Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị
Taa, ọ dịzi ezigbo mfe inweta akụkọ ma ọ bụ ozi, ma ndị nke nwere ike inyere gị aka izere nsogbu ma ndị nke na-ekwu gbasara ahụ́ ike. Ma, ka ị na-achọ ihe ndị a, i kwesịrị ịkpachara anya maka ndị nke na-abụghị eziokwu, dị ka:
Akụkọ na-eduhie mmadụ
Akụkọ na-emeghị eme
Dị ka ihe atụ, mgbe ọrịa koronavaịrọs nọ na-akpa ike, odeakwụkwọ ukwu Òtù Mba Ụwa kwuru ka ndị mmadụ kpachara anya maka akụkọ ụgha dị iche iche a nọ na-akọsa. O kwuru, sị, ‘Ọtụtụ ndị na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ahụ́ dị ha mma. Ma, ihe ndị ahụ abụghị ihe ndị dọkịta kwadoro. A na-ekwu ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu na redio nakwa na tiivi. Ndị mmadụ na-akọ akụkọ na-abụghị eziokwu n’Ịntanet iji menye ndị ọzọ ụjọ. Ha na-ekwu ihe ndị ga-eme ka ndị mmadụ kpọọ ndị na-abụghị ndị obodo ha ma ọ bụ ndị òtù ha asị.’
N’eziokwu, ọ bụghị taa ka akụkọ ụgha malitere. Ma, Baịbụl buru amụma na n’oge anyị, “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-akakwu njọ, na-eduhie ndị mmadụ, ndị ọzọ ana-eduhiekwa ha.” (2 Timoti 3:1, 13) Ịntanet na-emezi ka ọ dịrị anyị mfe inweta ozi na-abụghị eziokwu nakwa izigara ya ndị ọzọ ozugbo, si otú ahụ duhie ha n’amaghị ama. Ihe a emeela ka ọtụtụ ozi anyị na-enweta ma n’ekwentị anyị ma n’ebe ndị ọzọ bụrụ akụkọ ụgha nakwa akụkọ ndị e tinyere nnu na ose.
Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara iji akụkọ ụgha na akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ duhie gị? Legodị ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka.
Ekwetala ihe niile ị hụrụ ma ọ bụ nụ
Ihe Baịbụl kwuru: “Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru, ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”—Ilu 14:15.
E nwere ike iduhie anyị ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara foto a na-ede ihe na ya ma ọ bụ obere vidio ndị a na-ekesakarị n’Ịntanet iji kpaa ndị mmadụ ọchị. Mmadụ nwere ike iwere foto ma ọ bụ vidio onye ọzọ tinyere, kpatụ ebe ụfọdụ aka ma ọ bụ mee ya otú a ga-aghọta ihe dị iche n’ihe onye mbụ tinyere ya bu n’obi. Ndị mmadụ nwedịrị ike imepụta vidio ebe mmadụ na-eme ihe ma ọ bụ na-ekwu ihe, ma ya abụrụ na onye ahụ emeghị ihe ahụ ma ọ bụ kwuo ihe ahụ n’eziokwu.
“Ndị ọkachamara achọpụtala na ọtụtụ n’ime akụkọ ụgha ndị dị n’Ịntanet bụ foto ma ọ bụ vidio mmadụ tinyere otú ga-eme ka a ghọta ihe dị iche n’ihe onye mbụ tinyere ya bu n’obi.”—Axios Media.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ naanị ihe e ji mee soro m chịa?’
Chee banyere ebe akụkọ ahụ si na ihe ọ na-ekwu
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.
Tupu i kweta akụkọ ma ọ bụ zigawara ya onye ọzọ, ma nke ọtụtụ ndị na-akọ ma nke ị nụrụ ugboro ugboro n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi, gbaa mbọ chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. Olee otú ị ga-esi eme ya?
Chee echiche ma ebe ị nụrụ ya ma ọ bụ onye kọọrọ gị ya ọ̀ bụ onye ị ga-atụkwasịli obi. Ụfọdụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi na òtù dị iche iche nwere ike ịkpatụ akụkọ ha na-akọ aka ka ọ daba n’ihe ha chọrọ ma ọ bụ n’ihe ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha chọrọ. Chọpụta ma ihe a kọrọ n’otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọ̀ bụ ihe ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọzọ kọrọ gbasara otu akụkọ ahụ. Oge ụfọdụ, ndị enyi anyị nwere ike izitere anyị akụkọ na-abụghị eziokwu n’ozi iimel ma ọ bụ n’Ịntanet n’amaghị ama. N’ihi ya, ekwetala akụkọ ọ bụla mgbe ị na-achọpụtabeghị ebe akụkọ ahụ si.
Chọpụta ma ihe e kwuru n’akụkọ ahụ ọ̀ bụ otú ihe si kwụrụ n’oge ahụ, bụrụkwa eziokwu. Lee ma ị̀ ga-ahụ ụbọchị a kọrọ akụkọ ahụ na ihe ndị gosiri na akụkọ ahụ mere eme otú e si kọọ ya. Kpachara ezigbo anya ma ọ bụrụ na otú e si kọọ gbasara ihe siri ike meziri ka ihe ahụ yie ihe dị mfe ma ọ bụ na a kọrọ akụkọ ahụ otú ọ ga-eme ka i mee ihe ndị kọrọ ya chọrọ, dị ka iwe iwe, inwe obi ụtọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.
“Ịchọpụta ma akụkọ anyị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu dị nnọọ mkpa otú ahụ ịkwọ aka si dị mkpa.”—Sridhar Dharmapuri, onye so ná ndị isi na-ahụ maka ichebe nri n’ụlọ ọrụ Òtù Mba Ụwa.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Akụkọ a ò mere eme ka ọ̀ bụ naanị ihe mmadụ chere ma ọ bụkwanụ ihe a kọrọ naanị otu akụkụ ya?’
Chọpụta nke bụ́ eziokwu, ọ bụghị ihe gịnwa chere
Ihe Baịbụl kwuru: “Onye tụkwasịrị onwe ya obi dị nzuzu.”—Ilu 28:26.
Anyị na-ekwetakarị akụkọ dabara n’ihe anyị bụ n’obi. Ụlọ ọrụ Ịntanet ụfọdụ na-ezitekarịkwara anyị ozi dabara n’ihe anyị chọbụrụ n’Ịntanet ma ọ bụ ihe anyị kwuru na-amasị anyị. Ma ọtụtụ mgbe, ihe anyị chọrọ ịnụ anaghị abụ ihe anyị kwesịrị ịnụ.
“Ndị mmadụ ga-echebarali ihe echiche. Ma ọtụtụ mgbe, ihe anyị chọrọ, ihe anyị na-atụ anya ya, na ihe anyị na-atụ ụjọ ya nwere ike ime ka anyị kweta akụkọ ọ bụla anyị nụrụ nke dabara n’ihe anyị bu n’obi.”—Peter Ditto, onye gụrụ gbasara otú ndị mmadụ sị akpa àgwà.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe mere m ji kweta ihe a ọ̀ bụ naanị maka na ọ bụ ụdị ihe m bu n’obi?’
Kwụsị ịkọsa akụkọ ụgha
Ihe Baịbụl kwuru: “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu.”—Ọpụpụ 23:1.
Cheta na ihe ị kọọrọ ndị ọzọ nwere ike ịgbanwe otú ha si eche echiche na ihe ha na-eme. Ọ bụrụgodi na ị maghị ụma zigara mmadụ ma ọ bụ kọọrọ mmadụ akụkọ ụgha, ọ ka nwere ike ịkpata nsogbu.
“Ihe kacha mkpa i kwesịrị ime tupu i zigara mmadụ akụkọ ma ọ bụ kọọrọ ya mmadụ bụ ịjụ onwe gị, sị, ʻÈji m n’aka na akụkọ a bụ eziokwu nke na m ga-ezigara ya onye ọzọ?’ Ọ bụrụ na mmadụ niile na-eme ihe a, akụkọ ụgha ga-ebelata n’Ịntanet otú ga-eri onye ọ bụla ọnụ.”—Peter Adams, onye na-arụ n’ụlọ a na-akpọ News Literacy Project.
Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akọsa akụkọ a maka na o doro m anya na ọ bụ eziokwu?’