Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kim Steele/The Image Bank via Getty Images

MKPỌSA PỤRỤ ICHE

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Isi Ike

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Isi Ike

 Ịkpata ihe afọ ga-eri na-esiri ọtụtụ ndị ike n’ụwa niile, ọ na-akakwa njọ ka chi na-abọ.

  •   Ihe ndị na-eme nchọpụta chọpụtara n’ụwa niile n’oge na-adịbeghị anya a gosiri na “e nweghịzi ihe ego ndị mmadụ na-akpata kwa ọnwa na-azụtali n’ahịa.” Ha kwuru na ọ bụrụ na e nweghị ihe e mere, ndị ọgaranya ga na-abakwu ọgaranya, ndị ogbenye ana-adakwu ogbenye nakwa na ihe ga na-esikwuru ọtụtụ ezinụlọ ike karịa.”

 Ndị ọchịchị hà ga-egbochili nsogbu a ịka njọ ma ya fọzie ịkwụsịcha ya kpamkpam?

 Baịbụl kwuru na e nwere ọchịchị ga-akwụsịli ihe isi ike na nsogbu niile ya na ya so, dị ka, ndị ọgaranya ịna-abakwu ọgaranya, ndị ogbenye ana-adakwu ogbenye. O kwukwara na ọchịchị ahụ ga-akwụsịcha nsogbu a niile. Ọ sịrị na “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze . . . malite ịchị,” ya bụ na Chineke ga-amalite otu ọchịchị ga na-ahụ maka ihe niile na-eme n’ụwa a. (Daniel 2:44) Ọchịchị ahụ malite ịchị ụwa, e nweghị onye a ga-echefu ma ọ bụkwanụ hapụ. (Abụ Ọma 9:18) Alaeze Chineke ga-eme ka ndị niile ọ na-achị nwee ihe ga-ezuru ha ịna-enwe obi ụtọ. Obi ga-adị mmadụ niile ụtọ maka na onye ọ bụla ga na-enweta ezigbo ihe n’ọrụ ọ na-arụsi ike.​—Aịzaya 65:21, 22.

a Ebe e si nweta ya bụ na International Labour Organization Global Wage Report 2022-23