Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ismail Sen/Anadolu Agency via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ala Ọma Jijiji Kpara Mkpamkpa na Tọki na Siria​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ala Ọma Jijiji Kpara Mkpamkpa na Tọki na Siria​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Na Mọnde, abalị isii n’ọnwa Febụwarị afọ 2023, ala ọma jijiji mebiri ihe n’ọtụtụ ebe na Tọki nakwa na Siria.

  •   N’abalị isii n’ọnwa Febụwarị afọ 2023, ụlọ ọrụ mgbasa ozi a na-akpọ Reuters kwuru na otu nnukwu ala ọma jijiji gburu ihe karịrị puku mmadụ atọ na narị asaa (3,700) n’otu mpaghara Tọki nakwa n’ebe ugwu Siria. Oge a bụ oge nnukwu oyi na-atụ. Oyi a emeela ka ihe sikwuoro ọtụtụ puku ndị merụrụ ahụ́ na ndị ụlọ ha dara ike. Ọ na-emekwa ka ịchọta ndị mmadụ n’ebe ndị ahụ sie ike.

 Ọ na-ewute anyị ma anyị gụọ banyere ụdị ọdachi ndị a. N’ụdị oge a, ọ bụ Jehova onye bụ́ “Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi” ka anyị na-atụkwasị obi. (2 Ndị Kọrịnt 1:3) Ọ na-eji ‘Akwụkwọ Nsọ akasi anyị obi ma na-eme ka anyị nwee olileanya.’​—Ndị Rom 15:4.

 Na Baịbụl, anyị mụtara:

  •   Amụma ndị e buru gbasara ala ọma jijiji.

  •   Ebe anyị ga-enweta olileanya na ihe ga-akasi anyị obi.

  •   Otú Chineke ga-esi mee ka ahụhụ kwụsị.

 Ị chọọ ịmata ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị a, gụọ isiokwu ndị a:

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.