Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Thai Liang Lim/E+ via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet Ọ̀ Na-akpa Nwa Gị Aka Ọjọọ?​—Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Ndị Nne na Nna Aka

Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet Ọ̀ Na-akpa Nwa Gị Aka Ọjọọ?​—Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Ndị Nne na Nna Aka

 N’abalị iri na asaa n’ọnwa Jun afọ 2024, Dr. Vivek Murthy, onye bụ́ onyeisi ndị dọkịta na-awa ahụ́ n’Amerịka, kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ New York Times na ihe gbasara isi ịkpakọ ndị na-eto eto ọnụ bụzi nsogbu e kwesịrị ilebara anya ozugbo nakwa na ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet so n’ihe kacha akpata nsogbu a.

 Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ka ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ghara ịkpa ha aka ọjọọ? Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka.

Ihe ndị nne na nna nwere ike ime

 Chegodị gbasara ihe ndị a Baịbụl kwuru.

 “Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”​—Ilu 14:15.

 Ebe ọ bụ na ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike ịkpa nwa gị aka ọjọọ, ọ bụghị iwu na ị ga-ekwerịrị ka ọ na-aga ebe ahụ. Tupu i kwe ka nwa gị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, jide n’aka na nwa gị etoruola idebe iwu ndị i nwere ike inye gbasara ịga ebe ahụ, dị ka, awa ole ọ ga-anọ ebe ahụ, imete ezigbo ndị enyi, na izere ihe ndị na-adịghị mma.

 “Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—Ndị Efesọs 5:16.

 I kwe ka nwa gị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, gwa ya ihe ndị ọ ga-eme na ihe ndị ọ na-agaghị eme, kọwakwaara ya otú ime ihe ndị ahụ ga-esi chebe ya. Na-eleru anya ala ka ị chọpụta mgbe nwa gị kpawara àgwà ga-egosi ma ọ̀ ka kwesịrị ịna-aga n’ebe ahụ.

Ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka

 Baịbụl kwuru na oge anyị bi na ya dị “oké egwu, taakwa akpụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ma, ọ gwakwara anyị ihe ndị nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Isiokwu a kwuru ihe ụfọdụ gbasara ndị na-eto eto isi na-anaghịzi akpakọcha ọnụ. E nwere isiokwu karịrị iri abụọ na ya nwere ike inyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka.