Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Thomas Jackson/​Stone via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ihe Ga-eme Ka I Nwee Olileanya n’Afọ 2024​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ihe Ga-eme Ka I Nwee Olileanya n’Afọ 2024​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Ọtụtụ ndị na-eche na e nweghị otú ndị mmadụ ga-esi die nsogbu ndị ga-abịara ha n’afọ 2024. Ma, e nwere ebe anyị nwere ike ịhụ ihe ga-eme ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Olee ebe ọ bụ?

Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya

 Baịbụl kwuru na Chineke ga-akwụsị nsogbu dị iche iche na-eme ka anyị na-eche na ndụ anyị enweghị isi. N’oge na-adịghị anya, Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri niile dị anyị n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.’​—Mkpughe 21:4.

Otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka ugbu a

 Ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu nwere ike inyere gị aka ịkwụsị ịna-eche na olileanya adịghị ma mee ka ị na-enwe obi ụtọ. (Ndị Rom 15:13) Ọmarịcha ihe ndị Baịbụl kwuru nwekwara ike inyere gị aka ịma ihe ị ga-eme gbasara nsogbu ndị na-abịara gị ugbu a, dị ka ịda ogbenye, ikpe mkpegbu, na ọrịa.

  •   Chọpụta otú ihe Baịbụl kwuru si mee ka obi na-eru otu nwoke ala, ya ana-enwekwa obi ụtọ n’agbanyeghị na ha bụ ndị ogbenye. Lee vidio bụ́ Juan Pablo Zermeño: Jehova Mere Ka Ndụ M Nwee Isi.

  •   Chọpụta otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka mgbe obi gị na-ama gị ikpe, mgbe obi na-ajọ gị njọ, mgbe ị na-echegbu onwe gị, ma ọ bụ mgbe mmadụ nwụnahụrụ gị. Gụọ isiokwu bụ́ “Can I Find Words of Comfort in the Bible?

  •   Chọpụta otú otu nwaanyị bụ́ onye amị ruo ọtụtụ afọ, onye kwuru na ‘obi anaghị adị ya mma nakwa na obi fere ya azụ’ si mechaa nwee olileanya n’ihi ihe ọ mụtara na Baịbụl. Lee vidio bụ́ Atọgbọrọ M Égbè.

 Mee ka afọ 2024 bụụrụ gị na ndị ezinụlọ gị afọ ọma. Matakwuo otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka ime ya. Gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl n’anaghị gị ego ọ bụla. Chọpụta otú Chineke nwere ike isi mee ka ‘udo dịrị gị’ ugbu a, meekwa ka ‘ihe dịrị gị ná mma n’ọdịnihu, gị enweekwa olileanya.’​—Jeremaya 29:11.