Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

JenkoAtaman/stock.adobe.com

NA-ECHENỤ NCHE!

Ihe Mere Anyị Ga-eji Nwee Olileanya n’Afọ 2023—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ihe Mere Anyị Ga-eji Nwee Olileanya n’Afọ 2023—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Ka afọ 2023 na-amalite, anyị niile nwere olileanya na ihe ọma ga-emere anyị na ndị ezinụlọ anyị. Gịnị mere anyị ga-eji na-atụ anya ihe ọma n’ọdịnihu?

Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya

 Baịbụl kwuru na nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a agaghị adịte aka nakwa na ha ga-ebi n’oge na-adịghị anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na e dere Baịbụl ‘ka e jiri ya kụziere anyị ihe, ka. . . nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.’Ndị Rom 15:4.

Olileanya nke nwere ike inyere gị aka ugbu a

 Olileanya Baịbụl mere ka anyị nwee “ji ndụ anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri si ejide ụgbọ mmiri.” (Ndị Hibru 6:19) Olileanya ahụ na-eme ka anyị nwee obi ike. Ọ ga-enyeliri anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị, mee ka anyị tinyere ụwa anyị obiọma, ma na-enwe ezigbo obi ụtọ. Dị ka ihe atụ:

  •   Chọpụta otú olileanya si na Baịbụl si nyere otu nwoke aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya. Lee vidio bụ́ Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike.

  •   Chọpụta otú olileanya si na Baịbụl ga-esi nyere anyị aka mgbe onye ikwu anyị ma ọ bụ enyi anyị nwụrụ. Lee vidio bụ́ Ihe Ga-akasi Ndị Na-eru Uju Obi.

Na-eme ka olileanya gị sikwuo ike

 Ọtụtụ ndị na-atụ anya ka ihe ọma meere ha, ma obi anaghị esi ha ike na ihe ndị ha na-atụ anya ha ga-emecha mee. Nkwa dị iche iche Baịbụl kwere adịghị otú ahụ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ bụ Jehova Chineke, a “onye na-enweghị ike ịgha ụgha,” kwere nkwa ndị dị na Baịbụl. (Taịtọs 1:2) Ọ bụ naanị Jehova nwere ike imezu nkwa niile o kwere. Ọ ga-emeli “ihe ọ bụla dị ya mma.”—Abụ Ọma 135:5, 6.

 Anyị na-agba gị ume ka i soro rite uru n’olileanya Baịbụl na-eme ka anyị nwee. Ọ bụrụ na ị “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma,” ọ ga-eme ka obi sie gị ike na ihe ndị anyị na-atụ anya ha ga-emezu. (Ọrụ Ndịozi 17:11) Kwe ka anyị na gị mụwa Baịbụl ka i nwee ike ịmatakwu banyere olileanya a. Anyị agaghị ana gị ego. Ka afọ 2023 na-amalite, nwee olileanya n’ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

a Jehova bụ aha Chineke.—Abụ Ọma 83:18.