Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anna Moneymaker/Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ndị Sayensị Ewegala Aka Elekere Dumsdee Ihu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ndị Sayensị Ewegala Aka Elekere Dumsdee Ihu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2023, ndị sayensị wegara aka Elekere Dumsdee a ebe ọ fọrọ nnọọ ntakịrị ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị. Ha ji ya na-egosi na oge ụwa ga-emebi adịla ezigbo nso.

  •   Ụlọ ọrụ nta akụkọ AFP International Text Wire kwuru sị, “Na Tuzdee, e wegara aka ‘Elekere Dumsdee,’ bụ́ ihe na-egosi ọdachi ụmụ mmadụ ga-akpata n’ụwa a, n’ebe ọ fọrọ obere ka elekere iri na abụọ nke ime abalị kụọ. Ihe a bụ nke mbụ a na-ewegaru ya ebe ahụ. Ihe mere ha ji wega ya ebe ahụ bụ maka nsogbu ndị dị ka agha a na-alụ na Yukren, ụjọ ndị sayensị na-atụ na a ga-atụwa ngwá agha ọgwụrụ mba n’agha ahụ, na nsogbu oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo na-akpata.”

  •   Ndị nta akụkọ ABC kwuru na n’ụbọchị Tuzdee, ndị sayensị kwuru na e wegala aka ‘Elekere Dumsdee’ ebe ọ fọrọ otu nkeji na ọkara ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị. Nke a bụ nke mbụ ụmụ mmadụ na-eru ebe ọ fọrọ obere ka ha bibie onwe ha.

  •   Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian kwuru na ndị sayensị si mba dị iche iche kwuru na ihe ndị na-eme na-egosi na ụmụ mmadụ ga-ebibi onwe ha n’oge na-adịghịzi anya.

 À ga-ebibi ndị mmadụ na ụwa anyị a n’oge na-adịghị anya? Ànyị kwesịrị ịna-atụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ihe ga-eme n’ọdịnihu

 Baịbụl kwuru na “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi” nakwa na a ga-enwe ndị ‘ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi.’ (Ekliziastis 1:4; Abụ Ọma 37:29) Ọ pụtara na ụmụ mmadụ agaghị ebibi ụwa, ha agaghịkwa eme ya otú ihe ọ bụla na-agaghị adị ndụ na ya.

 Ma, Baịbụl kwuru gbasara ọgwụgwụ. Dị ka ihe atụ, o kwuru na “ụwa na-agafe agafe.”​—1 Jọn 2:17.

Na-atụ anya ihe ọma

 Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịna-atụ anya ihe ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị juru n’ụwa a. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

 Iji matakwuo ihe Baịbụl na-akụzi, anyị na-agba gị ume ka ị mụwa Baịbụl. I nwere ike ikwu ka anyị na gị mụwa ya.

a “Akwukwọ akụkọ a na-akpọ Bulletin of the Atomic Scientists kwuru, sị “Elekere Dumsdee (Doomsday Clock) bụ ihe e ji agwa ọhaneze na a chọwala iji nkà na ụzụ ụmụ mmadụ mepụtara mebie ụwa anyị a. Ọ bụ ihe atụ e ji echetara anyị ihe anyị ga-emerịrị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-adị ndụ n’ụwa a.”