MKPỌSA PỤRỤ ICHE
Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ndị Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Na-arụrụ Aka
Ike ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụrụ aka agwụla ndị mmadụ, n’ihi ya, ha na-achọ ndị ọchịchị ha ga-atụkwasịli obi. Ihe e bipụtara n’afọ 2023 gbasara ihe a chọpụtara n’ụwa niile kwuru na ọ bụ ndị ọchịchị ka ndị mmadụ kacha ghara ịtụkwasị obi. a
Baịbụl kwuru na e nwere otu ọchịchị nke a ga-atụkwasịli onye ọchịchị ya obi maka na ọ na-akwụwa aka ọtọ, ọ naghịkwa arụrụ aka. Ọchịchị ahụ bụ Alaeze Chineke, onye ga na-achị na ya bụkwa Jizọs Kraịst.—Aịzaya 9:7.
Ihe ndị Jizọs mere gosiri n’eziokwu na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. (Matiu 9:35, 36) Mgbe ọ ga-achịwa n’Alaeze Chineke, ọ ga-ekpere ndị niile nabatara ọchịchị ya ikpe ziri ezi, meekwa ka obi ruo ha ala.—Abụ Ọma 72:12-14.
a 2023 Edelman Trust Barometer Global Report.