Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Photo by Zhai Yujia/China News Service/VCG via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Idei Mmiri Na-emebisị Ihe?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Idei Mmiri Na-emebisị Ihe?

 N’ụwa niile, idei mmiri na-akpa ọtụtụ ndị aka ọjọọ. Lee ihe ụfọdụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi kwuru:

  •   N’abalị abụọ n’ọnwa Ọgọst afọ 2023, AP News kwuru, sị: ‘Nnukwu mmiri zoro n’isi obodo Chaịna n’ụbọchị ole na ole gara aga. Nke a bụ nke mbụ ụdị mmiri ahụ na-ezo kemgbe otu narị afọ na iri anọ (140). Si na Satọdee ruo na Wenezdee, mmiri zoronụ tofere ịnch iri abụọ na itoolu.’

  •   N’abalị atọ n’ọnwa Ọgọst afọ 2023, Deutsche Welle kwuru, sị: ‘Ụbọchị Tọzdee bụ ụbọchị nke abụọ ajọ ifufe a kpọrọ Khanun butere nnukwu mmiri ozuzo na ifufe ọjọọ n’ebe ndịda Japan, gbuokwa mmadụ abụọ. A tụkwara anya na mmiri ga-ezo n’ebe bụ́ ugwu ugwu na Taịwan ga-etoru amaụkwụ abuọ.’

  •   N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Julaị afọ 2023, BBC News kwuru, sị: ‘Ihe butere idei mmiri mere ná ngwụcha izu na Nova Skoshịa bụ nnukwu mmiri zoro ná mpaghara Kanada dị n’akụkụ Osimiri Atlantik. Ihe a bụ nke mbụ ụdị nnukwu mmiri a na-ezo ebe ahụ kemgbe afọ iri ise gara aga.’

 Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ụdị ihe a?

Ihe na-egosi na oge a bụ “oge ikpeazụ”

 Baịbụl emeela ka anyị mara na oge a anyị bi ugbu a bụ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Jizọs buru amụma na n’oge anyị, anyị ga-ahụ “ihe ndị na-atụ egwu,” ma ọ bụ ihe ndị na-emenye ụjọ. (Luk 21:11) Oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo emeela ka otú mmiri si ezo, otú ifufe si efe na ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbanwee.

Ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya

 Baịbụl gwara anyị na ọtụtụ ihe ndị na-emenye ụjọ bụ́ ndị na-eme n’ụwa anyị taa kwesịrị ime ka anyị nwee olileanya. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs kwuru, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na Alaeze Chineke dị nso.”​—Luk 21:31; Matiu 24:3.

 Ihe ndị na-eme ugbu a na-egosi na n’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke ga-eme ka ihe niile e kere eke, ma mmiri, gharazie ịna-emebisị ihe.​—Job 36:27, 28; Abụ Ọma 107:29.

 Iji matakwuo otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka ụwa anyị dịghachi mma, gụọ isiokwu bụ́ “Who Will Save the Earth?