Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Manuel Reino Berengui/DeFodi Images via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Egwuregwu Iko Mba Ụwa Ọ̀ Ga-emeli Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu n’Eziokwu?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Egwuregwu Iko Mba Ụwa Ọ̀ Ga-emeli Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu n’Eziokwu?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 E kwuru na ihe dị ka ijeri mmadụ ise ga-ele asọmpi bọl nke malitere n’abalị iri abụọ n’ọnwa Nọvemba afọ 2022. Ọ ga-akwụsịkwa n’abalị iri na asatọ n’ọnwa Disemba afọ 2022. Ọtụtụ ndị na-eche na ụdị egwuregwu a na-eme ka ndị mmadụ dị n’otu mgbe a na-enwe ya nakwa na ọ na-eme ka ha dịrị n’otu na-aga.

  •   Onye bụ́bu onyeisi ala Saụt Afrịka aha ya bụ Nelson Mandela kwuru, sị: “Egwuregwu ga-agbanweli ụwa. Ọ ga-emeli ka ndị mmadụ mepụta ihe bara uru. Ọ ga-emeli ka ndị mmadụ dị n’otu n’ụzọ na-enweghị atụ.”

  •   Onyeisi FIFA a aha ya bụ Gianni Infantino sịrị: ‘Egwuregwu bọl na-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu maka na ọ na-eme ka ha nwee olileanya, nwee obi ụtọ, obi adịkwa ha mma na ha hụrụ ibe ha n’anya, nakwa na e nwere ihe jikọrọ ha.’

 Egwuregwu Iko Mba Ụwa ma ọ bụ ụdị asọmpi ọ bụla ọzọ, ò nwere ike ime ihe niile a magburu onwe ha? È nwere mgbe udo ga-adị, mmadụ niile adịkwa n’otu?

Ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu?

 Egwuregwu Iko Mba Ụwa nke afọ a emeela ka ndị mmadụ chewe gbasara ihe ndị ọzọ, ọ bụghị naanị bọl. Egwuregwu a emeela ka ndị mmadụ kwuo ọtụtụ ihe gbasara ọchịchị ndị na-emesi ndị mmadụ ike, ịkpa ókè agbụrụ, nakwa otú mba ụfọdụ si nwee akụnụba karịa ibe ha.

 Ma, ọ na-amasị ọtụtụ ndị ile egwuregwu mba dị iche iche na-eme, dị ka Iko Mba Ụwa, maka na ha ji ya atụrụ ndụ. Ma, n’agbanyeghị na ndị mmadụ chọrọ ka ụdị egwuregwu a mee ka ha dịrị n’otu, ha agaghị emeli ka ha dịrị n’otu dịtee aka. Kama, e mewe egwuregwu ndị ahụ, a na-ahụkarị àgwà dị iche iche ndị mmadụ na-akpa ndị Baịbụl kwuru a ga-eji mata na anyị bi n’oge a na-akpọ “oge ikpeazụ.” Àgwà ndị ahụ na-egosikwa na ndị mmadụ adịghị n’otu.​—2 Timoti 3:​1-5.

Ihe ga-eme ka ụwa niile dịrị n’otu n’eziokwu

 Baịbụl kwuru ihe ga-eme ka ụwa niile dịrị n’otu n’eziokwu. O kwere nkwa na ndị niile bi n’ụwa ga-adị n’otu mgbe ọchịchị nke ga-esi n’elugiwe ga-achịwa. A na-akpọ ya “Alaeze Chineke.”​—Luk 4:43; Matiu 6:10.

 Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze alaeze ahụ. Ọ ga-eme ka udo dịrị n’ụwa niile. Baịbụl kwuru, sị:

  •   “Ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile.”​—Abụ Ọma 72:7.

  •   “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka . . . Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—Abụ Ọma 72:12, 14.

 Taa, ihe Jizọs kụziri emeedịla ka ọtụtụ nde mmadụ ndị nọ ná narị mba abụọ na iri atọ na itoolu dịrị n’otu. Ha akwụsịla ịkpọ ndị ọzọ asị. Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ga-eme Ka Ịkpọasị Kwụsị” ka ị chọpụtakwuo otú ihe Jizọs kwuru ga-esi baara gị uru.

a FIFA pụtara Fédération Internationale de Football Association, ya bụ, òtù na-ahụ maka egwuregwu bọl n’ụwa niile.