Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

mustafahacalaki/DigitalVision Vectors via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ihe Ndị A Rụrụ Ka Ha Na-eme Ka Mmadụ, Hà Na-abara Anyị Uru Ka Hà Na-akpatara Anyị Nsogbu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ihe Ndị A Rụrụ Ka Ha Na-eme Ka Mmadụ, Hà Na-abara Anyị Uru Ka Hà Na-akpatara Anyị Nsogbu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Na nso nso a, ndị ọchịchị, ndị sayensị, na ndị na-arụpụta ihe dị iche iche kwuru ihe ha chere gbasara ihe ndị a rụrụ ka ha na-eme ka mmadụ. Ọ bụ eziokwu na ha kwuru na ihe ndị ahụ bara uru, ma ha kwukwara na ụjọ na-atụ ha maka nsogbu ha ga-akpata ma e jiri ha mee ihe ndị na-adịghị mma.

  •   N’abalị 4 n’ọnwa Mee afọ 2023, Kamala Harris, bụ́ osote onyeisi ala Amerịka kwuru, sị: “Ihe ndị a rụrụ ka ha na-eme ka mmadụ so n’ihe ọgbara ọhụrụ a rụpụtara n’oge a dị ịtụnanya n’ihi na ha nwere ike ime ka ihe dịtụrụ ndị mmadụ mfe . . . Ma, ha nwekwara ike ime ka ọ dị mfe ihe ọjọọ ime anyị, mee ka anyị gharazie inwe ihe ndị ruuru anyị ma gbaa ihe niile gbasara anyị n’anwụ. Ha nwekwara ike ime ka ndị mmadụ gharazie ịtụkwasị ọchịchị onye kwuo uche ya obi.”

  •   O nwere otu òtù nke ndị nọ ya bụ ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụ́ ike si mba dị iche iche. Onyeisi òtù ahụ bụ Dr. Frederik Federspiel. N’abalị 9 n’ọnwa Mee afọ 2023, ha dere otu isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ BMJ Global Health. a Ha dere, sị: “Ọ bụ eziokwu na ihe ndị a rụrụ ka ha na-eme ka mmadụ nwere ike inye aka n’ịgwọ ọrịa dị iche iche, ma e nwekwara ọrịa ụfọdụ ha nwere ike ịkpatara anyị.”

  •   N’abalị 1 n’ọnwa Mee afọ 2023, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times dere, sị: “Ndị mmadụ nwere ike iji ihe ndị a rụrụ ka ha na-eme ka mmadụ na-agbasa akụkọ ụgha. N’oge na-adịghị anya, ha nwere ike ime ka ndị mmadụ gharazie inwe ọrụ. Ụfọdụ ndị na-arụpụta ihe dị iche iche na-ekwu na n’ọdịnihu, ihe ndị ahụ nwere ike ịkpatara ndị mmadụ nsogbu.”

 Ka oge na-aga, a ga-amatakwu ma ihe ndị a rụpụtara ka ha na-eme ka mmadụ hà ga-abara anyị uru ka hà ga-akpatara anyị nsogbu. Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ihe mere mbọ ụmụ mmadụ na-agba ji eme ka obi ghara ịna-eru ndị mmadụ ala

 Baịbụl kwuru ihe mere na ọnụ agaghị akali ụmụ mmadụ ikwu hoo haa na ọ bụ naanị ihe dị mma ka a ga-eji ihe ndị ha rụpụtara na-eme.

  1.  1. Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ bu ihe dị mma n’obi rụpụta ihe, ha agaghị amatali nsogbu ihe ahụ nwere ike ịkpatara ndị mmadụ n’ọdịnihu.

    •   “E nwere ihe na-adị mma n’anya mmadụ, ma ọ na-emecha butere mmadụ ọnwụ.”​—Ilu 14:12.

  2.  2. Ọ bụghị onye rụpụtara ihe na-ekpebi ma ndị mmadụ hà ga-eji ihe ọ rụpụtara eme ihe dị mma ma ọ bụ ihe na-adịghị mma.

    •   ‘M ga-ahapụrụ onye ga-anọchi m [ihe ndị m rụpụtara]. Ònye makwanụ ma ọ̀ ga-abụ onye ma ihe, ka ọ̀ ga-abụ onye nzuzu? Ma, ọ ga-eweghara ihe niile m gbasiri mbọ ike nweta, bụ́ ihe ndị m nwetara n’ụwa maka na m ma ihe.’​—Ekliziastis 2:​18, 19.

 Anyị kwesịrị ikwe ka Onye kere anyị na-eduzi anyị maka na anyị amaghị echi otú a Baịbụl kwuru.

Onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi

 Onye kere anyị kwere nkwa na ya emekataghị kwe ka ndị mmadụ ma ọ bụ ihe ha rụpụtara laa ụwa ma ọ bụ mmadụ niile n’iyi.

  •   “Ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.”​—Ekliziastis 1:4.

  •   “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

 Onye kere anyị gwara anyị na Baịbụl ihe anyị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu, obi eruokwa anyị ala. Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịmata Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?” nakwa “Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu.”

a Isiokwu ahụ ha dere bụ “Threats by Artificial Intelligence to Human Health and Human Existence” (Nsogbu Ndị Ihe Ndị A Rụrụ Ka Ha Na-eme Ka Mmadụ Nwere Ike Ịkpatara Ndị Mmadụ). Ndị dere ya bụ Frederik Federspiel, Ruth Mitchell, Asha Asokan, Carlos Umana, na David McCoy.