Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

alashi/​DigitalVision Vectors via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Kpọọ Ibe Ha Asị nke Ukwuu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Kpọọ Ibe Ha Asị nke Ukwuu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Ihe ndị a na-anụkarị n’akụkọ ụwa bụ okwu ọjọọ ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme ndị ha kpọrọ asị. A na-anụkwa otú ndị mmadụ si alụ agha ma na-akpaso ndị ọzọ àgwà ọjọọ maka na ha esighị n’otu agbụrụ.

  •   N’abalị 15 n’ọnwa Nọvemba afọ 2023, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na n’ihi ọgụ a na-alụ n’Izrel na Gaza nakwa n’ihi ndị na-akwado tigbuo zọgbuo, ihe juziri n’ebe ọhaneze si ezirịta ozi bụ okwu na-eme ka ndị mmadụ na-akpọkwu ibe ha asị.

  •   N’abalị 3 n’ọnwa Nọvemba afọ 2023, otu n’ime ndị isi Òtù Mba Ụwa bụ́ Dennis Francis kwuru na kemgbe abalị 7 n’ọnwa Ọktoba, ndị mmadụ na-akpọkwu ibe ha asị, na-ekwukwu ihe gosiri na ha kpọrọ ibe ha asị, tigbuo zọgbuo na-akakwu njọ karịa otú ọ dịbụ.

 Ọ bụghị taa ka tigbuo zọgbuo, agha, na ndị mmadụ ikwu okwu gosiri na ha kpọrọ ibe ha asị malitere. Baịbụl kwudịrị banyere ndị na-eme otú ahụ n‘oge ochie. Ọ sịrị na “ha na-amụ ire ha ka ọ dị nkọ ka mma agha,” nakwa na ha na-akwado agha na tigbuo zọgbuo. (Abụ Ọma 64:3; 120:7; 140:1) Ma, Baịbụl kwukwara na ịkpọasị a nke juru ebe niile taa nwere ihe ọ pụtara.

Ịkpọasị na-egosi oge anyị bi na ya

 Baịbụl kwuru ihe abụọ mere ndị mmadụ ji kpọọ ibe ha asị taa.

  1.  1. Ọ na-egosi oge ‘ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụ oyi.’ (Matiu 24:12) Kama ịhụ ibe ha n’anya, ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ga-eme ka ha na-akpọ ibe ha asị.​—2 Timoti 3:1-5.

  2.  2. Otú ndị mmadụ si kpọọ ibe ha asị nke ukwuu bụ aka ọrụ Setan bụ́ Ekwensu. Baịbụl kwuru na “ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.”​—1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9, 12.

 Ma, Baịbụl kwukwara na Chineke ga-eme ka ihe niile na-akpata ịkpọasị kwụsị n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-emekwa ka ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata n’ihi asị a kpọrọ ha kwụsị. Baịbụl kwuru, sị:

  •   Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”​—Mkpughe 21:4.