Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Ọrịa Koronavaịrọs Egbuola Nde Mmadụ Isii​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ọrịa Koronavaịrọs Egbuola Nde Mmadụ Isii​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị 23 n’ọnwa Mee 2022, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike (WHO) kwuru na ọrịa koronavaịrọs egbuola nde mmadụ isii, narị puku abụọ na puku iri asaa. Ma akụkọ ngalaba ahụ bipụtara n’abalị ise n’ọnwa Mee 2022, gosiri na ọ ga-abụ na ndị ọrịa a gburu karịrị ọnụ ọgụgụ ahụ. Ha kwuru na n’agbata afọ 2020 na 2021, ndị ọrịa koronavaịrọs gburu na ndị ọ kpataara ọrịa ọzọ gbuziri ha dị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde mmadụ iri na ise. Ụdị ọdachi a na-agbawa obi. È nwere ihe Baịbụl kwuru gbasara ya?

Baịbụl buru amụma na ọrịa ọjọọ ga-ezu ụwa ọnụ

  •    Jizọs buru amụma na a ga-enwe ọrịa na-efe efe, ma ọ bụ “ọrịa ọjọọ dị iche iche,” n’oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ.”​—Luk 21:11, Baịbụlụ Nsọ nke Tesịtamentị Ọhụrụ; 2 Timoti 3:1.

 Amụma ahụ Jizọs buru na-emezu taa. Ị chọọ ịmụtakwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe E Ji Ama “Oge Ikpeazụ,” ma ọ bụ “Ọgwụgwụ Oge?

Ihe Baịbụl kwuru na-akasi anyị obi

  •    ‘Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ na-akasikwa anyị obi n’ọnwụnwa niile na-abịara anyị.’​—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

 Ihe Baịbụl kwuru na-akasi ọtụtụ ndị ndị mmadụ nwụnahuru obi. Gụọ banyere ya n’isiokwu ndị a “Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Mmadụ​—Ihe I Nwere Ike Ime” na “Ihe Ga-akacha Enyere Onye Na-eru Uju Aka.”

Baịbụl kwuru ihe ga-eme ka nsogbu a kwusị

  •    “Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”​—Matiu 6:10.

 N’oge na-adịghị anya, “Alaeze Chineke” ga-eme ka a ghara inwe “onye bi n’ala a ga-asị: “Ahụ́ adịghị m.’” (Mak 1:14, 15; Aịzaya 33:24) Kirie vidio aha ya bụ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? ka ị mata ihe ọchịchị a dị n’eluigwe bụ na ihe ọ ga-eme.

 Anyị na-agba gị ume ka ị mụkwuo banyere ihe Baịbụl kwuru ka ndụmọdụ na ọmarịcha nkwa ndị dị na ya wee baara gị na ndị ezinụlọ gị uru.