Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Ihe Niile Dịzi Oké Ọnụ n’Ụwa Niile​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ihe Niile Dịzi Oké Ọnụ n’Ụwa Niile​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’ọnwa Jun 2022, o nwere ihe ndị World Bank dere gbasara otú ihe si na-aga n’ụwa. Onyeisi ha kwuru, sị, “Otú ngwá ahịa si arị elu n’ike n’ike ga-etinye mmadụ niile ná nsogbu. Ihe niile dịzi oké ọnụ, ma ndị mmadụ enweghị ego ha ji azụ ihe ndị a.”

 Ụlọ akụ̀ a na-akpọ International Monetary Fund kwuru na mmanụ ụgbọala na ihe oriri dịzị oké ọnụ. Ha kwukwara na ndị ihe a kacha akpa aka ọjọọ bụ ndị bi ná mba ndị dara ogbenye.

 Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere nsogbu ndị a ji dịrị, otú anyị ga-esi na-edi ya, nakwa otú ha ga-esi kwụsị kpamkpam n’ọdịnihu.

Ihe ga na-adị oké ọnụ ‘n’oge ikpeazụ’

  •   Baịbụl kpọrọ oge a anyị bi na ya “oge ikpeazụ.”​—2 Timoti 3:1.

  •   Jizọs kwuru na “ihe ndị na-atụ egwu” ga na-eme n’oge a. (Luk 21:11) Ụjọ na-atụ ndị mmadụ n’ihi otú ngwà ahịa si arị elu ọjị. Ndị mmadụ na-echegbu onwe ha maka echi nakwa maka otú ha ga-esi na-egbo mkpa ezinụlọ ha.

  •   Akwụkwọ Mkpughe kwuru na ihe oriri ga-adị oké ọnụ n’oge a. Ọ sịrị, “Anụrụ m ihe dị ka olu. . . . Olu ahụ sịrị: ‘A na-ere otu kwọt nke ọka wit otu mkpụrụ ego dinarịọs. A na-erekwa kwọt atọ nke ọka bali otu mkpụrụ ego dinarịọs.’”​—Mkpughe 6:6. a

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara “oge ikpeazụ” nakwa amụma dị n’akwụkwọ Mkpughe, lee vidio bụ́ Ụwa Agbanweela Kemgbe Afọ 1914, gụọkwa isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Ihe ga-eme ka ihe isi ike kwụsị

  •   “Ha ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya. Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya, ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya.”​—Aịzaya 65:21, 22.

  •   “Nri ga-eju n’ụwa. Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche.”​—Abụ Ọma 72:16.

  •   “Jehova kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na a na-emegbu ndị na-ata ahụhụ, ebe ọ bụ na ndị ogbenye na-asụ ude, m ga-ebili kpaa ike.’”—Abụ Ọma 12:5. b

 N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ihe isi ike kwụsị, ọ bụghị naanị n’otu mba, kama n’ụwa niile. Gụọ isiokwu bụ́ “Is a Fair Economic System Possible?” ka ị hụ otú ọ ga-esi eme ya.

 Ma Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịma ihe anyị ga na-eme n’oge a ihe niile na-arị elu ọjị. Olee otú ọ ga-esi nyere anyị aka? Ọ gwara anyị otú anyị ga-esi jiri ego anyị na-akpata na-eme ihe bara uru. (Ilu 23:4, 5; Ekliziastis 7:12) Gụọ isiokwu bụ́ “Ghara Ịna-emefusị Ego Gị” nakwa “How to Live on Less” ka ị hụkwuo ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka.

a Otu mkpụrụ ego dinarịọs bụ ego a na-akwụ mmadụ ma ọ rụchaa ọrụ n’ụbọchị.

b Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.