Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Pawel Gluza/500Px Plus/Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

E Kee Anụ Ọhịa Ndị E Nwere Afọ Iri Ise Gara Aga Ụzọ Anọ, Ọ Bụzi Naanị Otu Ụzọ Fọrọ Taa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

E Kee Anụ Ọhịa Ndị E Nwere Afọ Iri Ise Gara Aga Ụzọ Anọ, Ọ Bụzi Naanị Otu Ụzọ Fọrọ Taa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị itoolu n’ọnwa Ọktoba afọ 2024, Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa Ụwa kwuru otu ihe na-emetụ n’ahụ́ gbasara otú ihe ndị ụmụ mmadụ na-eme si akpa anụ ndị bi n’ọhịa aka. Ha kwuru na “n’ime afọ iri ise gara aga (ya bụ, afọ 1970 ruo 2020), anụ ndị bi n’ọhịa ebelatala nke ukwuu. E kee anụ ọhịa ndị dị afọ iri ise gara aga ụzọ ano, naanị otu ụzọ dịzi taa.” Ha kwukwara, sị: “Anyị nwere ike ikwu na ihe ndị ga-eme si ugbu a ruo afo ise ọzọ ga-egosi ma è nwere ihe ka ga-adị ndụ n’ụwa a n’ọdịnihu.”

 Ọ dabara adaba na ụdị ihe a ha kwuru na-eju ọtụtụ ndị anya. Anyị ejighị ọmarịcha ụwa a anyị bi na ya egwu egwu, ọ na-ewutekwa anyị ma ihe ọ bụla mee anụ ndị bi n’ọhịa. Ihe mere o ji ewute anyị bụ na Chineke chọrọ ka anyị na-elekọta ụmụ anụmanụ.​—Jenesis 1:27, 28; Ilu 12:10.

 N’ihi ya, i nwere ike na-eche, sị, ‘Ànyị ga-echebeli anụ ndị bi n’ọhịa ka ihe ọ bụla ghara ime ha? Gịnị ka Baịbụl kwuru?’

Anyị nwere olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu

 N’agbanyeghị mbọ anyị na-agbasi ike ichebe ụmụ anụmanụ, ọ bụ naanị Chineke ga-echebili ha. Ná Mkpughe 11:18, Baịbụl kwuru na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ E nwere ihe abụọ amaokwu ahụ na-akụziri anyị:

  1.  1. Chineke agaghị ekwe ka ndị mmadụ bibie ụwa a ma ọ bụ laa ya n’iyi kpamkpam.

  2.  2. Chineke ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ maka na ndị mmadụ na-emezi ihe ndị nwere ike ikpochapụ ụmụ anụmanụ taa karịa n’oge ọ bụla ọzọ.

 Gịnị ka Chineke ga-eme iji kwụsị nsogbu a? Ọ ga-eme ka Alaeze ya, ya bụ, ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị chịwa ebe niile n’ụwa. (Matiu 6:10) N’alaeze ahụ, a ga-akụziri ndị na-erubere Chineke isi otú ha ga-esi na-elekọta anụ ndị bi n’ọhịa na otú ha ga-esi na-echebe ha.​—Aịzaya 11:9.