Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chris McGrath/Getty Images

Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Agha?

Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Agha?

 Agha a na-alụ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-akpata obi mgbawa na ahụhụ, na-alakwa ọtụtụ ihe n’iyi. Legodị ihe ụfọdụ e kwuru gbasara agha ndị a na-alụ:

  •   N’abalị 7 n’ọnwa Jun, 2023, ụlọ ọrụ a na-akpọ Peace Research Institute nke dị n’Ọslo dere sị: “N’afọ gara aga, ọtụtụ ndị nwụrụ n’ihi agha ndị a na-alụ, karịcha n’Etiopia na Yukren. E nwebeghị afọ ndị mmadụ nwụrụ otú a kemgbe afọ 1994.”

  •   N’abalị 8 n’ọnwa Febuwarị, 2023, ndị a na-akpọ The Armed Conflict Location & Event Data Project (ACLED) dere sị: “Agha a na-alụ na Yukren bụ naanị otu n’ime agha ndị kpụ ọkụ n’ọnụ a lụrụ n’afọ 2022. N’ụwa niile, agha a lụrụ n’afọ gara aga karịrị nnọọ nke afọ ndị ọzọ, ọ kpakwara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ijeri mmadụ abụọ aka ọjọọ.”

 Ma Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya. O kwuru na “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.” (Daniel 2:44) N’alaeze ahụ ma ọ bụ ọchịchị ahụ, Chineke ga-eme “ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”​—Abụ Ọma 46:9.