Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

hadynyah/E+ via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ụkọ Nri Dị n’Ụwa n’Ihi Agha na Otú Ihu Ígwé Si Agbanwe?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ụkọ Nri Dị n’Ụwa n’Ihi Agha na Otú Ihu Ígwé Si Agbanwe?

 Agha a na-alụ na Yukren na otú ihu ígwé si agbanwe emeela ka nri dị ezigbo ụkọ n’ụwa. Ụkọ nri a kacha akpa mba ndị ka na-emepe emepe aka ọjọọ. Ọtụtụ ndị anaghị ahụ tụrụ rachaa ná mba ndị ahụ.

  •   N’abalị 17 n’ọnwa Julaị afọ 2023, António Guterres, bụ́ odeakwụkwọ ukwu Òtù Mba Ụwa kwuru, sị: “Agha, otú ihu ígwé si agbanwe, otú mmanụ ọkụ na ọkụ eletrik si dị oké ọnụ, nakwa ihe ndị ọzọ na-eme ka imepụta nri na ime ka o ruo ndị mmadụ aka sie ike.”

  •   N’abalị 23 n’ọnwa Julaị afọ 2023, otu ụlọ ọrụ kwuru na ‘ndị ọkachamara na-eche na ebe ọ bụ na Rọshịa ekwuola na ha ekweghịzi ka a na-esi na Yukren ebuga ọka ebe dị iche iche, nri ga-adịkwu ụkọ n’ụwa niile, dịkwa oké ọnụ ná mba ndị dara ogbenye, karịchaa n’ebe ugwu Afrịka nakwa n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu.’

 Legodị ihe Baịbụl kwuru banyere ụkọ nri na ihe ga-eme n’ọdịnihu.

Baịbụl kwuru na a ga-enwe ụkọ nri

  •   Jizọs kwuru, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwekwa ụkọ nri.”​—Matiu 24:7.

  •   Akwụkwọ Mkpughe kwuru gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ. Otu n’ime ha nọchiri anya agha. Nke na-eso ya nọchiri anya ụnwụ nri, nke pụtara na e nwere oge nri ga-adị ụkọ, dịkwa ezigbo oké ọnụ. Ebe ahụ sịrị: “Ahụkwara m ịnyịnya ojii, nke onye na-agba ya ji ihe gbara mkpị e ji atụ̀ ihe n’aka ya. Anụrụ m ihe dị ka olu . . . Olu ahụ sịrị: ‘A na-ere otu kwọt nke ọka wit otu mkpụrụ ego dinarịọs. A na-erekwa kwọt atọ nke ọka bali otu mkpụrụ ego dinarịọs.’”​—Mkpughe 6:5, 6.

 Amụma ndị a Baịbụl buru banyere ụkọ nri na-emezu n’oge anyị a, bụ́ oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Ị chọọ ịmatakwu gbasara “oge ikpeazụ” nakwa gbasara ndị ahụ na-agba ịnyịnya anọ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe, lee vidio isiokwu ya bụ Ụwa Agbanweela Kemgbe Afọ 1914, gụọkwa isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka

  •   Baịbụl kwuru ihe ndị bara ezigbo uru ga-enyere anyị aka idi nsogbu dị iche iche, dị ka otú nri si dị oké ọnụ na ụkọ nri. Ị chọọ ịhụ ụfọdụ n’ihe ndị ahụ o kwuru, gụọ isiokwu bụ́ “How to Live on Less.”

  •   Baịbụl na-emekwa ka anyị nwee olileanya na ihe ga-emecha dị mma. O kwere nkwa na oge na-abịa mgbe “nri ga-eju n’ụwa,” onye ọ bụla ana-eriju afọ. (Abụ Ọma 72:16) Ị chọọ ịmatakwu gbasara olileanya a anyị nwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu nakwa ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na ha ga-emezu, gụọ isiokwu bụ́ “Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu.”