Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ndịàmà Jehova Nọ na Niu Ziland Hà Bụ Ndị Udo na Ezigbo Ndị Kraịst?

Ndịàmà Jehova Nọ na Niu Ziland Hà Bụ Ndị Udo na Ezigbo Ndị Kraịst?

 N’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Ọktoba, afọ 1940, ndị ọchịchị mba Niu Ziland kwuru na Ndịàmà Jehova na-agba ọchịchị mgba okpuru, nakwa na ha nwere ike ịkpatara ọhaneze nsogbu. N’agbanyeghị na ihe a ndị ọchịchị kwuru kpataara Ndịàmà Jehova ọtụtụ nsogbu, o meghị ka ha daa mbà. Dị ka ihe atụ, ha akwụsịghị ịna-ezukọta maka ife Jehova, ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka ndị ọchịchị kpọchie ha.

 E nwere otu nwaanyị Onyeàmà Jehova aha ya bụ Mary. Di ya, Andy Clarke, abụghị Onyeàmà Jehova. Ọ chọpụtara na nwunye ya kpebisiri ike ịna-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’agbanyeghị egwu ndị ọchịchị na-eyi ha. Ma, ụjọ nọ na-atụ ya na e nwere ike ịnwụchi nwunye ya otu ụbọchị ma ọ gaa ọmụmụ ihe. N’ihi ya, o bidoro ịna-eso nwunye ya aga ọmụmụ ihe n’agbanyeghị na ọ naghị emebu otú ahụ. Ọ gwara nwunye ya, sị: “Ọ bụrụ na ha ga-anwụchi gị, ka ha nwụchiekwa mụnwa.” Bido mgbe ahụ gawa, ọ na-eso nwunye ya aga ọmụmụ ihe niile. O mechara mee baptizim ma ghọọ Onyeàmà Jehova. Otú a Nwanna Nwaanyị Mary si tachie obi ka imeriime Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nọ na Niu Ziland sikwa tachie obi n’oge a na-akpagbu ha n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.

Ha Akwụsịghị Ife Chineke n’Ụlọ Mkpọrọ

 Otu ụbọchị, ndị uwe ojii nwụchiri otu nwanna dị afọ iri asaa na asatọ aha ya bụ John Murray ka ọ nọ na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. Ụlọikpe mara ya ikpe na o so n’òtù na-agba ọchịchị mgba okpuru. A nwụchikwara ọtụtụ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ ma kpụpụ ha n’ụlọikpe. E riri ụfọdụ n’ime ha iwu, tụọ ndị nke ọzọ mkpọrọ ruo ọnwa atọ.

 Ndịàmà Jehova ndị ahụ ekweghị aga agha n’ihi ihe ha mụtara na Baịbụl. (Aịzaya 2:4) Ihe a mere ka a taa ha ezigbo ahụhụ mgbe a kpọrọ ha ka ha bịa soro gaa agha, ha ajụ. A tụrụ ihe dị ka Ndịàmà Jehova iri asatọ mkpọrọ. Ha nọkwa n’ebe ndị a tụrụ ha mkpọrọ agha ebie. N’agbanyeghị otú e si na-echi ha ọnụ n’ala n’ebe ndị ahụ, nakwa oké oyi na-atụ n’ebe ahụ n’oge oyi, ha nọgidere jiri obi ụtọ na-efe Jehova.

 N’egbughị oge, Ndịàmà Jehova ndị ahụ haziri otú ha ga-esi na-amụ ihe ma na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ mkpọrọ. Ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ nke ọ bụla ghọrọ ọgbakọ, na-agachi ọmụmụ ihe anya, haziekwa otú ha ga-esi na-ezi ndị mkpọrọ ndị ọzọ ozi ọma. E nyedịrị ha ikike inwe mgbakọ n’ụlọ mkpọrọ ụfọdụ. Ma, a ga-enwe otu onye nche ga-anọ ebe ahụ. E nwere ndị mkpọrọ nọ ebe ahụ mụta eziokwu Baịbụl, e meekwa ha baptizim.

Ụmụnna ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ haziri ka a na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

 Nwanna Nwaanyị Mary na Nwanna Andy anyị kwuburu okwu ha ná mmalite nwere nwa nwoke aha ya bụ Bruce. Ọ bụ nwa ha nwoke nke kacha nta. O ji oge a tụrụ ya mkpọrọ mụtakwuo banyere Jehova. O kwuru, sị: “M ji oge ahụ mụta ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ndị dimkpa mụ na ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ọ dị m ka ebe m nọ n’ụlọ akwụkwọ. M si n’aka ha niile mụta ihe mgbe mụ na ha na-akparịta ụka.”

 N’afọ 1944, ndị ọchịchị kpebiri ịtọhapụ ụfọdụ Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, ndị agha obodo ahụ ekweghị. Ha sịrị na a hapụ Ndịàmà Jehova ndị ahụ, na ha ga-alaghachikwa bido gwawa ndị mmadụ ihe ndị ha kweere. Otu kọmitii e hiwere maka ileba okwu ahụ anya kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ijichi ha n’ụlọ mkpọrọ nwere ike ime ka ha ghara ịna-ekwusa ozi ọma n’ebe niile, mana ọ gaghị eme ka ha kwụsị ikwusa ya.”

Ha Abụghị Ndị Nwere Ike Ịkpatara Ọhaneze Nsogbu

 Mmachi ahụ a machiri Ndịàmà Jehova mere ka akụkọ banyere ha gazuo ebe niile. Ndị ụfọdụ bịaziri chọwa ịma banyere Ndịàmà Jehova. Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị chọpụtara na Ndịàmà Jehova abụghị ndị nwere ike ịkpatara ọhaneze nsogbu. Ha chọpụtara na Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst na-eme udo. Ihe a mere ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova nọ na Niu Ziland si na narị mmadụ atọ na iri abụọ ọ dị n’afọ 1939 ruo narị mmadụ ise na iri atọ na isii n’afọ 1945.

 Mgbe ụfọdụ, ndị ezigbo mmadụ ọnụ na-eru n’okwu kwetara na mmachi a machiri Ndịàmà Jehova ekwesịghị ekwesị. Mgbe otu ọkàikpe nụchara ebubo e boro otu nwanna anyị nwoke n’ihi na ọ na-ekwusa ozi ọma, ọ kachapụrụ ikpe ahụ ma sị nwanna ahụ lawa. Ọ sịrị: “N’uche m nakwa n’ihi ihe m ghọtara iwu kwuru, ọ naghị ekwe m nghọta na mmadụ ga-asị na onye na-ekesara ndị mmadụ Baịbụl dara iwu obodo.”

 Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro Ndịàmà Jehova. Ndịàmà Jehova bịaziri kpebisikwuo ike ịkụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. N’afọ 1945, alaka ụlọ ọrụ degaara ọgbakọ niile dị na Niu Ziland akwụkwọ ozi, sị ha: “Dịrịnụ akọ, na-emesokwanụ mmadụ niile ihe otú dị mma. Zerenụ arụmụka na esemokwu. Chetanụ na ndị anyị na-ezi ozi ọma ji obi ha niile kwere n’ihe ndị a na-akụzi n’okpukpe ha. . . . Ọtụtụ n’ime ha bụ ‘atụrụ’ Onyenwe anyị, ndị anyị kwesịrị ịkụziri banyere Jehova na Alaeze ya.”

 Ruokwa taa, Ndịàmà Jehova nọ na Niu Ziland ka na-akụziri ndị bi n’obodo ha na ndị bịara ilegharị anya n’obodo ha eziokwu Baịbụl. Otu ụbọchị, naanị n’ime awa ole na ole, Ndịàmà Jehova anọ bi na Turangi ziri mmadụ iri isii na asaa si mba iri na asaa bịa ilegharị anya ozi ọma.

 O doro anya na ndị Niu Ziland ma na Ndịàmà Jehova bụ ndị udo, bụrụkwa ezigbo Ndị Kraịst ji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe. N’afọ ọ bụla, a na-eme ọtụtụ narị mmadụ baptizim n’obodo ahụ, ha abụrụ Ndịàmà Jehova. N’afọ 2019, e nwere Ndịàmà Jehova karịrị puku iri na anọ ji obi ụtọ na-efe Jehova na Niu Ziland.

Ebe ụmụnna na-amụ ihe n’oge a machibidoro ha iwu n’afọ 1940

Ụlọ mkpọrọ ndị otu onye na-anọ na ha n’ebe ugwu Niu Ziland

Ụlọ mkpọrọ dị na Hautu dị n’ebe ugwu Niu Ziland

Ebe Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere zukọrọ n’afọ 1949