, ọ bụ m na-ahụ maka ebe ndị a na-arụ ọtụtụ ụlọ.”
E nwere otu nwaanyị onye Peruu aha ya bụ Jesusa, mgbe ọ dị iri afọ anọ na itoolu ka o bidoro ịga ebe a na-akụzi ka e si agụ na ka e si ede. Ọ sịrị: “Abụ m nne nwaanyị nwere ezinụlọ, m gaa ahịa ịzụrụ ihe ndị m ji esi nri, m kwesịrị ịma aha e dere n’ihe ndị m chọrọ ịzụ na ego ole e dere na ha. N’oge mbụ, ọ na-esiri m ike. Ịmụta ka e si agụ na ka e si ede enyerela m ezigbo aka. Ugbu a, m gaa ahịa ịzụ ihe, obi na-esi m ike.”
Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọrụ gọọmentị ná mba dị iche iche etoola Ndịàmà Jehova maka mbọ ha gbara kụziere ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede. Taa, Ndịàmà Jehova ka na-akụzikwara ndị mmadụ ka e si agụ na ka e si ede. Ha jikwa ihe ndị ọgbara ọhụrụ ndị ka mma na-eme nke a. Ha edeekwala ma bipụta broshọ fọrọ obere ka o ruo narị nde abụọ na iri abụọ na anọ, n’asụsụ dị narị asaa na iri abụọ, ka e jiri ya na-akụziri ndị na-amaghị agụ ihe ma ọ bụ jiri ya nyere ndị na-amachaghị agụ ihe aka ka ha mụta ịgụ ihe nke ọma. *
^ par. 11 Dị ka ihe atụ, e nwere broshọ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing n’otu narị asụsụ na iri abụọ na atọ, ebe broshọ Gee Chineke Ntị dị na narị asụsụ isii na iri.