Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

kovop58/stock.adobe.com

NA-ECHENỤ NCHE!

Egwuregwu Olimpik Ọ̀ Ga-emeli Ka Ndị Mmadụ Dịrị n’Otu n’Eziokwu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Egwuregwu Olimpik Ọ̀ Ga-emeli Ka Ndị Mmadụ Dịrị n’Otu n’Eziokwu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’Egwuregwu Olimpik nke afọ 2024, a na-atụ anya na ihe dị ka ijeri mmadụ ise ga-ekiri ka ndị si ná narị mba abụọ na isii na-eme egwuregwu dị iche iche. Thomas Bach bụ́ onyeisi ndị na-ahazi egwuregwu Olimpik kwuru, sị: “Ihe omume a anyị na-ahazi ga-eme ka ụwa niile dịrị n’otu, udo adịkwa. Ka anyị kwado ihe e bu n’obi na-eme egwuregwu Olimpik, ya bụ, ime ka mmadụ niile dịrị n’udo ma dịrị n’otu n’agbanyeghị na anyị niile dị iche n’ibe anyị.”

 Egwuregwu Olimpik ọ̀ ga-emeli nnukwu ihe a e bu n’obi ka o mee? È nwere mgbe ụmụ mmadụ ga-adị n’udo ma dịrị n’otu n’eziokwu?

Egwuregwu Olimpik ọ̀ ga-eme ka ụmụ mmadụ dịrị n’udo ma dịrị n’otu?

 Egwuregwu Olimpik nke afọ a emeela ka ndị mmadụ na-eche gbasara ihe ndị ọzọ, kama iche naanị gbasara egwuregwu. Egwuregwu ndị a na-eme na ya emeela ka a mata okwu gbasara ọhaneze na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị na-akpatara ndị mmadụ esemokwu. Ụfọdụ n’ime ha bụ okwu gbasara ihe ruuru mmadụ, ịkpa ókè agbụrụ, imegbu mmadụ n’ihi okpukpe ya, na iwere na ụfọdụ ndị ka ibe ha.

 Egwuregwu Olimpik na egwuregwu ndị ọzọ ndị si mba dị iche iche na-emekọta ọnụ na-eme ndị mmadụ obi ụtọ. Ma, ha na-emekwa ka a mata na otú ndị mmadụ si eche echiche ma na-akpa àgwà na-akpatara ha na ibe ha esemokwu. Egwuregwu ndị a na-emekwa ka otú a ndị mmadụ si eche echiche ma na-akpa àgwà na-akakwu njọ, kama ime ka ha dịrị n’udo ma dịrị n’otu.

 Baịbụl kwuru àgwà dị iche iche ndị mmadụ ga na-akpa ga-eme ka o siere ha ike ịdị n’otu taa. (2 Timoti 3:1-5) Ị chọọ ịmatakwu gbasara amụma a Baịbụl buru, gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Ò Kwuru na Ndị Mmadụ Ga Na-eche Echiche Otú Ha Si Eche Taa ma Na-akpa Àgwà Otú Ha Si Akpa?

Ihe ga-eme ka ụmụ mmadụ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu

 Baịbụl kwuru ihe e ji n’aka ga-eme ka udo dị n’ụwa niile, ụmụ mmadụ adịrịkwa n’otu. O kwuru na ndị niile nọ n’ụwa ga-adị n’otu ma “Alaeze Chineke,” bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, malite ịchị ụwa.​—Luk 4:43; Matiu 6:10.

 Jizọs Kraịst, bụ́ Eze n’Alaeze ahụ, ga-eme ka udo dịrị ebe niile n’ụwa. Baịbụl kwuru, sị:

  •   “Ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile.”​—Abụ Ọma 72:7.

  •   “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka . . . Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—Abụ Ọma 72:12, 14.

 Ihe ndị Jizọs kụziri emeedịla ka ndị si ná narị mba abụọ na iri atọ na itoolu dịrị n’otu taa. Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova bi ebe niile n’ụwa bụ Ndị Kraịst, ha amụtala otú ha ga-esi na-eme udo. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ Ụlọ Nche isiokwu ya bụ “Ihe Ga-eme Ka Ịkpọasị Kwụsị.”