Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ụkọ Nri Dị Taa?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ụkọ Nri Dị Taa?

 Mgbe ndị ọchịchị ụwa na-ekwu ihe ha bu n’obi ime gbasara agụụ, nke bụ́ otu n’ime nsogbu kachanụ na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala, ha sịrị na ha chọrọ ka a gharazie inwe onye na-anọ agụụ. a Ma, è nwere mgbe a na-agaghị enwe onye na-anọ agụụ n’ụwa a? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Baịbụl buru amụma na ụkọ nri dị taa ga-adị

 Baịbụl kwuru na nri ga-adị ụkọ n’oge anyị a. Ọ kpọrọ oge anyị a “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Ọ bụghị Chineke kpatara ụkọ nri a, ma ọ gwara anyị gbasara ya. (Jems 1:13) Legodị amụma abụọ e buru na Baịbụl.

 “A ga-enwekwa ụkọ nri . . . n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:7) Amụma a dị na Baịbụl gosiri na a ga-enwe ụnwụ n’ebe dị iche iche. Na nso nso a, ndị na-amụ banyere otú e si emepụta nri na otú e si ekesa ya kwuru, sị: “Mbọ a na-agba ịhụ na ndị mmadụ kwụsịrị ịnọ agụụ, onye ọ bụla ana-enweta nri na-edozi ahụ́ na-akụ afọ n’ala.” b Nde kwuru nde ndị nọ ná mba dị iche iche enweghị ike ịna-enweta nri ha ga-eri. Ọtụtụ n’ime ha na-anwụ n’ihi nsogbu a. 

 “Ahụkwara m ịnyịnya ojii, nke onye na-agba ya ji ihe gbara mkpị e ji atụ̀ ihe n’aka ya.” (Mkpughe 6:5) N’amụma a, ịnyịnya ahụ na onye na-agba ya nọchiri anya ụkọ nri ga-adị n’oge ikpeazụ. c Ihe e ji atụ́ ihe onye na-agba ịnyịnya ahụ ji n’aka bụ maka ịtụ́ ihe oriri, ka onye ọ bụla wee nwetatụ obere. Ka onye ahụ na-agba ịnyịnya gba na-aga, a nụrụ otu olu kwuru na nri ga-adị oké ọnụ, kwuokwa ka ndị mmadụ ghara imefusi ihe oriri. (Mkpughe 6:6) Ihe a bụ nnọọ ihe na-eme taa, inweta nri taa bụ ọgụ na mgba. Ọtụtụ ijeri mmadụ anaghị enweta ezigbo nri ha ga-eri.

Otú a ga-esi akwụsị ụkọ nri

 Ndị ọkachamara kwuru na ụwa anyị na-emepụta nri karịrị akarị ga-ezu onye ọ bụla bi na ya. Gịnịzi mere e ji enwe ụkọ nri? Oleekwa ihe Baịbụl kwuru na Onye Kere anyị bụ́ Jehova, d ga-eme ka nsogbu a kwụsị?

 Ihe bụ́ Nsogbu: Ndị ọchịchị agaghị akwụsịli ịda ogbenye na ikpe na-ezighị ezi, bụ́kwanụ ihe ndị so eme ka agụụ na-agụgbu ndị mmadụ.

 Otú A Ga-esi Dozie Ya: Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị zuru okè ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Taa, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ogbenye ezigbo ike inweta ihe ha ga-eri. Ma, ihe ga-agbanwe n’Alaeze Chineke. Baịbụl kwuru banyere Jizọs Kraịst bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka, napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. . . . Nri ga-eju n’ụwa. Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche.”​—Abụ Ọma 72:12, 16.

 Ihe bụ́ Nsogbu: Agha na-emebisi ihe, na-akpakwa akụnụba obodo aka ọjọọ. Ihe a na-eme ka inweta ihe oriri na-esiri ndị mmadụ ike.

 Otú A Ga-esi Dozie Ya: “[Jehova] na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-agbajisịkwa ube. Ọ na-agba ụgbọ e ji alụ agha ọkụ.” (Abụ Ọma 46:9) Chineke ga-ebibi ngwá agha niile na ndị na-akpata agha. Ihe a ga-emezi ka ọ dịrị onye ọ bụla mfe inweta ihe ọ ga-eri. Baịbụl kwere nkwa na “ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile.”​—Abụ Ọma 72:7.

 Ihe bụ́ Nsogbu: Oké okpomọkụ, oké oyi, na ọdachi ndị na-emere onwe ha na-emebisi ihe a kụrụ n’ala, na-egbukwa ụmụ anụmanụ.

 Otú A Ga-esi Dozie Ya: Chineke ga-egbochi ihe ndị o kere eke ịna-emebisi ihe, mezie ka ala na-emepụta nri nke ọma. Baịbụl kwuru, sị: “[Jehova] na-eme ka oké ifufe kwụsị ife. Ebili mmiri na-adajụ. . . . Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru, na-emekwa ka ala kpọrọ nkụ ghọọ isi mmiri. . . . Ha na-akụ mkpụrụ n’ubi, na-akọkwa ubi vaịn nke na-amị mkpụrụ nke ọma.”​—Abụ Ọma 107:29, 35-37.

 Ihe bụ́ Nsogbu: Ndị dị anya ukwu na ndị na-arụrụ aka na-emepụta nri ndị na-adịghị mma ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ụfọdụ na-eme ka nri ghara iru ụfọdụ ndị aka.

 Otú A Ga-esi Dozie Ya: N’Alaeze Chineke, a gaghịzi enwe ndị aghụghọ na ndị na-arụrụ aka. (Abụ Ọma 37:10, 11; Aịzaya 61:8) Baịbụl kpọrọ Jehova Chineke “Onye na-ekpechitere ndị a na-erigbu erigbu ọnụ ha, Onye na-enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri.”​—Abụ Ọma 146:7.

 Ihe bụ́ Nsogbu: Kwa afọ, e kee nri a na-emepụta n’ụwa ụzọ atọ, a na-ala otu ụzọ n’iyi.

 Otú A Ga-esi Dozie Ya: N’ime Alaeze Chineke, a ga-ahazi otú a ga-esi na-ekesa nri nke ọma. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kpachapụrụ anya ka a ghara imefusi ihe oriri. Dị ka ihe atụ, e nwere oge ọ rụrụ ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ karịrị puku ise (5,000) nri. Mgbe e mechara, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.”​—Jọn 6:5-13.

 Alaeze Chineke ga-akwụsị ihe dị iche iche mere ndị mmadụ ji anọ agụụ, mezie ka mmadụ niile nwejuo nri dị mma enwejuo. (Aịzaya 25:6) Ị chọọ ịmata mgbe Alaeze Chineke ga-eme ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

a Ọ bụ mba ndị so n’Òtù Mba Ụwa kwuru ihe a oge ha kpebiri otú ha chọrọ ka ihe dịrị n’afọ 2030.

b Ndị gbakọrọ aka kwuo ihe a bụ Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo, Òtù Na-ahụ Maka Ego Mba Dị Iche Iche Ji Enye Aka n’Ọrụ Ugbo, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ụmụaka, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihazi Nri n’Ụwa, nakwa Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike.

c Ị chọọ ịmatakwụ gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ ahụ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

d Aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?